Igbo Mass Readings for May 29 2027, Satọde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 29 2027, Satọde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 51:12-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak

Ị nụrụ ekpere m, maka na I sila na mbido gbapụta m, sikwa n’ọnọdụ ọjọọ zọpụta m. N’ihi nke a, aga m enye gị ekele, tookwa gị. Aga m agọzi aha nke Onyenweanyị.

Oge m ka bụ nwaokorobịa, tupu m malite njem, arịọsiri m ike n’ezoghị ezo ka e nye m amamihe. Arịọrọ m maka ya n’ihu ụlọnsọ, agakwa m na-aga n’ihu n’ịchọ ya wee ruo na njedebe.

Bido n’ịma ifuru ya ruo n’ọchịcha mkpụrụ ya, obi m dị n’ebe ọ nọ. Ụkwụ m so ụzọ kwụ ọtọ; site n’okorobịa, eso m nzọ ụkwụ ya.

Egere m ntị nwantịtị wee nweta ya. Achọtara m ihe ndụmọdụ na ya. N’ime ya ka m si wee nweta agamniihu. Aga m eto onye ahụ nyere m amamihe, maka na ekpebiela m ibi ndụ amamihe.

Ejikwaara m ịnụọkụ nke obi chọọ ihe ziri ezi, ihere agaghị eme m. Agbara m mbọ n’inweta amamihe. N’usoro nke ndụ m, enyeghịrị m onwe m ohere, asaara m igwe aka n’ekpere, na-ebe, n’ihina iti ka m bụ n’ihe gbasara amamihe.

Ejiri m mmụọ m niile sobe ya, wee site n’ịwụcha onwe m nweta ya. Ebe ọ bụ na m tinyere obi m niile na ya site na mbido, ọ gaghị agbakụlata m azụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 19:8, 9, 10, 11.

Azịza: Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ; ọ na-enye obi añụrị

1. Iwu nke Onyenweanyị zuru oke

Ọ na-enye mkpụrụobi ndụ ọhụrụ

Atụmatụ Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasịobi

Ọ na-enye ndị umeala amamihe.

Azịza: Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ; ọ na-enye obi añụrị

2. Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ;

ọ na-enye obi añụrị;

Iwu nke Onyenweanyị pụtara ihe;

ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ.

Azịza: Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ; ọ na-enye obi añụrị

3. Ịtụ egwu Onyenweanyị bụ ihe dị mma:

ọ na-adị ebeebe;

Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu;

Ha niile kwụkwa ọtọ.

Azịza: Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ; ọ na-enye obi añụrị

4. Ọ dị mkpa karịa ọlaedo:

ọ bụladị ọlaedo kacha mma;

Okwu ya dị ụtọ karịa mmanụ añụ,

Ọ bụladị mmanụ añụ a zara aza.

Azịza: Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ; ọ na-enye obi añụrị

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Ka obi m nọgide n’iwu gị, kụziere m ụzọ gị, O Onyenweanyị.

Alleluia.

OZIỌMA – 11:27-33

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu na ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ na Jerusalem, ka Jesu na agagharị n’ime ụlọnsọ, ndị isi nchụaja, ndị odeakwụkwọ, na ndị okenye bịakwutere ya, sị ya, “Kedụ ụdị ike i ji eme ihe ndị a, ọ bụ onye nyere gị ike ime ha?”

Jesu sịrị ha, “Aga m ajụ ụnụ otu ajụjụ, ọ bụrụ na ụnụ zaa m ya, aga m agwa ụnụ ike m ji eme ihe ndị a. Ike Jọn nwere ime Mmirichukwu, o si n’eluigwe ka o sitere n’aka mmadụ?

Zaanụ m ya! Ha bidoro na-agbagha n’etiti onwe ha sị, “Ọ bụrụ na anyị sị na o sitere n’eluigwe ọ ga-ajụ anyị sị: “Gịnịkwanụ mere ụnụ ejighị kwenye n’ozi ya?

Ma ọ bụrụ na anyị asị na o si n’aka mmadụ…” Ha na-atụ egwu ndị mmadụ n’ihina mmadụ niile kwetara na Jọn bụ onye amụma n’eziokwu.

Ya mere ha zara Jesu sị, “Anyị amaghị”. Jesu wee gwa ha sị, “Mụ onwe m agaghịkwa agwa ụnụ ụdị ike m ji arụ ihe ndị a.

Igbo Mass Readings for May 30 2027, Ụka Ahụ na Ọbara Kristi – Afọ nke Abụọ

Igbo Mass Readings for May 29 2027, Satọde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.