Igbo Mass Readings for September 5 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 5 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:6 (9)-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt
N’ihina ana m eche na Chineke egosila anyị bụ ndịozi dịka ndị kpe azụ, na ndị a mara ikpe ọnwụ. O meela ka anyị bụrụ ihe nkiri n’ebe ndị mmadụ na ndị mmụọọma nọ.
Anyị mere onwe anyị ndị nzuzu n’ihi Kristi, ma ụnụ bụ ndị maara ihe n’ime Kristi. Anyị adịghị ike, ma ụnụ dị ike! Ndị mmadụ na-eme anyị akaja, ma ha na-asọpụrụ ụnụ!
Ọ bụladị ugbu a, anyị nọ n’akpịrị ịkpọnkụ; anyị gba ọtọ na-akpagharị, n’enweghị ebe obibi. Anyị ji aka anyị abụọ arụ ọrụ ịchọta ihe anyị ga eri.
Mgbe a na-ekwutọ anyị, anyị na-agọzi, mgbe a na-esogbu anyị, anyị na-enwe ndidi. Mgbe a na-akparị anyị, anyị na-azaghachi n’okwu dị nrọ.
A na-emeso anyị dịka ndị ụwa jụrụ ajụ na dịka ndị merụrụ ala, n’etiti ụmụ mmadụ, ọ bụladị ruo taa. Anaghị m ede ihe ndị a iji menye ụnụ ihere, kama ọ bụ ka m dụọ ụnụ ọdụ dịka ụmụ m, m hụrụ n’anya.
Ọ bụ eziokwu na ụnụ nwere ọtụtụ ndị nche, ma ụnụ enweghị karịa otu nna, n’ihina ọ bụ m bụ nna ụnụ n’ime Jesu Kristi, site n’oziọma ahụ m wetaara ụnụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 145:17-18, 19-20, 21
Azịza: Onyenweanyị nọ ndị niile na-akpọku ya nso.
1. Onyenweanyị dị mma n’ụzọ ya niile,
ọrụ aka ya niile na-egosi ịhụnaanya
Onyenweanyị nọ ndị niile na-akpọku ya nso,
ndị ji ezi obi na-akpọku ya.
Azịza: Onyenweanyị nọ ndị niile na-akpọku ya nso.
2. Ọ na-emejupụta mkpa ndị niile na-atụrụ ya egwu,
ọ na-anụkwa mkpu akwa ha ma zọpụtakwa ha.
Onyenweanyị na-echedo ndị niile hụrụ ya n’anya,
Ọ na-ekpochapụ ndị ajọomume.
Azịza: Onyenweanyị nọ ndị niile na-akpọku ya nso.
3. Ọnụ m ga-ekwupụta otito nke Onyenweanyị
Ka ihe niile o kere gọzie aha nsọ ya ebeebe ebeebe.
Azịza: Onyenweanyị nọ ndị niile na-akpọku ya nso.
MBEKU – Ps. 119:34
Alleluia, Alleluia:
Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị, wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gị.
Alleluia
OZIỌMA – 6:1-5
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
N’otu ụbọchị Sabat, ka Jesu si n’ubi ọka na-agafe, ndị na-eso ụzọ ya ghọọrọ ogbe ọka ụfọdụ, nworo mkpụrụ ha na-ata.
Ma ụfọdụ ndị Farisii jụrụ ha sị, “Gịnị mere ụnụ ji eme ihe megide iwu n’ụbọchị izuike?” Jesu zara ha sị, “Ọ bụ na ụnụ agụbeghị ihe Devid mere oge agụụ gụrụ ya, ya na ndị ya na ha so.
Otu o siri banye n’ụlọ Chineke, were ogbe achịcha a na-eche n’ihu Chineke rie, nyetụkwa ndị ya na ha so, ọ bụ ezie na o zighị ezi n’iwu ka onye ọbụla rie ya ma ọ bụghị onye ụkọchukwu.” Jesu wee sị ha, “Nwa nke mmadụ bụ onye nwe ụbọchị Sabat.”
Igbo Mass Readings for September 5 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.