Igbo Mass Readings for May 10 2025, Satọde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 10 2025, Satọde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:31-42
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
N’ihi ya nzukọ Kristi niile dị n’ala Judia, Grik na Sameria nwere udo. Ọ kwọdosiriike na-abawanye site n’ịtụ egwu nke Onyenweanyị na agbamume nke Mmụọ Nsọ.
Ka Pita na-agagharị na-agbasa oziọma, ọ gakwara hụ ndị otu Kristi bi n’obodo a na-akpọ Lida. N’ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, a na-akpọ Eniyas nke nọrọla n’akwa ọrịa afọ asatọ.
Pita sịrị ya, “Eniyas! Jesu Kristi agwọọla gị! Bilie, dozie akwa gị.” Ozigbo ahụ o bilie. Ndị niile bi n’obodo Lida na Sherọn hụrụ ọrụ ebube nke a, chegharịa, bịakwute Onyenweanyị.
Na Jopa, o nwere otu nwaanyị na-eso ụzọ Jesu aha ya bụ Tabita, nke pụtara Dọkas n’asụsụ Grik. Ndụ nwaanyị a jupụtara n’ezi ọrụ, na ọrụ ebere n’ebe ụmụogbenye nọ.
N’oge ahụ, nwaanyị a dara ọrịa, nwụọ. Ka ha sachara ya ahụ, ha nyibere ya n’ụlọ elu. Ebe Lida dị Jopa nso, ndị na-eso ụzọ Jesu bi na Jopa nụrụ na Pita nọ na Lida, ziga ụmụnwoke ka ha rịọ Pita sị, “Biko, were ọsọ bịakwute anyị.”
Pita biliri soro ha gaba. Oge ọ bịaruru Jopa, ha duuru ya rịgoro n’ụlọ elu ahụ. Ụmụnwaanyị ajadu gbara ya gburugburu na-ebe akwa, na-egosi Pita uwe ndị Dọkas dụụrụ ha ka ọ dị ndụ. Pita chụpụrụ ha niile n’ezi, gbuo ikpere n’ala kpee ekpere.
Ọ tụgharịrị chee ozu ahụ ihu sị, “Tabita, bilie!” Nwaanyị ahụ meghere anya ya. O kuliri mgbe ọ hụrụ Pita. Pita nyeere ya aka ka ọ kwụrụ ọtọ, kpọkwaa ndị ahụ kwere na Kristi na ndị ajadu nwaanyị ahụ, kpọnye ha ya na ndụ. Akụkọ maka nke a gbasara n’ala Jopa niile. Ọtụtụ ndị mmadụ kweere n’Onyenweanyị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 116:12-13, 14-15,16-17.
Azịza: Kedụ ihe m ga-enye Onyenweanyị? Maka iheọma niile o meere m.
1. Kedụ ihe m ga-enye Onyenweanyị?
Maka iheọma niile o meere m.
Aga ebuli iko nzọpụta,
wee kpọkuo aha nke Onyenweanyị.
Azịza: Kedụ ihe m ga-enye Onyenweanyị? Maka iheọma niile o meere m.
2. Aga m emejupụta nkwa m kwere Onyenweanyị,
n’ihu ndị nke ya niile.
Ọnwụ onye eziomume dị oke ọnụ,
n’ebe Onyenweanyị nọ.
Azịza: Kedụ ihe m ga-enye Onyenweanyị? Maka iheọma niile o meere m.
3. Onyenweanyị abụ m nwodibo gị,
nwa nwaanyị ezigbo omume,
ị tọpụla m n’agbụ.
Aga m achụrụ gị aja ekele,
wee kpọkuo aha nke Onyenweanyị.
Azịza: Kedụ ihe m ga-enye Onyenweanyị? Maka iheọma niile o meere m.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Jesu asị Tọmọs, “I kwerela n’ihi na ị hụrụ m? Ngọzi ga-adịrị ndị na-ahụghị ma kwere.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 6: 60-69.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Mgbe ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a ha sịrị, “Okwu nke a tara akpụ, onye ga-anabata ya?” Jesu matara n’ime onwe ya, na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu banyere okwu a.
Ọ sịrị ha, “Okwu a, ọ na-ewute ụnụ? Olee otu ọ ga-adịzi ma a sị na ụnụ ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-arịgo n’ebe ọ nọrịị na mbụ? Ọ bụ mmụọ na-enye ndụ, anụahụ enweghị ihe ọ bụ.
Okwu ndị m gwara ụnụ bụ mmụọ bụrụkwa ndụ. Ma o nwere ụfọdụ n’ime ụnụ ndị na-ekwenyeghị.” N’ihina Jesu matara site na mbụ ndị na-ekwenyeghị n’ime ha, na onye ọ bụ nke ga-arara ya nye.
Ọ gwakwara ha sị, “Nke a mere m ji gwa ụnụ na ọ dịghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m, ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike ime nke a.” Mgbe nke a mechara ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, hapụzie ị na-esogharị ya.
Jesu jụrụ ụmụazụ iri na abụọ sị, “Ụnụ chọkwuru iso ha pụọ?” Saịmọn Pita zara ya sị, “Onyenweanyị, onye ka anyị ga-ejekwu? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebeebe. Anyị onwe anyị ekwerela, bịa, matakwa na ị bụ Onye Nsọ ahụ nke Chineke.”
Igbo Mass Readings for May 11 2025, Ụka Nke Anọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ
Igbo Mass Readings for May 10 2025, Satọde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.