Oriri Ahụ na Ọbara Kristi [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Oriri Ahụ na Ọbara Kristi‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Communion Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Oriri Ahụ na Ọbara Kristi Lyrics (Key D)

m.s:d’.d’/t.t:t.r/d:s/-:-//

Chorus: Oriri ahụ na ọbara Kristi oriri ahụ na ọbara Kristi bụ ihe dị oke ọnụ, Ọ na-enye ndụ nke mmụọ. Ọ na-enye ndụ nke mmụọ na eketakwara anyị añụrị ebebe, K’anyị rienụ k’anyị rienụ, Ka anyị rienụ, ñụrịa na Kristi.

1. Onye ọ bụla riri oriri a n’ezi mmụọ n’ezi okwu, G’enwe ndụ ebighịebi. Site na Kristi onye bụ Ọkpala Chineke.

2. Achịcha nke a n’enye ndụ

Achịcha nke a n’enye ndụ bụ ihe omimi dị elu,

Nke Kristi n’onwe ya bụ onye hụrụ anyị n’anya debere anyị mgbe Ọ na hapụ ụwa.

3. K’anyị chegharịa na mmehie anyị k’anyị wee bịakwute Jesu Kristi, Jesu Kristi bụ Achịcha anuu nke si n’eligwe gbadata maka ndụ nke ụwa nile.

4. Otito dịrị Nna Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ, Onye dị ndụ na-achị ebighịebi ebighịebi, onye dị ndụ na-achị ebighịebi.

Other Igbo Communion Hymns

Other Catholic Hymns