Igbo Mass Readings for February 8 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 8 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 13:15-17, 20-21
Ihe Ọgugu Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru
Site na Jesu Kristi, ka anyị chụnyerenụ Chukwu aja otito mgbe niile nke bụ mkpụrụ nke egbugbereọnụ na-ekwupụta aha ya. Ụnụ ahapụkwala ime iheọma mọbụ ime ka ndịọzọ ghara isoro kere ihe ụnụ nwere, n’ihina aja dị otu a na-amasị Chineke.
Rubere ndịndu ụnụ isi, nọdụkwanụ n’okpuru ha n’ihina ha na-eche mkpụrụobi ụnụ nche site n’ekpere, dịka ndị ga-aza ajụjụ banyere ụnụ. Ka ha were obi ụtọ na eme nke a. Ya abụla site n’obi ọjọọ, n’ihina nke a a gaghị abara ụnụ uru.
Ugbu a, ka Chineke nke udo onye si na ndị nwụrụ anwụ kpọghachi Onyenweanyị Jesu Kristi nnukwu onye nche atụrụ site n’ọbara nke ọgbụgbandụ dị ebeebe, nyezuo ụnu ihe ọma niile iji mee uche ya.
Ka ọ na-arụ n’ime ụnụ ihe nke ahụ na-adị mma n’ihu ya, site na Jesu Kristi onye otito nile bụ nke ya ebeebe ebeebe. Amen.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 23:1-3, 3-4, 5-6.
Azịza: Chineke bụ onyenche m, Onweghị ihe m ga-achọ.
1. Chineke bụ onyenche m, Onweghị ihe m ga-achọ.
Ọ na-eme ka m zuru ike ebe ahịhịa ndụ dị,
Ọ na-eduga m na mmiri,
ebe ahụ ka Ọ na-enye m ike.
Azịza: Chineke bụ onyenche m, Onweghị ihe m ga-achọ.
2. Ọ na-edu m n’ụzọ eziomume;
n’ihi aha ya,
Ọ bụrụgodu na m na-aga na ndagwurugwu nke ọnwụ,
egwu ọbụla agaghị atụ m,
i ji mkpara na ngu gị nọdebebe m,
Ọ bụ ha na-enye m agbamume.
Azịza: Chineke bụ onyenche m, Onweghị ihe m ga-achọ.
3. Ị na-akwadoro m nri,
n’ihu ndịiro m.
I teela isi m mmanụ,
iko m ejula n’ọnụ na-agbọfu.
Azịza: Chineke bụ onyenche m, Onweghị ihe m ga-achọ.
4. N’ezie, obiọma na ebere ga na-eso m
ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke
ebeebe ebeebe.
Azịza: Chineke bụ onyenche m, Onweghị ihe m ga-achọ.
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Atụrụ m ga-ege m ntị, Dinwenụ na-ekwu, a mara m ha, ha na eso m.
Alleluia.
OZIỌMA – 6:30-34
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Ndị ụmụazụ Jesu lọghachikwutere ya kọọrọ ya ihe niile ha mere na ihe ha kuziri. Ọ sịrị ha, “Bịanụ ka anyị gaa ebe sọ anyị ga-anọ zuru ike nwa oge”.
O kwuru nke a n’ihina ọtụtụ mmadụ na-abịa, na-alakwa, nke mere na ha enweghị ohere ọbụla iri ihe. Ha bara n’ụgbọmmiri, gaa ebe naanị ha ga-anọ. Ọtụtụ mmadụ hụrụ ha ka ha na-apụ matakwa ha.
Ha jiri ọsọ si n’obodo dị icheiche, buru Jesu na ndị ụmụazụ ya ụzọ garuo ebe ha na-aga. Ka Jesu rịdatara n’ụgbọ, ọ hụrụ ọtụtụ igwe mmadụ ka ha gbakọrọ.
O nwere obi ebere n’ebe ha nọ, n’ihina ha dịka atụrụ na-enweghị onye nche. O wee malite ikuziri ha ọtụtụ ihe.
Igbo Mass Readings for February 9 2025, Ụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Atọ.
Igbo Mass Readings for February 8 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.