Ọ bụrụ na-ịchọrọ Ịbata na Ndụ [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Ọ bụrụ na-ịchọrọ Ịbata na Ndụ‘ is one of the popular Igbo Hymns composed by Msgr Ezenduka which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Communion Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Ọ bụrụ na-ịchọrọ Ịbata na Ndụ Lyrics (Key Eb)

s.s:-.s/m:d.d/d.l,:-l,/d;s,/

Chorus: Ọ bụrụ n’ịchọrọ ịbata na ndụ

Ị ga-ahụ Osebụrụwa Chineke gị n’anya,

Were mmụọ gị nile, were obi gị nile, hụ ya n’anya.

Were uche gị nile hụ ya n’anya,

hụkwa mmadụ ibe gị k’isi hụ onwe gị n’anya

maka ihi Chukwu.

1. Kuziere ya ụmụ gị n’ụtụtụ,

Kuziere ya ụmụ gị n’abalị,

Kuziere ha ya mgbe ha nọ n’ụlọ,

Kuziere ha ya mgbe ha na-akwado nje m.

2. Ihe atọ na anọ ọdụ,

Okwukwe Nchekwube, Ịhụnanya.

Ịhụnanya kacha ha nile.

3. Gbara ya n’aka, kpuru ya n’isi,

dee ya n’ọnụ ụzọ ama,

dee ya n’ụzọ ime ụlọ.

4. Ịhụnanya dị ndidi, O nwere obi ọma,

Ọ naghị ekwo ekworo

Ọ naghị anya isi.

5. Ịhụnanya amaghị nneni, ọdịghị ngala.

Ịhụnanya dị ume ala, ọ naghị atụdo n’ihe ruoro ya.

6. Ịhụnanya enweghị iwe ọkụ.

Ọ naghị ebu ihe emere ya n’obi,

Ọ naghị añụrị na-ajọ ihe.

Añụrị ya bụ n’eziokwu.

7. Onyinye ọmụma ga-agafe,

Ịma amụma ga-akwụsị,

Onyinye asụsụ ga-agafe,

Ịhụnanya enweghị ịkwụsị akwụsị.

8. Ọ bụrụ na m nwere onyinye nile

ma m enweghịkwa ịhụnanya,

O nweghịkwa ihe m bụ.

9. Iwu ọhụrụ ka m n’enye ụnụ

hụnụ Ibe ụnụ n’anya etu m si hụ ụnụ.

Other Igbo Communion Hymns

Other Catholic Hymns