Pụtanụ K’anyị nye Chineke Nna Onyinye [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Pụtanụ K’anyị nye Chineke Nna Onyinye‘ is one of the popular Igbo Hymns composed by Egbo P.O. which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Offertory Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Pụtanụ K’anyị nye Chineke Nna Onyinye Lyrics (Key F24)

Refrain: Pụtanụ k’anyị nye Chineke Nna onyinye,

Kulie tụọrọ Chineke gị mma mma

Inye ya onyinye dị mma onyinye obi ọcha.

Ọ ga-anara ya ma nyekwa gị mmaji. DC.

1. Gịnị ka i nwere n’ụwa na-abụghị Chineke nyere gị?

Ego ole ka iji n’akpa gị,

Ọ bụ ole ka ịga enye Chukwu.

2. Ngị onye n’asị, n’onweghị ihe Chukwu nyere gị,

Ị na-ajụkwa onwe gị ajụjụ.

Ụkwụ iji aga ije, anya iji ahụ ụzọ,

Ndụ ịdị n’ụwa, Nwannem,

ego ole ka iji zụta ha.

3. Ịsaghepụ aka gị wee nye onyinye

Onyenweanyị ga-anara ya

Akụ n’ụba gị ga‐abawanye.

4. Ndị ọgaranya, pụta nye Chukwu onyinye,

Ndị ogbenye, bịanụ nye Chineke onyinye dị mma, N’ihina, onyinye dị mma ka Chineke n’achọ.

Other Igbo Offertory Hymns

Other Catholic Hymns