Oriri Ụmụ Eligwe [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Oriri Ụmụ Eligwe‘ is one of the popular Igbo Hymns composed by J. A. Orazulike which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Communion Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Oriri Ụmụ Eligwe Lyrics

Chorus: Ụmụ Chineke kulienụ bịa, ụmụ Chineke kulienụ k’anyị jee nar’oriri nsọ bụ ahụ n’ọbara Dinwenụ Ụkọchukwu gọziri ya nyawaa Ọ bụr’ihe oriri n’enye ndụ n’ime mmụọ, Nye ndị nile jiri obi ha kwere n’oziọma nke Chukwu. Oriri nsọ oriri nsọ Ndụ ebebe jupụtara n’ime ya.

1. Onyenweanyị Jesu Kristi Imeka site n’onyinye Eucharịstịa inyer’anyị. Ọtụtụ mmadụ anatago ya nat’ọnwụ rie ya rie ọnwụ maka na ha natara n’etoghị eto maka ihi ya nyocha onwe gị ka Ị mara n’itozukwara ị nata ya.

2. Bịa nara Dinwenụ n’oriri nsọ onye zur’oke n’ụdị achịcha na mmanya. Ka obi gị were keta ọñụ n’aka Chukwu. Chineke biko chebe m chebe mkpụr’obi m. Biko chekwaba m Dinwenụ ka onye iro ghar’idubakwa mkpụr’obi m na njọ.

3. Chegharịa do sonyere ụmụ Chineke n’oriri nsọ. Soro ha rie ñụọ ka inwee ọñụ n’ime gị. Ma ọbụrụ n’irighị ya ị mara na Kristi nwụrụ n’efu maka gị n’elu obe.

4. Ekele dịrị Gị Chukwu Chukwu, Onye ọma Chukwu, Nna Onyenweanyị nara otito dị elu onyinye kachasị ndị ọzọ mma k’inyere anyị sị anyị ñụrịba gorịba. O riri ndị mmụọma nke Chukwu ka mmadụ n’eri.

Other Igbo Communion Hymns

Other Catholic Hymns