Igbo Mass Readings for May 14 2026, Emume Nrọgoro N’Eluigwe nke Onyenweanyị – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 14 2026, Emume Nrọgoro N’Eluigwe nke Onyenweanyị – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: E welitere Ya elu mgbe ha na-ele anya.

Ezigbo Tiofilọs! N’akwụkwọ nke mbụ, e dere m ihe banyere ihe niile Jesu mere na nke Ọ kụziri, site n’oge Ọ malitere ọrụ Ya, ruo ụbọchị Chineke naara Ya n’eluigwe.

Ma tupu Jesu arịgoo n’eluigwe, O sitere n’ike Mmụọ Nsọ kuziere ndị ahụ Ọ họpụtara, bụ Ụmụazụ Ya, ihe omimi dị iche iche. Mgbe Ọ hụsịrị ahụhụ ọnwụ, O gosiri mmadụ ndị a onwe Ya iri ụbọchị anọ, n’ụzọ dị iche iche na-adịghị na ngọfu, na O biliela; na Ọ dị ndụ.

N’oge a, Jesu nọ na-akuziri Ụmụazụ ya ihe banyere Alaeze Chineke. Mgbe Ya na ha zukọrọ, O nyesiri ha iwu ike, sị: “Ụnụ esikwala na Jerusalem pụọ ugbu a!

Kama cherenụ nkwa nke Nna, nke ụnụ nụrụ n’ọnụ M! Ụnụ ma na Jọn jiri mmiri mee ndị mmadụ mmirichukwu, ma Chineke ga-eji Mmụọ Nsọ mee ụnụ mmirichukwu n’oge na-eteghị aka.

Ya mere, mgbe ndị Ụmụazụ ahụ gbakọrọ, ha wee jụọ Jesu, sị: “Onyenweanyị, ọ bụ n’oge a ka Ị ga-enyeghachi Izrel alaeze?” Jesu wee sị ha: “Ọ bụghị ihe dịịrị ụnụ ịma oge, ma ọ bụ ụbọchị, nke Nna M debere n’ike nke aka Ya.

Kama ụnụ ga-anata ike mgbe Mmụọ Nsọ dakwasịrị ụnụ. Ụnụ ga-abụkwa ndị akaebe M n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria niile, rukwaa ebe ụwa sọtụrụ.”

Mgbe Jesu kwusiri okwu ndị a, mgbe ndị Ụmụazụ ahụ nọ na-ele anya, e wee welie Jesu elu; igwe ojii wee kpuchie Ya, zopụ Ya n’anya ha. Ha wee legide anya n’elu ka Ọ na-aga.

Ma mgbe ha na-ele anya, na mberede, ndịikom abụọ yi uwe ọcha guzoro ha nso, sị: “Ndị Galili! Gịnị mere ụnụ guzo n’ebe a, anya n’eluigwe! Jesu nke a, Onye a napụrụ ụnụ rịgooro n’eluigwe, ga-abịakwa ọzọ, otu a ụnụ hụrụ Ya ka Ọ na-arịgo n’eluigwe.”

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 46:2-3, 6-9 Az. 6

Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ arọgo n’oche eze Ya. Gbuoronụ Onyenweanyị opi ike. Ma ọ bụ Aleluya

1. Ụnụ niile, kụọnụ aka. Tierenụ Chineke mkpu ọñụ.

N’ihi na Onyenweanyị, Onye kacha elu, onye dị ebube bụ eze kacha eze niile.

Ọ bụ nnukwu Eze na-achị ụwa niile.

Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ arọgo n’oche eze Ya. Gbuoronụ Onyenweanyị opi ike. Ma ọ bụ Aleluya

2. Ọ bụ n’ụzụ mkpu ọñụ ka Chineke na-arọgo n’oche eze Ya.

Ọ bụkwa n’ụda opi ike ka Ọ na-agbago.

Kweerenụ Chineke ukwe otito. Kweenụ ukwe otito.

Kweerenụ eze anyị ukwe otito. Kweenụ ukwe otito.

Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ arọgo n’oche eze Ya. Gbuoronụ Onyenweanyị opi ike. Ma ọ bụ Aleluya

3. N’ihi na Chineke bụ Eze na-achị ụwa niile.

Bụọnụ abụ otito.

Chineke bụ eze na-achị mba niile.

Chineke nọdụrụ n’oche eze Ya dị nsọ.

Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ arọgo n’oche eze Ya. Gbuoronụ Onyenweanyị opi ike. Ma ọ bụ Aleluya

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:17-23

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs

Isi Okwu: Ọ nọdụrụ n’aka nri Ya n’eluigwe.

A na m arịọ Chineke nke Onyenweanyị Jesu Kristi, bụ Nna nke ebube, ka O nye ụnụ Mmụọ nke amamihe na nke mkpughe; ka O kpugheere ụnụ ihe niile banyere Chineke; ka ụnụ wee mara Ya.

Ana m arịọkwa ka Chineke meghee anya nke obi ụnụ, ka ụnụ wee hụ ihe, mata ihe bụ olile anya nke dị n’ọkpụkpọ Ọ kpọrọ ụnụ; matakwa ụdị akụ nke nkwa ahụ dị ebube, nke O kwere ndị nsọ Ya; matakwa na nnukwu ike Ya na-enweghị atụ, na-arụsi ọrụ ike n’ebe anyị bụ ndị kwere ekwe nọ.

Ike a Chineke na-etinye n’ime anyị bụ otu ike ukwu ahụ, O jiri mee ka Kristi si na ndị nwụrụ anwụ bilie, mekwaa ka Ọ nọdụ n’aka nri nke ike Ya, n’ebe kachasị elu nke eluigwe.

N’ebe ahụ ka Kristi nọ, bụrụ isi, na-achị ọchịchị niile, na ịbụ isi niile, na ike niile, na ịbụ Onyenwe mmadụ, na aha niile ụmụ mmadụ na-ehota, na-asọpụrụ, ma n’ụwa nke a ma na nke gaje ịbịa.

Chineke doro ihe niile n’okpuru ụkwụ Kristi, were Ya nye ka Ọ bụrụ isi nke Nzukọ Ya, na onye isi kachasị elu nke ihe niile. Nzukọ Kristi bụkwa ahụ Ya, bụrụkwa ozuzu nke Onye ahụ na-arụzu ihe niile n’ime mmadụ niile.

MBEKU – Matiu 28:19-20

Aleluya, aleluya!

Gaanụ, kuziere mmadụ niile Oziọma M. A nọnyeere M ụnụ oge niile ruo na ngwụcha nke ụwa.

Aleluya!

OZIỌMA – 28:16-20

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: N’aka M ka e nyefere ike niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa.

Ndị Ụmụazụ Jesu iri na otu ahụ wee bilie, gaa Galili, ruo ugwu ahụ Jesu si ha jee. Mgbe ha hụrụ Ya, ha kpọọrọ Ya isi ala. Ma ụfọdụ nwere obi abụọ. Jesu wee bịakwute ha gwa ha okwu sị: “Chineke ewerela ike niile nke dị n’eluigwe na nke dị n’ụwa nyefee M n’aka.

Ya mere, gaanụ, mee mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ M; na-emenụ ha mmirichukwu n’aha Nna, na Nwa, na Mmụọ Nsọ. Kuzierenụ ha ihe niile M nyere ụnụ n’iwu. Lee anọnyeere M ụnụ mgbe niile ruo ọgwụgwụ oge a.”

Igbo Mass Readings for May 15 2026, Fraịde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Igbo Mass Readings for May 14 2026, Emume Nrọgoro N’Eluigwe nke Onyenweanyị – Afọ nke Mbụ.