Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Ise.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Ise.

NKWỤSỊ NKE ISE

Simion Enyere Jesu Aka Ibu Obe

Uzo nke Obe - Igbo Stations of the Cross - Uzo nke Obe ise

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Mgbe ha nyechara Jesu mkparị, ha yipụ ya uwe-nru-ala ahụ, yiwe ya uwe nke ya, duru ya pụọ gaa ikpọgbu ya. Ma mgbe ha na-aga, ha hụrụ Simion onye Sirin, manye ya ka o buru obe Jesu. (Matiu 27:31-32).

Sekpurunụ Ala

A na m agwa ụnụ, ọtụtụ ga-esi n’ọwụwa anyanwụ n’ọdịda anyanwụ bịa nọnyere Ebraham, Aịzik na Jekọb n’alaeze eligwe.Ma a ga-achụpụ ụmụ alaeze na mbara ezi kụrụ itiri; ebe sọ ibe akwa na-ịta ikikere eze ga-adị. (Matiu 8:11-12).

Chineke m, mee ka m were obi añụrị nara obe niile Ị ga-ezitere m na ndụ m. E kwela ka achụpụ m n’ala eze gị.

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ: kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke isii

Ukwe: Ya bụrụ na ị ga-abụ nwa azụ m;

             Buru obe gị ụbọchị niile;

             Bia debe iwu m niile. (Matiu 16:24).

Ụzọ nke Obe

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Ise.

Categorized in:

Igbo Stations of the Cross,