Onye Dịka Chukwu [Complete Hymn with Lyrics]
The hymn entitled ‘Onye Dịka Chukwu‘ is one of the popular Igbo Hymns composed by Ezenduka E., and Ezeudenyi E. which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Offertory Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.
Onye Dịka Chukwu Lyrics (Key F 3/4)
Intro solo;
s,.s,:s,/m:t,.t,:t,.d/s,:s,:l,/s,:-:-
Ọbụdụ onye nyere m ndụ n’hu ike
Ọbụdụ onye natasị m obi na ahụhụ
Ọbụdụ onye n’echebe m n’oge ọnwụnwa nile
Onye na-egboro m mkpa m o chi ma obi m o
Ọbụdụ onye dị ka gị.
Chorus: Bass
:t,:d.l/d.d:s,:m,/:l.s,:m/l:ta:l//
Soprano: d:-:-/r:-:-/d:-:-//
Onye g’enyedị mụ ndụ Chineke n’enye mụ o (onye) onye g’emere mụ ihe chineke n’emere m o (onye) onye ga-agwọdị mụ ọrịa Chineke gwọrọ m oo (onye) onye g’enye dị mụ nri Chineke n’enye mụ (onye) mmesọma ya n’ndụ mo kariri ọnụ ngụta, ọ gịnị ka m g’eji kelee ya aga m eji egwu dị mma, egwu oyoko, o nwere ih’ọma o mere m o omọkachie, dike, dike, omemma, ọgaranyangadanga, onye n’ememma, chi marụ mkpam o gaa gaa n’ogwu, chukwu nk’igwe, Ị bụ odogwu, odogwu na agha ezi chimoo onye ga-emere mụ ihe ị na-emere mo onye? Onye dịka chukwu.
1. Anya kiribe kiribe kiribe ihe ị na-emere n’ụwa, ọnụkọba, kọba, kọba, kọba kọba ọrụ ị na-arụ n’ụwa. Ihe ikere kọba ka kọdị ha ozughị o k’anyị jeenụ o k’anyị jeenụ jee kelee chineke (bass) makana ọ bụrụ enyi gị ọga emere gị ya? Nwanne gị ọ ga-emere gị ya? Nwunye gị ọ ga-emere gị ya? Di gị ọ ga-emere gị ya? Ọ bụ sọ chukwu, ezi chim o, nwanne m onye dịka chukwu.
2. Legharịkene anya n’ụwa ooo. Legharịkene anya ndụ gị nwanne m (ewo) lekene ngọzi Chineke na ndụ gị, lekene amara Chineke na ndụ moo, eze n’ịbụ omere ọha onye nwere gị nwere ihe karịchara, nwanne onye dịka chukwu.
3. I nwere ego ọkwa Chineke n’enye ego, i nwere arụike ọkwa Chineke nyere gị ya, ị mara mma nwanne m ị mara ebe o siri bịa? I nwere ọgụgụ isi onye nyere gị ya? Ihe nile i nwere ọkwa Chineke nyere gị ha, nwanne m onye dịka chukwu.
4. Aga m eji gịnị kelee ya, aga m eji gịnị kelee ya, aga m eji onyinye dịmma, aga m ejikwa egwu dị mma jee n’ihu ya nye ekele ọma maka na-etoo dike nkomere omekuọzọ, eze n’imeka, nwanne m onye dịka chukwu.
5. Kelee ya onyeọma n’eme mma, ọma mma mma zuruahụ chimo. REF. onye dịka gị. Solo: kelee ya kelee doo (ref) bịanụ kelee ya kwo n’emere gị ih’ọma eze ifeanyị chukwu chimo ịdị egwu onye obi ebere chimara obi moo ọnụ mụ kọba kọba ihe in’emere moo n’ụwa ahụ m bụrụ sọ ọnụ ozugị inye gị ekele ịnagọzi mo onye dịka gị onye dịka Chineke onye? Enyi mo lekene ndụ gị o, lekene ngọzi chukwu lee, chei chim lee onyọma, ony’ukwu ahaa, ọkwịgọziri moo ọkwa gị n’emere m ọgọ nwanne m soromụ kelee ya onye dịka chim oo.
