Igbo Mass Readings for February 7 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 7 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:4-13

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Ndịeze nke mbụ

N’otu ụbọchị, Solomọn gara n’ugwu Gibiọn ịchụ aja, n’ihina ọ bụ ebe nchụaja nke kacha elu. Ọ chụọlarịị aja nsureọkụ ruru otu puku ebe ahụ n’oge gara aga.

N’abalị ahụ n’ugwu Gibiọn, Yahweh bịakwuteree ya na nrọ jụọ ya sị “Ole ihe ị chọrọ ka m meere gị” Solomọn zara ya siị, “i gosịrị nna m Devid ịhụnaanya dị ukwu, onye nke bụ nwodibo gị, onye mere iheọma, onye nwere nrubeisi nakwa onye eziokwu.

Ị nọkwa na-egosi ịhụnaanya gị n’ebe ọ nọ site n’inye ya nwa nke nọchiri ya dịka eze. Yahweh, Chineke m, i meela ka m nọchie anya nna m dịka eze, mana aka m bụ nwantakịrị amaghị ka e si achị ọchịchị.

Lee nwodibo gị nọ n’etiti ndị ị họọrọ ka ha bụrụ ndị nke gị, ndị nke apụghị ịgụta ọnụ. Biko nye m amamihe zuru oke nke m ga-eji kpee ikpe nkwụmọtọ, chịa ndị nke gị, ka m wee marakwa ihe dị iche n’etiti iheọma na ihe ọjọọ.

Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye nwere ike ịchịkọta ndị nke gị a dị ukwuu? Obi tọrọ Yahweh ụtọ n’ihina Solomọn rịọrọ nke a. O wee sị ya, “Maka na ị rịọrịọ amamihe nke ikpe nkwụmọtọ, karịa ndụ ogologo mọbụ ụba, mọbụ ọnwụ nke ndịiro gị, aga m enyekwa gị ihe ndị ahụ ị rịọrịọ m.

Aga m enye gị amamihe na nghọta karịa nke onye ọbụla ma ugbu a mọbụ n’ọdịniihu. Aga m enyekwa gị ihe ndị nke ị rịọghị m: na ndụ gị niile ịga-enwe akụnụụba, na nsọpụrụ karịa nke eze ọbụla nwere.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119:9,10, 11, 12, 13, 14

Azịza: Onyenweanyị, kụziere m iwu gị

1. Kedụ ka nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị ọcha?

Ọ bụ site n’idebe okwu gị.

Azịza: Onyenweanyị, kụziere m iwu gị

2. Eji m obi m niile achọ gị,

Ekwela aka m jehie ụzọ n’iwu gị.

Azịza: Onyenweanyị, kụziere m iwu gị

3. Ejisiri m okwu gị ike n’ime obi m

Ka m wee ghara ime njọ megide gị.

Azịza: Onyenweanyị, kụziere m iwu gị

4. Ngọzi dịrị gị O Onyenweanyị

kụziere m iso ụzọ gị.

Azịza: Onyenweanyị, kụziere m iwu gị

5. Eji m egbugbere ọnụ m,

wee kwupụta iwu niile siri n’ọnụ gị pụta.

Azịza: Onyenweanyị, kụziere m iwu gị

6. Ana m enwe añụrị n’iso iwu gị.

Kama akụnụụba niile nke ụwa a.

Azịza: Onyenweanyị, kụziere m iwu gị

MBEKU

Alleluia, Alleluia:                     

Atụrụ m ga-ege m ntị, Dinwenụ na-ekwu, a mara m ha, ha na eso m.

Alleluia.

OZIỌMA – 6:30-34

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Ndị ụmụazụ Jesu lọghachikwutere ya kọọrọ ya ihe niile ha mere na ihe ha kuziri. Ọ sịrị ha, “Bịanụ ka anyị gaa ebe sọ anyị ga-anọ zuru ike nwa oge”.

O kwuru nke a n’ihina ọtụtụ mmadụ na-abịa, na-alakwa, nke mere na ha enweghị ohere ọbụla iri ihe. Ha bara n’ụgbọmmiri, gaa ebe naanị ha ga-anọ. Ọtụtụ mmadụ hụrụ ha ka ha na-apụ matakwa ha.

Ha jiri ọsọ si n’obodo dị icheiche, buru Jesu na ndị ụmụazụ ya ụzọ garuo ebe ha na-aga. Ka Jesu rịdatara n’ụgbọ, ọ hụrụ ọtụtụ igwe mmadụ ka ha gbakọrọ.

O nwere obi ebere n’ebe ha nọ, n’ihina ha dịka atụrụ na-enweghị onye nche. O wee malite ikuziri ha ọtụtụ ihe.

Igbo Mass Readings for February 8 2026, Ụka nke Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ

Igbo Mass Readings for February 7 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.