Igbo Mass Readings for January 31 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 31 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:1-7, 10-17
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ abụọ nke Samuel
Yahweh ziri Natan onye amụma ka o jekwuru Devid. Natan bịakwutere ya sị, “ụmuụnwoke abụọ bi n’otu obodo, otu n’ime ha bụ ọgaranya, nke ọzọ bụ ogbenye. Ọgaranya ahụ nwere igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi nke ukwu. Ma ogbenye ahụ nwere naanị otu nwatụrụ ọ zụtara n’ahịa.
Ọ zụrụ ya nke ọma, mee ka o tolite n’ụlọ ya, ya na ụmụaka ya. Ọ na-enye ya nri ya, werekwa iko ya na enye ya mmiri; ọ na ekukwa ya n’obi ya. O weere ya dịka ada ya mwaanyị. Otu ụbọchị, otu onye ije bịara n’ụlọ ọgaranya ahụ.
Ma ọgaranya ahụ achọghị igbu otu n’ime igwe anụụlọ ya, iji siere onye ọbịa ya ihe oriri, Kama, o weere otu atụrụ nke ogbenye ahụ, siere onye bịara n’ụlọ ya ihe oriri.”
Iwe Devid dị ọkụ n’ebe ọgaranya ahụ nọ, o wee gwa Natan, “Eji m aha Chineke dị ndụ na-añụrụ gị iyi, na onye mere ihe dị otu a kwesịrị ọnwụ. Onye mmere omume ọjọọ dị otu a, na emeghị ebere ga-akwụghachị onye ogbenye ahụ nwaatụrụ ahụ mmaji anọ.”
Natan wee sị Devid gị onwe giị bụ nwoke ahụ! Ya mere bido ugbu a gaba mmagha agaghị esi ezinụụlọ gị pụọ, ebe i leliri m, kpọrọ nwunywe Uria onye Het, ka ọ bụrụ nwunye gị.
Lee, aga m esi n’ụlọ gị kpalitere gị ajọ ihe, aga m akpọnye onye agbataobi gị ndị nwunye gị, ha na ya ehie na mbara ezi n’ihu gị. I mere nke gị na nzuzo. Ma aga m eme ka nke a mee n’ihe ka Izrel niile hụzuo ya!” Devid wee sị Natan, “Emehiela m megide Yahweh.”
Natan asị ya, “Yahweh n’onwe ya agbagharala gị mmehie gị. Ị gaghị anwụkwa. Ma, n’ihina i leliri Yahweh n’ihe a i meree, nwa ahụ a mụụrụ gị ga-anwụ.” Natan wee laghachi n’ụlọ ya. Yahweh mere ka nwata ahụ nwunye Uria mụụrụ Devid daa n’ahụ ọnwụnwụ.
Devid rịọsiri Chineke ike ka nwata ahụ dịrị. O buru ọnụ, banye n’ime ụlọ ya tọgbọrọ n’ala nkịtị ogologo abalị niile. Ndị okenye bi n’obi ya, bịakwutere ya, na-arịọ ya ka o bilie, ma o kweghị. O soghịkwa ha rie nri.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 51:12-13, 14-15, 16-17.
Azịza: Chineke, kenye obi dị ọcha n’ime m
1. Chineke kenye obi dị ọcha n’ime m,
tinye n’ime m mmụọ ọhụrụ na nke siri ike,
Achụpụkwala m n’ihu gị,
Anapụkwala m mmụọ nsọ gị.
Azịza: Chineke, kenye obi dị ọcha n’ime m
2. Nyeghachikwa m añụrị nke nzọpụta gị.
were ezi mmụọ gị chedo m.
Aga m akụziri ndị ajọ mmadụ ụzọ gị
Ka ndị njọ lọghachita azụ n’ebe ị nọ.
Azịza: Chineke, kenye obi dị ọcha n’ime m
3. Si n’ọnwụ zọpụta m Chineke onye nzọpụta m,
Ka ire m wee kwupụta ịkwụba aka ọtọ gị
Onyenweanyị meghee egbugbere ọnụ m
Ka ọnụ m wee kwupụta otito gị.
Azịza: Chineke, kenye obi dị ọcha n’ime m
MBEKU – Ps. 111:8
Alleluia, Alleluia:
Onyenweanyị, Iwu gị dị ntụkwasịobi n’ụzọ niile. Nke a mere ka ọdị ebeebe ebeebe.
Alleluia
OZIỌMA – 4:35-41
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
N’ụbọchị ahụ, n’oge mgbede, Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafeenụ n’akụkụ nke ọzọ.” Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ, gakwuru Jesu n’ụgbọ, kwọrọ ya gafee.
Ụgbọmmiri ndị ọzọ nọkwa n’ọnụ mmiri ahụ. Oke ifufe febere, ebili mmiri malitekwara wụbawa n’ime ụgbọ nke mere ka mmiri jupụta n’ime ya. Ma Jesu n’onwe ya nọ n’isi ụgbọ na-arahụ ụra n’elu ihe nhibe isi, ha kpotere ya wee sị ya, “Onyenkụzi, ọ bụ na o metụghị gị n’obi na anyị na-ala n’iyi?”
Jesu wee bilie, bigbọọ oke ifufe ahụ, sịkwa osimiri ahụ, “kwụsị! Dere jụụ!” Oke ifufe ahụ kwụsịrị, oke ndajụ wee dị. Ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere ụnụ ji atụ egwu?
Ọ bụ ụnụ enweghị okwukwe?” Oke egwu jidere mmadụ niile, ha wee jụkọrịtaba onwe ha sị, “Onye bụ onye a, nke na ifufe na oke osimiri na erubere ya isi?”
Igbo Mass Readings for February 1 2026, Ụka nke Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ
Igbo Mass Readings for January 31 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.