Igbo Mass Readings for May 30 2026, Satọde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 30 2026, Satọde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:17, 20-25
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jude
Ndị m hụrụ n’anya chetanụ ihe niile ụmụazụ Onyenweanyị Jesu Kristi kwuru na ọ ga-emezu. Ma ndị m hụrụ n’anya jisienụ ike wulie onwe ụnụ elu dịka ụlọ n’ime okwukwe ahụ kacha nsọ ụnụ nwere.
Na ekpekwanụ ekpere n’ike Mmụọ Nsọ. Nọdụnụ n’ịhụnaanya nke Chineke. Na-echenụ ụbọchị Onyenweanyị Jesu Kristi ga-enye anyị ndụ ebighịebi site n’ebere ya.
Meenụ ka ndị ka nwere obi abụọ ghọtazie nke a ọfụma. Zọpụtanụ ụfọdụ site n’igbochi ha ịdanye n’ọkụ. Ụfọdụ ndịọzọ bụ ndị ụnụ ga-eji egwu gosi ebere ma kpọọnụ ihe ọjọọ asị ọ bụladị uwe mmadụ yi n’ahụ nke ihe ọjọọ merụrụ.
Ka otito dịrị onye ahụ pụrụ igbochiri ụnụ ọdịda na onye ahụ nwekwara ike iji añụrị chee ụnụ n’enweghị ntụpọ ọbụla n’ihu ebube ya dị nsọ. Ka otito dịrị Chineke onye nzọpụta anyị.
Ka ịbụ eze niile na ọchịchị niile na ike niile dịrị ya otu ọ dị n’izizi na kịtaa na oge niile na ụwa ebeebe site na Jesu Kristi Onyenweanyị. Amen.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 63:1,2-3,4-5
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ Chineke m
1. Chineke, ị bụ Chineke m a na m achọ gị,
akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka gị,
anụahụ m na-achọ gị,
dịka ala kpọrọ nkụ, na-enweghị mmiri,
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ Chineke m
2. Ọ na-agụ m agụụ ikiri gị n’ebensọ gị
na ịhụ ike na otito gị.
Ịhụnaanya gị ka mma karịa ndụ n’onwe ya,
ọnụ m ga-ekwupụta otito gị.
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ Chineke m
3. Aga m eto gị na ndụ m niile
n’aha gị aga m achili aka m elu;
Mkpụrụobi m ga-enwe nnukwu oriri,
Egwu ọñụ ga-adị n’egbugbere ọnụ m,
otito ga-adị n’ọnụ m.
Azịza: Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka gị, Dinwenụ Chineke m
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Ka obi m nọgide n’iwu gị, kụziere m ụzọ gị, O Onyenweanyị.
Alleluia.
OZIỌMA – 11:27-33
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu na ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ na Jerusalem, ka Jesu na agagharị n’ime ụlọnsọ, ndị isi nchụaja, ndị odeakwụkwọ, na ndị okenye bịakwutere ya, sị ya, “Kedụ ụdị ike i ji eme ihe ndị a, ọ bụ onye nyere gị ike ime ha?”
Jesu sịrị ha, “Aga m ajụ ụnụ otu ajụjụ, ọ bụrụ na ụnụ zaa m ya, aga m agwa ụnụ ike m ji eme ihe ndị a. Ike Jọn nwere ime Mmirichukwu, o si n’eluigwe ka o sitere n’aka mmadụ?
Zaanụ m ya! Ha bidoro na-agbagha n’etiti onwe ha sị, “Ọ bụrụ na anyị sị na o sitere n’eluigwe ọ ga-ajụ anyị sị: “Gịnịkwanụ mere ụnụ ejighị kwenye n’ozi ya?
Ma ọ bụrụ na anyị asị na o si n’aka mmadụ…” Ha na-atụ egwu ndị mmadụ n’ihina mmadụ niile kwetara na Jọn bụ onye amụma n’eziokwu.
Ya mere ha zara Jesu sị, “Anyị amaghị”. Jesu wee gwa ha sị, “Mụ onwe m agaghịkwa agwa ụnụ ụdị ike m ji arụ ihe ndị a.
Igbo Mass Readings for May 31 2026, Ụka Atọ N’Otu Dị Ngọzi – Afọ nke Mbụ
Igbo Mass Readings for May 30 2026, Satọde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.