Igbo Mass Readings for October 11 2025, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 11 2025, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:12-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Joel
Ka mba niile jikere ọgụ bịa na ndagwurugwu nke Jehoshafat. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m ga-anọ kpee mba niile gbara Zayọn gburugburu ikpe. Bido webe ihe ubi, n’ihina ọ kaala.
Gaanụ ka ụnụ paa mmanya, n’ihina ihe e ji apacha mmanya ejula; ite mmanya ejufeela, n’ihina obi ọjọọ ha dị ukwu. Igwe mmadụ kwuru igwe mmadụ nọ na ndagwurugwu mkpebi ikpe; n’ihina ụbọchị nke Yahweh abịala nso na ndagwurugwu ahụ.
Anyanwụ na ọnwa agbaala ọchịchịrị, kpakpando akwụsịla mmuke ha. Yahweh nọ na Zayọn na-ebigbo, a na-anụ olu ya na Jerusalem; eluigwe na ala na-ama jijiji, mana Chineke bụụrụ ndị nke ya ihe nchedo, Ọ bụụrụ Izrel ebe mgbaba siri ike.
Mgbe ahụ ka mụ ga-amara na abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, onye bi na Zayọn ugwu m dị nsọ. N’oge ahuụ Jerusalem ga-abụzi ebe dị nsọ nke na o nweghị ndị mba ọzọ ga-atụ ya aka n’ihu ọzọ.
N’ụbọchị ahụ, nnukwu ugwu niile ga-edepụta mmanya ụtọ. Mmiri ara ehi ga na-ehupụta n’obere ugwu ndịọzọ. Mmiri ga-eju n’iyi niile dị na Juda. Mmiri ga-esikwa n’ụlọ Yahweh gbapụta were wụjuo ndagwurugwu Shitiim.
Ijipt ga atọgbọrọ chakoo, ebe Edọm ga-abụkwa ọzara, n’ihi ihe ọjọọ e mere ndị Juda. Ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha n’obodo ha. Mana ndị mmadụ ga-ebigide na Juda na Jerusalem ndụdụgandụ niile.
Aga m abọ ọbọ maka ọbara ha, agaghị m ahapụ onye ọbụla ikpe mara n’ihina Yahweh bi na Zayọn.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 97: 1-2, 5-6, 11-12
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
1. Onyenweanyị bụ eze! Ka ụwa ñụrịba;
Ñụrịanụ ala niile mmiri gbara gburugburu.
Urukpu na ọchịchịrị gbara ya okirikiri;
O jiri eziomume na ikpe nkwụmọtọ
were tọọ ntọala ocheeze ya.
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
2. Ugwu niile gbazere dịka mmanụ n’ihu Onyenweanyị
n’ihu Onyenweanyị nke ụwa niile.
Eluigwe na-ekwupụta eziomume ya
mba niile na-ahụkwa otito ya.
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
3. Ihe na-achakwasị ndị na-akwụba aka ha ọtọ,
añụrị na-adịrị ndị obi ha dị ọcha.
Ñụrịanụ n’Onyenweanyị, ụnụ bụ ndị eziomume,
tookwanụ aha ya dị nsọ.
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
MBEKU – Luk 8:15
Alleluịa, Alleluịa:
Ha nwere isi ọma bụ ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesi ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 11:27-28
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Mgbe Jesu na-ekwu okwu ndị a, otu nwaanyị si n’etiti igwe mmadụ ahụ welie olu sị, “Ngọzi na-adịrị afọ nke mụrụ gị na ara Ị ñụrụ!”
Ma Jesu zara sị, “Ngọzi na-adịrị ha karịa, bụ ndị nụrụ okwu Chineke dobekwa ya!”
Igbo Mass Readings for October 11 2025, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.