Igbo Mass Readings for May 31 2025, Emume Nleta Vegin Marịa gara Ileta Elizabet.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 31 2025, Emume Nleta Vegin Marịa gara Ileta Elizabet.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:14-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Zefanaya
Kwesie ukwe ike, gị ada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel! Were obi gị niile ñụrịa ma goriwe, gị ada Jerusalem! Yahweh akagbuola ikpe niile mara gị, Ọ chụpụla ndịiro gị niile.
Eze Izrel bụ Yahweh nọ n’etiti gị, egwu ihe ọjọọ ọbụla agaghị atụ gị ọzọ. N’ụbọchị ahụ a ga-agwa Jerusalem sị: “egwu atụla gị, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba.
Yahweh Chukwu gị nọ n’etiti gị, odogwu na-enye mmeri, ọ ga-eji obiụtọ ñụrịa na gị, ọ ga-emekwa ka ị dị ọhụrụ n’ịhụnaanya ya, ọ ga-eji nnukwu ukwe gorie na gị dịka ụbọchị emume. Aga m ewepụrụ gị ọdachi, nke na ị gaghị enwe ihe mwute.”
MA Ọ BỤ
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:9-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara ndị Rom
Ka ịhụnaanya ụnụ bụrụ nke eziokwu. Kpọnụ ihe ọjọọ asị. Jidesienụ ezi ihe aka ike. Dịka ụmụnna n’ime Kristi, werenụ iñu ọkụ n’obi hụrịtanụ onwe ụnụ n’anya.
Na-egosinụ ibe ụnụ nsọpụrụ karịa otu ha si egosi ụnụ. Ụnụ adala mba n’ọrụ, ka mmụọ nke Chinkeke na-enwu ka ọkụ n’ime ụnụ. Feenụ Dinwenụ ofufe.
Ñụrịanụ ọñụ n’ihi olileanya ahụ ụnụ nwere. Nwekwaanụ ndidi n’ime mkpagbu niile. Nọgidesiekwanụ ike n’ekpere. Na-enyetụnụ ụfọdụ n’ihe ụnụ nwere iji gboo mkpa ndị ọzọ.
Dịkwanụ uchu n’ọrụ ile ndị ọbịa anya nke ọma. Na-ekperenụ ndị na-esogbu ụnụ ekpere. Gọzienụ ha, ụnụ abụkwala ha ọnụ. Soronụ ndị na-akwa akwa na ịkwa akwa.
Na-ebinụ n’udo, ụnụ na mmadụ ibe ụnụ. Ụnụ abụla ndị okomoko. Kama, ka ụnụ na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwekwa mmekọrịta. Ụnụ abụkwala ndị maara ihe n’anya onwe ụnụ!
ABỤỌMA NA AZỊZA – Is:12: 2-3, 4, 5-6.
Azịza: Onye nọ n’etiti ụnụ bụ nnukwu onye dị nsọ nke Izrel.
1. Lee, Chineke bụ onye nzọpụta m;
e nwere m nchekwube, egwu agaghị atụ m,
N’ihina Yahweh Chineke bụ ike m na ukwe m,
ọ bụ onye nzọpụta m.”
Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmị nke nzọpụta.
Azịza: Onye nọ n’etiti ụnụ bụ nnukwu onye dị nsọ nke Izrel.
2. Nyenụ Chineke ekele, kpọkuonụ aha ya,
Meenụ ka a mata ọrụ aka ya
n’ebe mba niile nọ,
kwupụtanụ na aha ya dị elu.
Azịza: Onye nọ n’etiti ụnụ bụ nnukwu onye dị nsọ nke Izrel.
3. Bụọrọnụ Yahweh abụ ọma,
n’ihina ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube;
meenụ ka a nụ ya n’ụwa niile.
Tisienụ mkpu ike, kweenụ ukwe ọñụ ụnụ ndị bi na Zayọn,
N’ihina onye nọ n’etiti ụnụ bụ nnukwu onye dị nsọ nke Izrel.
Azịza: Onye nọ n’etiti ụnụ bụ nnukwu onye dị nsọ nke Izrel.
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ngọzi na-adịrị nwaanyị ahụ nke kwere n’ihe niile Dinwenụ gwara ya, ga-emezu.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 1:39-56.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
N’oge ahụ Marịa biliri, gaa ọsịsọ n’otu obodo dị n’ugwu n’ala Judia. Ọ banyere n’ụlọ Zekarịa, kelee Elizabet. Mgbe Elizabet nụrụ olu ekele Marịa, nwa o bu n’afọ wụliri elu.
Elizabet jupụtara na Mmụọ Nsọ wee tie mkpu ọñụ sị, “Ị dị ngọzi n’etiti ụmụnwaanyị niile, ọ dịkwa ngọzi bụ nwa afọ gị bụ Jesu. Olee otu nke a si rute m aka na nne nke Onyenwe m bịara ileta m?
Lee, mgbe m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m n’afọ wụliri elu n’ọñụ. Ngọzi na-adịrị nwaanyị ahụ nke kwere n’ihe niile Dinwenụ gwara ya, ga-emezu.”
Marịa kwere ukwe sị, “Mkpụrụobi m na-eto Dinwenụ m, Mmụọ m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m; Maka na o leele anya n’umeala odibo nwaanyị ya, site taata ndụdụgandụ niile ga na-akpọ m onye dị ngọzi; Maka na onye dị ike emeerela m nnukwu ihe, aha ya dị nsọ.
Obi ebere ya si na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ maka ndị na-atụrụ ya egwu, O gosila ike aka ya, ọ chụsachaala ndị nganga dị n’obi; O sila n’ocheeze budaa ndị ukwu, bulie ndị umeala; O nyejuola ndị agụụ na-agụ afọ hapụ ndị ọgaranya ka ha gbara aka laa.
O nyerela Izrel nwodibo ya aka, na ncheta ebere ya, Dịka O si gwa nna anyị Abraham na mkpụrụ ya ebeebe.” Marịa nọnyeere Elizabet ihe dị ka ọnwa atọ tupu ọ lọghachi n’ụlọ ya.
Igbo Mass Readings for June 1 2025, Ụka Nke Asaa N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.
Igbo Mass Readings for May 31 2025, Emume Nleta Vegin Marịa gara Ileta Elizabet.