Igbo Mass Readings for June 12 2026, Emume Obi Dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 12 2026, Emume Obi Dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:6-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

Isi Okwu: Onyenweanyị họpụtara ụnụ ka ụnụ bụrụ ndị pụrụ iche.

Mosis gwara ndị mmadụ: ụnụ bụ ndị nsọ, ndị Chineke weere nye onwe ya. Ọ họpụtara ụnụ site n’agbụrụ niile dị n’ụwa a, ka ụnụ bụrụ ndị ya pụrụ iche.

Ọ bụghị n’ihi na ụnụ dị ukwuu n’ọnụ ọgụgụ karịa ndị ọzọ, ka o ji họpụta ụnụ, hụ ụnụ n’anya otu a; ọ bụkwaghị n’ihi na ụnụ dịkarịsịrị nta! Kama ọ bụ naanị n’ihi ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ụnụ nọ, na n’ihi imezukwa nkwa o kwere nna nna ụnụ ha.

Ọ bụ nke a mere o ji napụta ụnụ site n’ọnọdụ ịbụ ohu ụnụ n’ala Ijipt, ebe Fero ji aka ike ya na-achị ụnụ. Matanụ nke ọma na Chineke ụnụ bụ Chineke kwesịrị ntụkwasị obi onye na-edebezu nkwa ya mgbe niile; ịhụnanya ya na-adịgidekwa nye ndị niile hụrụ ya n’anya, ma na-edebezukwa ihe niile o nyere n’iwu.

Ma ndị niile kpọrọ ya asị ka ọ ga-ata ahụhụ, laakwa ha n’iyi. Ọ bụ ya ga-akwụ ha ụgwọ ha n’onwe ya. N’ihi ya, hụ na ụnụ debezuru iwu na ụkpụrụ ndị a m na-enye ụnụ taa.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 102: 1-4. 6-8. 10. Az. 17

Azịza: Ịhụnanya Onyenweanyị na-adịgide bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ n’etiti ndị na-atụ egwu ya.

1. Mkpụrụ obi m, too Dinwenụ.

Ihe niile dị n’ime m ga-etokwa aha nsọ ya.

Too Dinwenụ mkpụrụ obi m.

Echefukwala ngọzi ya niile.

Azịza: Ịhụnanya Onyenweanyị na-adịgide bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ n’etiti ndị na-atụ egwu ya.

2. Ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile,

na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,

Ọ na-azọpụta ndụ gị site n’ili,

na-ewere ịhụnanya ya na obi ebere ya na-ekpube gị dị ka okpu eze.

Azịza: Ịhụnanya Onyenweanyị na-adịgide bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ n’etiti ndị na-atụ egwu ya.

3. Dinwenụ na-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị a na-emegbu emegbu aka.

Na-emekwa ka ndị dị otu a nweta ihe ruuru ha.

O mere ka Mosis mata ụzọ ya,

meekwa ka ụmụ Izrel niile hụ ịdị ike nke ịrụ ọrụ ebube ya.

Azịza: Ịhụnanya Onyenweanyị na-adịgide bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ n’etiti ndị na-atụ egwu ya.

4. Dinwenụ bụ onye omiko na onye amara,

ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ.

Obi ebere na ịhụnanya ya babigara ụba oke.

Ọ dịghị ata anyị ahụhụ dị ka anyị si kwesị ịnata ahụhụ.

Ọ dịkwaghị akwụghachị anyị ihe ruuru anyị n’ihi mmehie.

Azịza: Ịhụnanya Onyenweanyị na-adịgide bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ n’etiti ndị na-atụ egwu ya.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:7-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ ozi mbuụ nke Jọn dere

Isi Okwu: Ịhụnanya si n’ebe Chineke nọ a bịa.

Ndị enyi m, o kwesịrị ka anyị hụrịtaa onwe anyị n’anya n’ihi na ịhụnanya na-esi n’ebe Chineke nọ abịa. Ndị niile na-ahụ ibe ha n’anya na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke.

Ha na-egosikwa na ha na-amata Chineke nke ọma nke ọma. Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ahụ ibe ya n’anya ọ na-ezipụta na ọ maghị onye Chineke bụ, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.

N’ihi na Chineke gosiri anyị ịdị ukwuu nke ịhụnanya ya site n’izite Ọkpara ya ka o wetara anyị ndụ ebighị ebi site n’ọnwụ ọ nwụrụ. Site n’ihe a Chineke meere anyị, anyị na-ahụ ihe a na-akpọ ịhụ mmadụ n’anya n’ezie.

Ọ bụghị na anyị buru ụzọ hụ Chineke n’anya kama ọ bụ na Chineke n’onwe ya hụrụ anyị n’anya zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi n’ihi mmehie anyị.

Ndị enyi m, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị n’anya. Ọ bụ ezie na o nwebeghị mgbe ọ bụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị n’anya, Chineke na-ebi n’ime anyị.

Ịhụnanya ya kwa na-eto eto n’ime anyị igosi anyị na o bi n’ime anyị. O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya n’ime anyị igosi anyị na o bi n’ime anyị, na anyị bikwa n’ime ya.

Karisia, anyị ejirila anya anyị hụ Ọkpara ahụ Chineke zitere. Ugbu a anyị na-akọrọ ụwa niile na Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta ụwa. Chineke bi n’ime onye ọ bụla kweere, na n’ime onye ọ bụla meghere ọnụ ya kwupụta na Jesu bụ Ọkpara Chineke.

Onye dị otu a bikwa n’ime Chineke. Anyị maara na Chineke hụrụ anyị n’anya n’ihi mmetụta ịhụnanya ya metụtara anyị, na n’ihi na anyị kweere na ya mgbe ọ gwara anyị na ọ hụrụ anyị n’anya.

Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụla kwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide n’ime Chineke. Chineke n’onwe ya na-ebiyekwara onye dị otu a.

MBEKU – Matiu 11:29

Aleluya, aleluya!

Soronụ ụzọ m, mụtakwanụ ihe site n’aka m. N’ihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala n’obi.

Aleluya!

OZIỌMA – 11:25-30

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: A dị m nwayọọ na umeala n’obi.

Jesu kpere ekpere sị: Nna, Onyenwe igwe na ala, ekelee m gị, n’ihi na i zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị. Ee, Nna, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya n’ụzọ dị otu a.

“Nna m enyefeela m ihe niile n’aka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya.

Bịakwutenụ m ụnụ niile ndị ike gwụrụ ibu ibu arọ e bokwasịrị ụnụ. Aga m enyekwa ụnụ izuike. Soronụ ụzọ m, mụtakwanụ ihe site n’aka m. N’ihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala n’obi. Ụnụ ga-achọtakwara obi ụnụ izuike. N’ihi na ụzọ m dị mfe, ibu m ga-ebokwasịkwa ụnụ adịghị arọ.”

Igbo Mass Readings for June 13 2026, Ncheta Obi Marịa na-ebughị Atụtụ Njọ / Igbo Mass Readings for June 13 2026, Satọde Izuụka nke Iri N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for June 12 2026, Emume Obi Dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Mbụ.