Igbo Mass Readings for May 17 2025, Satọde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 17 2025, Satọde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 13: 44-52
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
N’ụbọchị Sabat nke sonụ, Ọ fọdụrụ ntakịrị ka obodo ahụ niile zukọọ ịnọ okwu Chineke. Oge ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ahụ, ha jupụtara n’ekworo. Ha malitere ịgbagha ihe niile Pọl kwuru na-enyekwa ya mkparị.
Pọl na Banabas kwuru okwu n’asọghị anya, sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa ụnụ okwuchukwu. Ma ebe ọ bụ na ụnụ jụrụ ya, gosikwa na ụnụ ekwesịghị inweta ndụ ebighịebi.
Lee, anyị ga-ahapụ ụnụ gakwuru ndị mba ọzọ. Otu a ka Chineke nyere anyị n’iwu sị, “Ahọpụtala m gị ka ị bụụrụ ndị mba ọzọ ihè, ka i wetara akụkụ ụwa niile nzọpụta.”
Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ nke a, obi tọrọ ha ụtọ, ha toro okwu Chineke. Ndị niile e debeere ịnata ndụ ebighịebi kweere na Jesu. Okwu nke Chineke gbasara na mpaghara obodo ahụ niile.
Ndị Juu kpalitere ụmụnwaanyị ndị na-atụrụ Chukwu egwu na ndịisi obodo, iji megide Pọl na Banabas. E mesiri ha ike, chụpụ ha n’obodo ha. Ndịozi ahụ tichapụrụ aja dị ha n’ụkwụ gaba Aịkonium. Ma ndị na-eso ụzọ Jesu jupụtara n’ọñụ na Mmụọ Nsọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98: 1, 2-3, 3-4.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ebube,
aka nri ya na aka ya dị nsọ,
eweterela ya mmeri.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
2. Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya,
o meela ka mba niile mata eziomume ya.
O chetala ịhụnaanya ya na ịkwụdosiike ya,
n’ebe ezinụụlọ Izrel nọ.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
3. Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ,
werenụ ukwe na mkpu ọñụ too ya.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Ọ bụrụ na ụnụ so Kristi bilie n’ọnwụ na-achọnụ ihe dị n’eluigwe ebe Kristi nọ n’aka nri nke Chukwu.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 14: 7-14.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “A sị na ụnụ maara m, ụnụ ga-amakwa Nna m. Site ugbu a ụnụ amarala ya, ụnụ ahụkwala ya.” Filip asị ya, “Onyenweanyị gosi anyị Nna ahụ, ọ ga ezuru anyị.”
Jesu ajụọ ya sị, “Mụ na ụnụ a nọọla ogologo oge ha otu a, ma Ị mataghị m Filip? Onye hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘Gosi anyị Nna ahụ? Ọ bụ na i kweghị na m nọ n’ime Nna, na Nna nọkwa n’ime m?
Okwu m na-agwa ụnụ abụghị site n’ike aka m, kama ọ bụ Nna nọ n’ime m na-arụ ọrụ ya. Ya bụ, kwerenụ ihe m kwuru, na-anọ m n’ime Nna, Nna nọrọkwa n’ime m.
Ma ọbụghị otu a, kwerenụ ihe m na-ekwu, n’ihi ọrụ ebube m na-arụ. N’ezie, n’ezie, agwa m ụnụ, onye ọbụla kwere na m, ga-arụ ọrụ ndị a m na-arụ.
Ọ ga-arụkwa karia n’ihi ana m agakwuru Nna. Ihe ọbụla ụnụ rịọrọ n’aha m, aga m eme ya, ka e wee nye Nna otito site na nwa ya. Ọ bụrụ na ụnụ arịọ ihe ọbụla n’aha m, aga m eme ya.
Igbo Mass Readings for May 18 2025, Ụka Nke Ise N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ
Igbo Mass Readings for May 17 2025, Satọde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.