Igbo Mass Readings for September 19 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 19 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:35-37, 42-49
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt
Otu onye nwere ike ịjụ sị, “Olee otu e si eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie? Olee ụdị ahụ ha ga-eji apụta.” Gị onye enweghị uche!
Mkpụrụ ị kụrụ n’ubi adịghị epupụta ome ọhụrụ ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nwụọ. Ihe ị kụrụ abụghị ahụ nke ga-apụta, kama naanị mkpụrụ nkịtị, eleghị anya mkpụrụ ọka, mọbụ mkpụrụ ọzọ, ma ahụ o ji epupụta abụghị ahụ ahụ i ji kụọ ya.
Otu a ka ọ dị n’ebe mbilite n’ọnwụ ndị nwụrụ anwụ dị. A na-eli ahụ onye nwụrụ anwụ dịka ihe pụrụ ire ure, ma a na-eme ka o bilite n’ọnwụ n’ereghị ure.
A na-eli ahụ onye nwụrụ anwụ dịka ihe enweghị ugwu. Ma a na-eme ka o si n’ọnwụ bilie n’ebube. A na-eli onye nwụrụ anwụ n’adịghị ike, ma a na-eme ka o si n’ọnwụ bilie n’isiike.
A na-eli onye nwụrụ anwụ dịka ahụ nkịtị, ma a na-eme ka o jiri ahụ nke mmụọ kulite. Ọ bụrụ na e nwere ahụ nkịtị, e nwekwara ahụ nke mmụọ.
E dere ya n’Akwụkwọ Nsọ sị, “Mmadụ mbụ, bụ Adam, ghọrọ mkpụrụobi dị ndụ. Adam nke ikpeazụ wee ghọọ Mmụọ nke na-enye ndụ.
Ma ihe bu ụzọ bụ ahụ nkịtị, ọ bụghị ahụ nke mmụọ, nke bịara n’ikpeazụ. Otu ọ dị, Adam nke mbụ si n’ala pụta, e jikwara aja kpụọ ya, ma Adam nke abụọ si n’eluigwe bịa.
Otu mmadụ mbụ ahụ e jiri aja kpụọ dị, ka ndị niile si n’aja pụta dịkwa. Otu onye nke eluigwe ahụ dị, ka ndị niile bụ ụmụ eluigwe dịkwa.
Dịka anyị yikwasara onyinyo nke mmadụ e jiri aja kpụọ, otu ahụkwa ka anyị ga esi yikwasa onyinyo nke mmadụ nke eluigwe.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 56:10-12, 13 M
Azịza: Aga m aga ije n’ihu nke Onyenweanyị n’ihe ndị dị ndụ.
1. Amaara m nke a: Chineke nọnyere m.
Na Chineke onye m na-eto okwu ya,
Na Chineke ka m tụkwasara obi m anaghị m atụ egwu ọbụla,
Gịnị ka mmadụ nwere ike ime m?
Azịza: Aga m aga ije n’ihu nke Onyenweanyị n’ihe ndị dị ndụ.
2. Aga m emejupụta nkwa niile m kwere gị.
Chineke aga m enye gị onyinye ekele m,
n’ihina ị zọpụtala m n’ọnwụ ị zọpụtakwala ụkwụ m n’ọdịda
ka m wee gaa ije n’ihu nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ.
Azịza: Aga m aga ije n’ihu nke Onyenweanyị n’ihe ndị dị ndụ.
MBEKU – 1 Jọn 2:5
Alleluia, Alleluia:
Onye ọbụla nke na-edobe okwu nke Jesu Kristi, n’ezie ịhụnaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.
Alleluia
OZIỌMA – 8:4-15
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe igwe mmadụ siri n’obodo dị icheiche bịakwute Jesu O jiri ụkabụilu gwa ha okwu sị, “Ọgha mkpụrụ pụrụ ka ọ ghaa mkpụrụ n’ubi ya, mgbe ọ na-agha ụfọdụ dara n’okporo ụzọ, ndị mmadụ wee zọọ ha ụkwụ, ụmụnnụnụ atụtụrịa ha.
Ụfọdụ dara n’ala okwute, ma mgbe ha na-eto ha kpọnwụrụ, n’ihina ha enwetaghị mmiri. Ụfọdụ dara n’etiti ogwu, ogwu esoro ha pụọ, kpagbuo ha.
Ma ụfọdụ dara n’ala dị mma, topụta, mịa mkpụrụ narị mmaji.” Ka o kwuchara nke a, ọ sịrị, “onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ụkabụilu a pụtara, Ọ zara ha sị, “Ọ bụ ụnụ ka e nyere amara ihe omimi nke alaeze Chineke ma a na-agwa ndị ọzọ okwu site n’ụkabụilu, ka o wee bụrụ na ha ga-ahụ ghara ịghọta, na ha ga-anụ ghara ịghọta.”
Ugbu a ihe ụkabụilu ahụ pụtara bụ nke a: mkpụrụ ahụ a ghara bụ okwu Chineke. Mkpụrụ ndị dara n’okporo ụzọ bụ ndị nụrụ okwu ahụ.
Ka e mechara ekwensu bịara wepụ ya n’obi ha, ka ha ghara ikwere ma nwetakwa nzọpụta. Mkpụrụ ndị dara n’ala okwute bụ ndị nụrụ okwu ahụ, were ọñụ nara ya, ma n’ihina okwu ahụ agbaghị mgbọrọgwụ n’ime ha, ha kwenyere nwa oge, ma mgbe ọnwụnwa bịara, ha adapụ.
Mkpụrụ ndị dara n’etiti ogwu, bụ ndị nụrụ okwu Chineke, ma mgbe ha na-aga n’ụzọ, nchegbu na akụ na ihe ụtọ nke ndụ a kpagburu ha; ha amịtaghị mkpụrụ.
Ma maka mkpụrụ dara n’ala dị mma, ha bụ ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesị ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
Igbo Mass Readings for September 19 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.