Igbo Mass Readings for May 6 2027, Emume Ncheta Nrọgoro N’Eluigwe nke Onyenweanyị – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 6 2027, Emume Ncheta Nrọgoro N’Eluigwe nke Onyenweanyị – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: E welitere Ya elu mgbe ha na-ele anya.

Ezigbo Tiofilọs! N’akwụkwọ nke mbụ, e dere m ihe banyere ihe niile Jesu mere na nke Ọ kụziri, site n’oge Ọ malitere ọrụ Ya, ruo ụbọchị Chineke naara Ya n’eluigwe.

Ma tupu Jesu arịgoo n’eluigwe, O sitere n’ike Mmụọ Nsọ kuziere ndị ahụ Ọ họpụtara, bụ Ụmụazụ Ya, ihe omimi dị iche iche. Mgbe Ọ hụsịrị ahụhụ ọnwụ, O gosiri mmadụ ndị a onwe Ya iri ụbọchị anọ, n’ụzọ dị iche iche na-adịghị na ngọfu, na O biliela; na Ọ dị ndụ.

N’oge a, Jesu nọ na-akuziri Ụmụazụ ya ihe banyere Alaeze Chineke. Mgbe Ya na ha zukọrọ, O nyesiri ha iwu ike, sị: “Ụnụ esikwala na Jerusalem pụọ ugbu a!

Kama cherenụ nkwa nke Nna, nke ụnụ nụrụ n’ọnụ M! Ụnụ ma na Jọn jiri mmiri mee ndị mmadụ mmirichukwu, ma Chineke ga-eji Mmụọ Nsọ mee ụnụ mmirichukwu n’oge na-eteghị aka.

Ya mere, mgbe ndị Ụmụazụ ahụ gbakọrọ, ha wee jụọ Jesu, sị: “Onyenweanyị, ọ bụ n’oge a ka Ị ga-enyeghachi Izrel alaeze?” Jesu wee sị ha: “Ọ bụghị ihe dịịrị ụnụ ịma oge, ma ọ bụ ụbọchị, nke Nna M debere n’ike nke aka Ya.

Kama ụnụ ga-anata ike mgbe Mmụọ Nsọ dakwasịrị ụnụ. Ụnụ ga-abụkwa ndị akaebe M n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria niile, rukwaa ebe ụwa sọtụrụ.”

Mgbe Jesu kwusiri okwu ndị a, mgbe ndị Ụmụazụ ahụ nọ na-ele anya, e wee welie Jesu elu; igwe ojii wee kpuchie Ya, zopụ Ya n’anya ha. Ha wee legide anya n’elu ka Ọ na-aga.

Ma mgbe ha na-ele anya, na mberede, ndịikom abụọ yi uwe ọcha guzoro ha nso, sị: “Ndị Galili! Gịnị mere ụnụ guzo n’ebe a, anya n’eluigwe! Jesu nke a, Onye a napụrụ ụnụ rịgooro n’eluigwe, ga-abịakwa ọzọ, otu a ụnụ hụrụ Ya ka Ọ na-arịgo n’eluigwe.”

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 46:2-3, 6-9 Az. 6

Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ arọgo n’oche eze Ya. Gbuoronụ Onyenweanyị opi ike. Ma ọ bụ Aleluya

1. Ụnụ niile, kụọnụ aka. Tierenụ Chineke mkpu ọñụ.

N’ihi na Onyenweanyị, Onye kacha elu, onye dị ebube bụ eze kacha eze niile.

Ọ bụ nnukwu Eze na-achị ụwa niile.

Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ arọgo n’oche eze Ya. Gbuoronụ Onyenweanyị opi ike. Ma ọ bụ Aleluya

2. Ọ bụ n’ụzụ mkpu ọñụ ka Chineke na-arọgo n’oche eze Ya.

Ọ bụkwa n’ụda opi ike ka Ọ na-agbago.

Kweerenụ Chineke ukwe otito. Kweenụ ukwe otito.

Kweerenụ eze anyị ukwe otito. Kweenụ ukwe otito.

Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ arọgo n’oche eze Ya. Gbuoronụ Onyenweanyị opi ike. Ma ọ bụ Aleluya

3. N’ihi na Chineke bụ Eze na-achị ụwa niile.

Bụọnụ abụ otito.

Chineke bụ eze na-achị mba niile.

Chineke nọdụrụ n’oche eze Ya dị nsọ.

Azịza: Chineke ji mkpu ọñụ arọgo n’oche eze Ya. Gbuoronụ Onyenweanyị opi ike. Ma ọ bụ Aleluya

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:17-23

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs

Isi Okwu: Ọ nọdụrụ n’aka nri Ya n’eluigwe.

A na m arịọ Chineke nke Onyenweanyị Jesu Kristi, bụ Nna nke ebube, ka O nye ụnụ Mmụọ nke amamihe na nke mkpughe; ka O kpugheere ụnụ ihe niile banyere Chineke; ka ụnụ wee mara Ya.

Ana m arịọkwa ka Chineke meghee anya nke obi ụnụ, ka ụnụ wee hụ ihe, mata ihe bụ olile anya nke dị n’ọkpụkpọ Ọ kpọrọ ụnụ; matakwa ụdị akụ nke nkwa ahụ dị ebube, nke O kwere ndị nsọ Ya; matakwa na nnukwu ike Ya na-enweghị atụ, na-arụsi ọrụ ike n’ebe anyị bụ ndị kwere ekwe nọ.

Ike a Chineke na-etinye n’ime anyị bụ otu ike ukwu ahụ, O jiri mee ka Kristi si na ndị nwụrụ anwụ bilie, mekwaa ka Ọ nọdụ n’aka nri nke ike Ya, n’ebe kachasị elu nke eluigwe.

N’ebe ahụ ka Kristi nọ, bụrụ isi, na-achị ọchịchị niile, na ịbụ isi niile, na ike niile, na ịbụ Onyenwe mmadụ, na aha niile ụmụ mmadụ na-ehota, na-asọpụrụ, ma n’ụwa nke a ma na nke gaje ịbịa.

Chineke doro ihe niile n’okpuru ụkwụ Kristi, were Ya nye ka Ọ bụrụ isi nke Nzukọ Ya, na onye isi kachasị elu nke ihe niile. Nzukọ Kristi bụkwa ahụ Ya, bụrụkwa ozuzu nke Onye ahụ na-arụzu ihe niile n’ime mmadụ niile.

MBEKU – Matiu 28:19-20

Aleluya, aleluya!

Gaanụ, kuziere mmadụ niile Oziọma M. A nọnyeere M ụnụ oge niile ruo na ngwụcha nke ụwa.

Aleluya!

OZIỌMA – 16:15-20

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Ọ rọgooro n’eluigwe, wee nọdụ n’aka nri Chukwu Nna.

Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Jeenụ n’ụwa niile, kwusaaranụ ihe niile e kere eke Oziọma. Onye kwerenụ, e mekwara mmirichukwu, a ga-azọpụta ya! Ma onye jụrụ ikwerenụ, a ga-ama ya ikpe!

Ọrụ ịrịba-ama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ: N’aha M, ha ga-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ; ha ga-ekwu okwu n’asụsụ ọhụrụ dị iche iche. Ọ bụrụ na ha achịrị agwọ n’aka, ma ọ bụ ñụọ nsi ọ bụla pụrụ iweta ọnwụ, ọ gaghị emerụ ha ahụ ma ọlị.

Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, n’ahụ, mee ka ahụ dị ha mma.” Mgbe Onyenweanyị Jesu gwasịrị Ụmụazụ Ya okwu ndị a, Chineke mere ka Ọ rọgoro n’eluigwe.

O wee nọdụ n’aka nri nke ike Chineke. E mesia, Ụmụazụ ya wee pụọ, kwusawa Oziọma n’ebe niile. Onyenweanyị na-esokwa ha n’ịrụ ọrụ. Ọ na-emekwa ka okwu ha guzosie ike n’ọrụ ebube nke na-eso ha n’azụ.

Igbo Mass Readings for May 7 2027, Fraịde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Igbo Mass Readings for May 6 2027, Emume Ncheta Nrọgoro N’Eluigwe nke Onyenweanyị – Afọ nke Abụọ.