Igbo Mass Readings for November 9 2025, Emume Odido Nsọ Ụlọ Ụka Jọn Lateran
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 9 2025, Emume Odido Nsọ Ụlọ Ụka Jọn Lateran
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 47:1-2, 8-9, 12.
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Izikel
Nwoke ahụ wee kpọghachikwa m azụ n’ọnụụzọ ụlọnsọ; ma lee, mmiri si n’okpuru ụlọnsọ ahụ agbapụta na-asọda ụzọ ọwụwa anyanwụ ụlọ ahụ (maka na ụlọ nsọ ahụ chere ọwụwa anyanwụ ihu).
Mmiri si okpuru aka nri ụlọnsọ ahụ asọda na ndịda ebe nchụaja. O sikwa n’ọnụzọama nke dị na mgbago ugwu dupụta m, dugharịa m okirikiri n’ezi ruo n’ọnụụzọama nke mpụta nke chere ihu n’ọwụwa anyanwụ ebe mmiri ahụ sin a ndịda ugwu na-asọpụta.
Ọ gwa m sị, “Mmiri a si n’ọwụwa anyanwụ asọda na-agbada na Araba; mana mgbe ọ banyere na mmiri ahụ anaghị asọ asọ mmiri ahụ ga-agbanwe dị mma ọñụñụ.
Ebe ọbụla mmiri ahụ gara, ihe ọbụla e kere eke na-egwu mmiri dị na ya ga-adị ndụ, a ga-enwe ọtụtụ azụ maka na mmiri a na-abanye ebe ahụ ka mmiri osimiri dịkwa ọhụrụ, ya bụ na ihe ọbụla dị nay a ga-adị ndụ ebe ọbụla mmiri ahụ sọgara.
N’akụkụ abụọ nke ikpere mmiri ahụ, ọtụtụ osisi dị iche iche a na-eri eri ga-eto. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, nke mkpụrụ ga-akọ ha n’elu; ma ha ga na-amị mkpụrụ ọhụrụ ọnwa ọbụla maka na mmiri ha ji eto si n’ebe dị nsọ agbapụta. A ga-eji mkpụrụ ha eme ihe oriri werekwa akwụkwọ ha agwọ ọrịa.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 45:1-2, 5-6, 8-9.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarichaa mma, Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
1. Ọ na-agụ m nnukwu agụụ,
ka m bata n’ogige Osebụrụwa,
ka mkpụrụobi m na anụahụ m
na-ekwere Chineke dị ndụ ukwe ọñụ.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarichaa mma, Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
2. Ka o si dị, nnụnụ ebelebe na-achọtara onwe ya ụlọ obibi,
nnụnụ eleke achọtara onwe ya akwụ,
ebe ọ ga-edote ụmụ ya n’akụkụ ebe nchụaja gị,
Onyenweanyị onye pụrụ ime ihe niile,
onye bụ eze m na Chineke m.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarichaa mma, Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile..
3. Ha bụ ndị agọziri agọzi, ndị bi n’ụlọ gị
na-ekwere gị ukwe otito oge niile.
Ndị ike ha si na gị bụ ndị agọziri agọzi,
ndị bụ n’obi ha ụzọ a na-esi eru Zayọn.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarichaa mma, Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
4. N’ihina otu ụbọchị n’ebe gị ka mma
karịa nnụkwuru nnụ afọ ebe ọzọ,
Ọ kaara m mma ịbụ onye nche ụzọ n’ụlọ nke Onyenweanyị,
karịa ibi n’ebe obibi ndị ajọ mmadụ.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarichaa mma, Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:9-11, 16-17
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara Ndị Kọrịnt
N’ihina anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ; ụnụ bụ ala ubi nke Chineke, na ụlọ ya.
Dịka amara nke Chineke nyere m si dị, na dịka ọkacha mara n’iwu ụlọ, atọrọ m ntọala, onyeọzọ na-ewukwasịkwa n’elu ya.
Ma onye ọrụ ọbụla ga-elezi anya otu o si ewukwasị n’elu ntọala ahụ. N’ihina ọ dịghị onye pụrụ ịtọ ntọala ọzọ, ma ọ bụghị nke ahụ Chineke tọrọla bụ Jesu Kristi.
Ọ bụ na ụnụ amaghị na ụnụ bụ ụlọ nsọ nke Chineke, na Mmụọ nke Chineke bikwa n’ime ụnụ? Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. N’ihina ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ.
MBEKU
Alleluịa, Alleluịa:
N’ihina ugbu a, ahọrọla m ụlọ nsọ a ma dobekwa ya nsọ, ka aha m nọrọ ebe ahụ ebeebe, anya m na obi m ga-adịgide n’ebe ahụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 2:13-22
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Mgbe oge Emume Ngabiga nke ndị Juu na-eru nso, Jesu gbagoro na Jerusalem. N’ime ụlọnsọ, ọ hụrụ ndị na-ere ehi, atụrụ na nduru, nakwa ndị na agbanwe ego ka ha nọ na-azụ ahịa.
Jesu weere ụdọ meee ụtalị, si n’ụlọnsọ chụpụ ha niile, ma atụrụ, ma ehi. O kpudokwara oche ndị na-agbanwe ego ihu n’ala, fesachaa ego ha.
Ọ gwara ndị na-ere nduru sị, “Chịpụnụ ihe ndị a n’ebe a! Ụnụ emela ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ụlọ ahịa!”
Ndị na-eso ụzọ ya chetara na e dere sị, ‘Mmasị nke ụlọ gị na-anụ m ọkụ n’obi.” Ndị Juu jụrụ ya sị, “Olee akara Ị ga-egosị anyị banyere ime ihe ndị a?”
Jesu zara ha sị, “Mebienụ ụlọnsọ nke a, aga m arụghachikwa ya na mkpụrụ ụbọchị atọ.” Ndị Juu zaghachiri ya sị, “O were iri afọ anọ na isii iji rụọ ụlọnsọ a.
Ị ga-arụchi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ?” Ma Jesu na-ekwu banyere ụlọnsọ nke bụ ahụ ya.
Mgbe o siri n’ọnwụ bilie, ndị na-eso ụzọ ya chetara na o kwuru okwu a. Ha wee kwere n’Akwụkwọ Nsọ na n’okwu Jesu kwuru.
Igbo Mass Readings for November 10 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for November 9 2025, Emume Odido Nsọ Ụlọ Ụka Jọn Lateran