Igbo Mass Readings for June 27 2025, Emume Obi Dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 27 2025, Emume Obi Dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 34:11-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye amụma Izikel
Isi Okwu: Mụ onwe m ga-elekọta atụrụ m, Mụ Onwe m ga-egosi ha ebe ha ga-ezuruike.
Dinwenụ Chineke kwuru nke a: mụ onwe m ga-eji aka m pụọ gaa chọgharịa igwe atụrụ m. Mụ onwe m kwa ga-elekọta ha. Dị ka onye ọzụzụ atụrụ si elekọta atụrụ ya anya, mgbe ha na ya nọ, otu a ka m ga-esi lekọtaa igwe atụrụ m.
Aga m anapụta ha site n’ebe niile ha gbasasịrị gaa, n’ụbọchị igwe ojii na ọchịchịrị ahụ. Aga m esite n’obodo niile, na mba niile ha nọ kpọghachi ha n’ala nke ha.
Aga m azụ ha nri n’elu ugwu niile nke Izrel, na n’akụkụ mmiri niile, ebe ala na-ewepụta nri nke ọma. Aga m azụ ha n’ebe ịta ahịhịa mara mma na n’elu ugwu niile nke Izrel.
N’ebe ahụ ka ha ga-amakpukwa n’udo. Ha ga-ata nri n’ebe ịta ahịhịa mara mma nke elu ugwu Izrel. Ọ bụ mụ onwe m ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ nke atụrụ m niile.
Aga m eme ka ha makpuru n’udo, ka Onyenweanyị Chineke kwuru. Aga m achọ ndị furu efu n’ime ha, ndị kpafuru akpafu, kpọghachite ha n’ụlọ n’udo. Aga m ekechi ọnya ha, gwọọkwa ndị na-arịa arịa ọrịa ha.
Ma atụrụ ndị ahụ dị ike ka m ga-ala n’iyi. Aga m eji ikpe ziri ezi zụọ ha. Aga m abụrụ ha ezigbo onye nche atụrụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 22, Az. 1
Azịza: Dinwenụ bụ Onye nche m. O nwekwaghị ihe m ga-achọ.
1. Dinwenụ bụ Onye nche m. O nwekwaghị ihe m ga-achọ.
Ebe ahịhịa ndụ juru eju ka Ọ na-enye m ezumike.
Ọ na-eduga m n’agịga mmiri doro edo,
iji gbaa mmụọ m na-ada mba ume.
Azịza: Dinwenụ bụ Onye nche m. O nwekwaghị ihe m ga-achọ.
2. Ọ na-edu m n’ụzọ ziri ezi. Ọ dị ka ihe Ọ zara n’aha.
Ọ bụrụgodu na m na-aga na ndagwurugwu ọchịchịrị,
egwu ọ bụla agaghị atụ m.
I ji mkpara na ngu Gị nọnyere m n’ebe ahụ.
Ọ bụ ihe ndị a na-akasi m obi.
Azịza: Dinwenụ bụ Onye nche m. O nwekwaghị ihe m ga-achọ.
3. I ji aka Gị kwadoro m nnukwu oriri nke m ga-eri n’ihu ndị iro m.
I ji aka Gị tee m mmanụ n’isi.
Iko m juru n’ọnụ.
Azịza: Dinwenụ bụ Onye nche m. O nwekwaghị ihe m ga-achọ.
4. N’ezi okwu, sọ ihe ọma na obiọma ga na-eso m ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n’ụlọ nke Onyenweanyị ebighị ebi.
Azịza: Dinwenụ bụ Onye nche m. O nwekwaghị ihe m ga-achọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:5-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ ozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom
Isi Okwu: Ihe na-egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya bụ na Kristi nwụrụ maka anyị.
Mgbe ahụ, n’ọnọdụ ọ bụla, anyị pụrụ ịbụ ndị guzo chịm, na-atụghị egwu, n’ihi na anyị maara na Chineke hụrụ anyị n’anya, na o gosikwara ịhụnanya ya mgbe o nyere Ọkpara ya, onye sitere na Mmụọ Nsọ mejupụta obi anyị n’ịhụnanya Chineke.
Leenụ ka obi ebere Chineke siri dị ukwuu. Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọ bụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Jesu bịara nwụọ ọnwụ n’ihi anyị ndị mmehie.
A sịkwarị na anyị bụ ndị ezi omume ọ gaara abụ ihe siri ike mmadụ ịbịa nwụọ ọnwụ n’ihi anyị. Ma eleghị anya, a ga-ahụkwa onye nwere ike nwụọ n’ihi ezi mmadụ.
Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta Ihe! Mgbe anyị ka nọrị na-eme mmehie, Chineke zitere Kristi ka ọ bịa nwụọ n’ihi anyị. Ọ bụrụ na Chineke gụrụ anyị dị ka ndị ezi omume site n’ọbara Jesu wụsiri, a ga-esitekwa na Kristi zọpụta anyị site n’ọnụma Chineke.
N’ihi na ọ bụrụ na mgbe anyị bụ ndị iro ya, Chineke mere ka anyị na ya dịrị n’udo, site n’ọbara ahụ Kristi kwafuru, ọ bụkwaghị eziokwu na Chineke ga-azọpụta anyị ugbu a o bi n’ime anyị, n’ihi na e meela ka anyị na ya dịrị n’udo? Ọ bụkwaghị naanị nke a, ma anyị na-añụrịkwa ọñụ
Igbo Mass Readings for June 28 2025, Ncheta Obi Marịa na-ebughị Atụtụ Njọ
Igbo Mass Readings for June 27 2025, Emume Obi Dị Asọ nke Jesu – Afọ nke Atọ.