Igbo Mass Readings for February 26 2028, Satọde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 26 2028, Satọde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:13-20
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis
O nwere onye n’ime ụnụ na-ata ahụhụ? Ya kpee ekpere. O nwere onye n’ime ụnụ nwere obi ụtọ? Ya kwee ukwe otito. O nwere onye n’ime ụnụ ahụ na-adịghị ike?
Ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ ka ha kpeere ya ekpere tee ya ude n’aha nke Onyenweanyị. Arịrịọ nke okwukwe na-azọ onye ọrịa. Yahweh ga-ekulite ya elu. Ọ bụrụ na ọ nọ n’ime njọ a ga-agbaghara ya.
Na-ekwupụtanụ mmehie ụnụ ebe ibe ụnụ nọ. Na-ekperenụ ibe ụnụ ekpere ka Chineke gwọọ ụnụ. Ekpere nke onye eziomume dị ike nke ukwu n’ịrụzu ihe a chọrọ ka ọ rụọ. Elaịja bụ mmadụ ibe anyị.
Ma o kpesiri ekpere ike ka mmiri ghara izo. Mmiri ezoghịkwa n’ala afọ atọ na ọnwa isii. O mechakwara kpee ekpere ọzọ. Eluigwe enye mmiri ozuzo, ala amịpụtakwa mkpụrụ ya.
Ụmụnna m! Ọ bụrụ na onye ọbụla n’ime ụnụ na-esi n’eziokwu ahụ jehie otu onye akpọghachi ya, ya mara na onye ọbụla kpọghachiri onye njọ site na njehie nke ụzọ ya ga-azọpụta mkpụrụobi onye njọ ahụ n’ọnwụ. Onye ahụ gbọchirila ya ọtụtụ njọ, mekwaa ka Chineke gbaghara ya ọtụtụ njọ ndị o merela.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 141:1-2, 3, 8
Azịza: Nabata ekpere m dịka aja mgbaisiọma
1. Onyenweanyị ana m akpọku gị bịakwute m ọsọọsọ
nụrụ olu m mgbe m kpọkuru gị.
Nabata ekpere m dịka aja mgbaisiọma,
aka m na-asara gị dịka aja a na-achụrụ gị n’uhuruchi.
Azịza: Nabata ekpere m dịka aja mgbaisiọma
2. Onyenweanyị nyere m aka ka m mechite ọnụ m
Chekwaba egbugbere ọnụ m!
Mana anya m dị n’ebe ị nọ O Onyenweanyị
Ị bụ ebe mgbaba m, ekwekwala ka ha gbuo m!
Azịza: Nabata ekpere m dịka aja mgbaisiọma
MBEKU – Matiu 11:25
Alleluia, Alleluia:
Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke alaeze.
Alleluia.
OZIỌMA – 10:13-16
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ndị mmadụ kpọtaara Jesu ụmụntakịrị ka o metụ ha aka; ma ndị eso ụzọ ya baara ha mba. Ma mgbe Jesu hụrụ ihe ha na-eme, iwe were ya nke ukwuu.
O wee sị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m, ụnụ egbochila ha n’ihina Alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a. N’ezie agwa m ụnụ, onye ọbụla nke na-agaghị anabata Alaeze Chineke dịka nwatakịrị, agaghị aba n’ime ya”. Ma o kuuru ha n’aka ya gọzie ha, bikwasa ha aka n’isi.
Ma o kuuru ha n’aka ya gọzie ha, bikwasa ha aka n’isi.
Igbo Mass Readings for February 27 2028, Ụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Atọ
Igbo Mass Readings for February 26 2028, Satọde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.