Other Igbo Offertory Hymns
- Aja Dị Nsọ
- Anyị na-arịọ Gị Chineke Nna
- Bịanụ Wet’ihe Onyinye K’anyị nye Chineke
- Bịa nye Ya Ekene
- Bunye Chineke Onyinye Gị
- Bute Ihe Onyinye
- Bute Onyinye
- Butenụ Onyinye Dị Mma
- Butere Chineke Onyinye Gị
- Cheta ihe nile Chineke meere Gị
- Chineke Nara Onyinye anyị n’enye Gị
- Kele Chineke Jaa Ya Mma
- Chukwu Biko Nara Onyinye
- Chukwu Nna Nara
- Chukwu Nwa Emere Mmadụ
- Dinwenụ Anyị Ebutela Onyinye Anyị N’altar
- Ejila Onyinye Chineke eme Ngala
- Ihe m Nwere ka m Ga enye Dinwenụ
- Kedụ ihe m ga emelụ Dinwenụ
- Keleenụ Chukwu, Nyenụ ya Onyinye Ọmа
- Kwadoro Onwe Gị akụ N’eligwe
- Legodụ ihe Dinwenụ mere Anyị
- Mmụọozi nke Chineke bu Ite Mgbaisiọma
- Nara Ekele Chukwu N’enye Ezi Onyinye
- Nara O Chukwu
- Nara Onyinye Gọzikwa Ụmụ Gị
- Nara Onyinye Gọzie, Chukwu
- Nye Onyinye Chineke
- Onye Dịka Chukwu
- Nye Chineke Onyinye
- Nye Ya Onyinye Dị Mma
- O Chukwu Biko Nara Aja
- Onyinye Dị Asọ
- Ọkaka Imeka
- Olisa Doo
- Onye Na-enye Onyinye N’obi Ọcha
- Onyinye Ajadụ Nyere
- Onyinye Obi Ọcha
- Onyinye Mara Mma
- Onyinye Ọma
- Pụtanụ K’anyị nye Chineke Nna Onyinye
- Werenụ ọñụ bute Onyinye ụnụ n’ihu Chineke
- Were Onyinye Dị Mma Kelee Ya
- Anyị Erunyelụ Gị O Chukwu
- Chineke Nara Onyinye nke Ụmụ Gị
- Chukwu Họtalụ Abraham
- Kristi Dinwenụ Ụkọchukwu Ebebe
- Chineke Nna Onye na-enye Onyinye
- Chukwu Nna Dị Nsọ Anyị Ekele Gị
- Ekele Dịrị Onye Onyinye
- Ekene Marịa Ezigbo Nne
- Jesu Nara Onyinye Anyị
- Kedụ ihe m ga-emere Chineke
- Wetanụ ihe Onyinye dị mma, Nye Chineke
- Kịtaa Ahụ na Mmee Jesu
- Kedụ ihe m ga-enye Gị Chi m Chukwu bi n’igwe
- Onyinye nke Chukwu
- Ọlaọcha na Ọlaedo
- Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri
- Ọ bụ Gịnị ka m ga-enye Onyenwe m
- Ọ bụ Chineke Nwe Ndụ
- Werenụ Onwe Gị nye Chukwu
- Aga m Enye Chukwu Onyinye
- Bịanụ Ka Anyị Keleenụ Chukwu
- Bịa Kelee Ya
- Buru Ụzọ Chọwa Alaeze
- Chinaemere m
- Ezi Chukwu Nara Aja Anyị
- Jesu Nwa Chineke Abịago
- Mma Mma Jesus
- Nara Aja N’aka Ụkọchukwu
- Nekene Ọlụ Dị Mma Chineke Nna Lụrụ Gị
- Ọ Gọzie Gị Kelee Ya
- Onyinye Siri N’ezi Obi
- So m Too Chukwu
- Kosisọ Chukwu
- Chinecherem
- Nyenụ Chukwu Ekele Kach’elu