Onyinye Ajadụ Nyere [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Onyinye Ajadụ Nyere‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Offertory Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Onyinye Ajadụ Nyere Lyrics

Chorus: Jesu toro nwanyị ajadụ

maka onyinye nke onyere

Ọ sị na ndị ọzọ nyere ụba ha

nwanyị nye Chunkwu onwe ya.

1. Mkpụrụ obim jụọ onwe gị

Kedụ ihe ịgenye Chukwu,

Lee k’ụmụnne gị bu onyinye ha

na-eje n’altar Chukwu.

2. Ogbe achịcha n’iko mmanya

nọchiri anya mụ n’onwe m

nara O Chukwu ihe ikere

Ị bụ Chukwu onyenwe m.

3. Obi mmadụ dị ịtụnanya

Ọ n’amị ka ọkwụrụ

Ọ n’akpọ onwe ya nwaodibo Chukwu

ma nọ n’emeriri njọ.

4. Na ndụ m nile ihe m chọrọ

bụ ime uche Chukwu

ma n’oge añụrị ma n’ime ahụhụ

aga m n’eso iwu ya.

5. N’obi Jesu n’elu alta

ka m na kpọdo obi nke m,

k’ọchịchị gị bịa ka emee uche Chukwu

ka n’ụwa ka n’obi m.

6. O Chukwu Nna ji ike nile

n’obi ọma gị gọzie anyị,

gọzie ụlọ anyị n’obodo anyị

na nzukọ Nsọ Katọlik.

Other Igbo Offertory Hymns

Other Catholic Hymns