Igbo Mass Readings for June 4 2027, Emume Obi Dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 4 2027, Emume Obi Dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1. 3-4. 8-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Hozea
Isi Okwu: O bi m na-akwasi akwa ike n’ime m.
Gee ntị nụrụ Okwu nke Osebụrụwa: Mgbe Izirel bụ nwanta, ahụrụ m ya n’anya, site n’ala ljipt kpọpụta nwa m. Ọ bụ mụ onwe m zụrụ Ifrem mgbe ọ dị na nwanta.
Mụ onwe m ziri ya otu e si eje ije. Ejidere m ya n’aka m abụọ, ma ọ maghị na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya. Dị ka mmadụ si eduru onye ọ hụrụ n’anya, otu a ka m si jiri mmụọ nke ịhụnanya, na njikọta nke ịhụnanya duo ya.
Ewezugara m ibu arọ dị ya n’olu, hulata ala were nri tinye ya n’ọnụ. M ga-esi añaa were gị nyefee ndị iro gị n’aka, gị Ifrem? M ga-esi añaa nyefee gị n’aka ha, gị Izirel?
M ga-esi añaa mee gị ihe e mere Adma? M ga-esi añaa mee gị ihe e mere Zeboim? Obi m na-akwasi akwa ike n’ime m; ọ na-agụsi m agụụ ike inyere ụnụ aka.
Agaghị m enye ụnụ ahụhụ dị ka iwe ọkụ m si dị. Nke a bụ oge ikpeazụ m ga-emebi Ifrem. N’ihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ. Abụ m Onye Nsọ na-ebi n’etiti ụnụ. Agaghị m ejikwa ọnụma bịakwute ụnụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 12:2-6 Az. 3
Azịza: Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri na ụmị nke Nzọpụta.
1. N’ezie Chineke bụ onye nzọpụta m.
Enwere m nchekwube, egwu agaghị atụ m.
N’ihi na Onyenweanyị bụ ike m, ukwe m;
ọ bụ onye Nzọpụta m.
Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri n’ụmị nke nzọpụta.
Azịza: Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri na ụmị nke Nzọpụta.
2. Nyenụ Onyenweanyị ekele, toonụ aha Ya.
Meenụ ka ndị mmadụ mata ọrụ ịtụnanya Ya;
Kwupụtanụ ịdị ukwu nke aha Ya.
Azịza: Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri na ụmị nke Nzọpụta.
3. Bụọrọnụ Dinwenụ abụ ọma;
N’ihi na Ọ rụọla ọrụ ebube;
Kwupụtanụ ya na mba niile.
Ndị Zayọn, kwebenụ ukwe, tibenụ mkpu ọñụ,
n’ihi na onye nọ n’etiti ụnụ bụ nnukwu Onye Dị Nsọ nke Izrel.
Azịza: Ụnụ ga-eji ọñụ kuru mmiri na ụmị nke Nzọpụta.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:8-12.14-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs
Isi Okwu: Ịhụnanya Kristi enweghị atụ
Chineke nyere m ọrụ a, mụ bụ Pọl, onye dịkarịsịrị nta n’etiti ụmụ Chineke niile. Ma Chineke họpụtara m ịgwa ndị mba ọzọ ozi ọma banyere agwụghị agwụ nke akụ ebube ahụ pụrụ ịbụ nke ha site n’ime Kristi.
Chineke zikwara m ịkọwara mmadụ niile na Chineke bụkwa onye nzọpụta nke ndị mba ọzọ. N’ihi na nke a bụ ihe onye kere ihe niile zubere na nzuzo ime site na mbụ.
Gịnị mere Chineke jiri zube ime ihe ndị a? Ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ka ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe mata ịba ụba nke amamihe ya n’ụzọ dị iche iche dị ka o si na-arụpụta nzube ya n’ime nzukọ Kristi bụ chọọchị.
Na dị ka Chineke siri zubekwarị ime ya site na Jesu Kristi Onyenweanyị. Ya mere, mgbe anyị bịakwutere Kristi tụkwasị obi anyị n’ime ya, anyị nwere ike ịbịa n’ihu Chineke na-atụghị egwu n’ihi na anyị maara na ọ ga-anabata anyị.
Mgbe m nọdụrụ chee ihe banyere amamihe Chineke na ịdị ukwuu nke nzube ya, ana m ada n’ala gbuo ikpere n’ihu Nna Onyenweanyị Jesu Kristi, Onye ezinụlọ niile dị n’ụwa a na nke dị n’eluigwe na-esite n’aka ya enwe aha.
Ana m arịọkwa Chineke ka o site n’ịba ụba nke ebube ya nye ụnụ ike na-esite na Mmụọ Nsọ ya bịa, ka ụnụ bụrụ ndị dị ike n’ime mmụọ ụnụ. Ana m arịọkwa ka Kristi mee ka obi ụnụ bụrụ ebe obibi ya site n’okwukwe ụnụ n’ime ya.
Ana m arịọkwa ka Chineke mee ka ụnụ bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ n’ime ịhụnanya Chineke. Ana m arịọkwa, ka ụnụ na ndị Kristi niile nwee ike ịghọta enweghị atụ nke ịba ụba na ịdị ukwu nke ịhụnanya Kristi n’ebe anyị nọ.
Ka ụnụ mata, mazuokwa ụdị ịhụnanya Kristi nwere n’ebe anyị nọ. Ka ụnụ bụrụkwa ndị e mere ka ha jupụta n’ọdịdị Chineke n’onwe ya.
MBEKU – 1 Jọn 4:10
Aleluya, aleluya!
Ihe a na-akpọ ịhụnanya bụ: Chineke n’onwe ya hụrụ anyị n’anya mgbe o zitere Ọkpara ya ka Ọ bụrụ aja nke na ebupụ mmehie anyị niile.
Aleluya!
OZIỌMA – 19:31-37
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Otu onye n’ime ndị agha mapuru akụkụ ya, ọbara na mmiri sọpụta.
N’ihi na echi ya bụ ụbọchị izuike, ndị Juu achọghị ka ahụ ndị a a kpọgidere n’obe nọgide n’ebe ahụ tutuu chi abọọ. Ha jekwuuru Paịlet rịọ ya ka ọ gwa ndị agha ya ka ha gbajisia ụkwụ ha.
Nke a bụ n’ihi ha chọrọ ka ndị a nwụọ ọsịịsọ. Ọzọ kwa, n’ihi na ha chọkwara ibupụ ahụ ha. Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ ndị ahụ a kpọgidere n’obe n’akụkụ Jesu.
Ma mgbe ha bịaruru n’ebe Jesu nọ, lee ya anya, ha hụrụ na ọ nwụọla. N’ihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya. Kama otu onye n’ime ndị agha ahụ weere ube o ji n’aka maa Jesu n’akụkụ.
Nke a mere ka ọbara na mmiri site n’akụkụ ya sọpụta. Akụkọ a bụ eziokwu. Onye dere akụkọ a nọ mgbe ihe ndị a niile na-eme, hụkwa ha. Ọ chọkwara k’ụnụ kwere.
N’ihi na ihe ndị a niile mezuru ihe akwụkwọ nsọ kwuru. N’ihi na e dere ya n’akwụkwọ nsọ sị, “Otu ọkpụkpụ agaghị agbaji agbaji n’ahụ ya.” Ọzọ kwa, akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ha ga-elegide onye ahụ ha mara ube anya.
Igbo Mass Readings for June 5 2027, Ncheta Obi Marịa na-ebughị Atụtụ Njọ MAOBU Satọde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for June 4 2027, Emume Obi Dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Abụọ.