Igbo Mass Readings for January 1 2025, Nnukwu Oriri Marịa dị Asọ Nne nke Chukwu.
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 1 2025, Nnukwu Oriri Marịa dị Asọ Nne nke Chukwu.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:22-27
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Ọnụọgụgụ
Isi Okwu: “Ha ga-akpọdata aha M n’isi ụmụ Izrel; aga M agọzikwa ha.”
Dinwenụ gwara Mosis sị: “Lee ihe ị ga-agwa Erọn na ụmụ ya: “Otu a ka ụnụ ga-esi na-agọzi ụmụ Izrel. Gwa ha sị: Ka Dinwenụ gọzie ụnụ chegidekwa ụnụ.
Ka ihè nke Dinwenụ chakwasa ụnụ; ka O nyekwa ụnụ amara Ya. Ka Dinwenụ chee ụnụ ihu, bịakwa wetara ụnụ udo. “Otu a ka ha ga-esi kpọdata aha M n’isi ụmụ Izrel, ewere M gọzie ha.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Ps. 67:2-3, 5,6,8, Az. 2
Azịza: Chineke, biko meere anyị ebere gọzie anyị
1. Chineke, biko, meere anyị ebere, gozie anyị,
meekwa ka ihe nke ihu Gị chakwasa anyị,
ka e were mata ụzọ Gị n’ụwa.
Mba niile abịakwa nweta enyemaka nzọpụta Gị.
Azịza: Chineke, biko meere anyị ebere gọzie anyị
2. Ka mba nile ñụrịa na-egorikwa,
n’ihi na I ji ikpe nkwụmọtọ na-achị ụwa,
jirikwa ezi obi na-achị ndị mmadụ.
Ọ bụ Gị na-edu mba niile n’ụwa.
Azịza: Chineke, biko meere anyị ebere gọzie anyị
3. Dinwenụ, ka ndị mmadụ too Gị,
ka mmadụ niile nye Gị otito.
Ka Chineke nọgide na-enye anyị ngọzi Ya,
ruo mgbe mba niile ga-atụrụ Ya egwu.
Azịza: Chineke, biko meere anyị ebere gọzie anyị
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:4-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshịa
Isi Okwu: Chineke zitere Nwa Ya nwanyị mụrụ.
Mgbe oge ahụ a kara aka zuru, Chineke zitere Nwa Ya, Onye nwanyị mụrụ; Onye a mụrụ n’okpuru iwu, ka O wee gbapụta ndị nọ n’okpuru iwu, bịakwa mee anyị ndị e jiri mere ụmụ.
Ihe na-agba akaebe na ụnụ bụ ụmụ n’ezie, bụ na Chineke zitere Mmụọ nke Nwa Ya n’ime obi anyị; ọ bụ Mmụọ ahụ na-eti mkpu na-asị “Abba! Nna!”
Ọ bụ Ya na-eme ka ị bụrụ nwa n’ezie. Ị bụkwaghị ohu ọzọ. Ebe Chineke merela ka ị bụrụ nwa Ya, ọ pụtara na ị bụrụkwala onye ga-erite oke a na-ekenye ụmụ.
ALELUYA – Hib. 1:1-2
Aleluya, aleluya!
N’oge gara aga. Chineke siri n’ọnụ ndị amụma gwa nna nna anyị ha okwu. Ma n’oge ugbu a, O si n’ọnụ Nwa Ya agwa anyị okwu.
Aleluya!
OZIỌMA – 2:16-21
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Ha hụrụ Marịa na Josef na Nwata ahụ.
Ndị nche atụrụ ji ọsọ na ije gawa Betlehem. Ha hụrụ Marịa na Josef na Nwata ahụ ka O dina n’ihe e ji etinye nri anụ ụlọ. Mgbe ha hụrụ Nwata ahụ, ndị nche atụrụ akọkwa ọzọ ihe a gwara ha banyere Ya.
Akụkọ ndị nche atụrụ tụrụ onye ọ bụla nụrụ ya n’anya. Mana Marịa chịịrị okwu niile ndị a, wụnye n’obi ya, na-atụgharịkwa ha n’obi ya. Mgbe ndị nche atụrụ na-alaghachi, ha na-aja Chineke mma, na-etokwa Ya, maka ihe niile ha nụrụ na ihe niile ha hụrụ.
Ihe ha hụrụ bụ kpọmkwem ihe a gwara ha. N’ụbọchị nke asatọ ya, mgbe oge zuru maka ibi Nwata ahụ ugwu, aha a gụrụ Ya bụ Jesu, nke bụ aha Mmụọ ozi nyere Ya tupu a dị ime Ya.
Igbo Mass Readings for January 2 2025 – Tọọzdee
Igbo Mass Readings for January 1 2025, Nnukwu Oriri Marịa dị Asọ Nne nke Chukwu.