Igbo Mass Readings for October 16 2027, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 16 2027, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4, 13, 16-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Nkwa Chineke kwere Abraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site n’idebe iwu, kama ọ bụ site n’okwukwe. N’ihi nke a, Chineke mere ka nkwa ahụ dabere n’okwukwe, ka o wee bụrụ ihe mmadụ ga-enweta site n’amara, ka o rutechaa agbụrụ Abraham niile;
Ọ bụghị sọ ndị na-edebe iwu kama ndị niile nwere ụdị okwukwe Abraham, onye bụ nna anyị n’okwukwe. Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba, n’ihu Chineke, Abraham bụ nna anyị n’okwukwe, onye o tinyere okwukwe ya na ya, onye na-enye ndị nwụrụ anwụ ndụ, na-emekwa ka ihe adịghị adị dịrị.
Abraham nọgidere n’okwukwe na olile anya, ọ bụladị mgbe olileanya adịghị, o wee site na nke a ghọọ Nna nke ọtụtụ mba. N’ihina otu a ka a gwara ya n’Akwụkwọ Nsọ sị, ‘Ụmụ si n’agbụrụ gị ga-adị ọtụtụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 105: 6-7, 8-9, 42-43
Azịza: Onyenweanyị na-akpachapụrụ Ọgbụgbandụ ya anya ebeebe.
1. Ụnụ ụmụ Abraham bụ nwodibo ya,
ụmụ Jekọb bụ onye nke ọ họọrọ!
Ọ bụ ya bụ Onyenweanyị na Chineke anyị,
Ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile.
Azịza: Onyenweanyị na-akpachapụrụ Ọgbụgbandụ ya anya ebeebe.
2. Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe,
Iwu nke o tiiri puku agbụrụ gara aga,
Ọgbụgbandụ ya na Abraham gbara
na iyi nke ọ ñụụrụ Aịzik.
Azịza: Onyenweanyị na-akpachapụrụ Ọgbụgbandụ ya anya ebeebe.
3. N’ihina o chetara nkwa ya dị nsọ,
nke o nyere nwodibo ya bụ Abraham,
o ji ọñụ duru ndị nke ya aga,
o ji ukwe edu ndị ọ họọrọ.
Azịza: Onyenweanyị na-akpachapụrụ Ọgbụgbandụ ya anya ebeebe.
MBEKU – 1 Jọn 2:5
Alleluịa, Alleluịa:
Onye ọbụla nke na-edobe okwu ya, n’ezi, ịhụnaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.
Alleluịa.
OZIỌMA – 12:8-12
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Agwa m ụnụ, onye ọbụla na-ekwupụta m n’ihu ndị mmadụ ka Nwa nke mmadụ ahụ ga-ekwupụta n’ihu ndị mmụọọma nke Chineke, ma onye ahụ nke na-agọnahụ m n’ihu ndị mmadụ, ka a ga-agọnahụ n’ihu ndị mmụọọma nke Chineke.
Onye ọbụla na-ekwu okwu megide Nwa nke mmadụ ahụ, a ga-agbaghara ya, ma a gaghị agbaghara onye ọbụla nke na-ekwutọ Mmụọ Nsọ.”
Mgbe ha kpụpụtara ụnụ n’ihu ụlọnzukọ ndị ọchịchị na ndịisi, ụnụ echegbula onwe ụnụ otu ụnụ ga-esi, mọbụ ihe ụnụ ga-aza, mọbụ ihe ụnụ ga-ekwu; n’ihina Mmụọ Nsọ ga-akụziri ụnụ n’oge ahụ ihe ụnụ kwesịrị ikwu.”
Igbo Mass Readings for October 16 2027, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.