Igbo Mass Readings for October 17 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 17 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:15-23

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Efesọs.

N’ihi nke a, mgbe m nụrụ banyere okwukwe ụnụ nwere n’ime Dinwenụ anyị Jesu Kristi na ịhụnaanya ụnụ nwere n’ebe ndị nsọ niile nọ, ewepụghị m aka n’ikele Chineke banyere ụnụ.

Ana m echeta ụnụ n’ekpere. Ka Chineke nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, Nna nke otito, nye ụnụ mmụọ nke amamiihe na nke mkpughe iji mata ya.

Ana m arịọkwa ka Chineke meghee anya nke obi ụnụ, ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ, na ihe bụ akụ nke nketa ahụ dị ebube n’etiti ndị nsọ ya; na ihe bụ ịdị ukwu na-enweghị atụ nke ike ya n’ime anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ọrụ nke ike aka ya siri dị.

Nke a bụ nke o mejupụtara n’ime Kristi mgbe o siri n’ọnwụ kulie ya, mekwaa ka ọ nọrọ n’aka nri ya n’alaeze eluigwe, ka ọ nọdụ n’ebe dị elu karịchaa ọchịchị niile na ike niile na ịbụ isi niile, bịa dịkwa elu karịa aha ọbụla a marala, ọ bụghị naanị n’ọgbọ nke a, kama ma ọgbọ nke ga-abịanụ.

Chineke edobekwala ihe niile n’okpuru ụkwụ ya, mekwaa ya isi ihe niile maka nzukọ ya, nke bụ ahụ ya, na uju nke onye ahụ na-emezu ihe niile jupụtara ihe niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 8:1-2, 3-4, 5-6.

Azịza: I mere nwa gị nnaukwu ihe niile e kere eke.

1. Onyenweanyị  Chineke anyị,

lee ka aha gị siri dị elu n’ụwa niile,

Ị buligo ebube gị elu karịa eluigwe.

Ụmụaka na ndị e ku n’aka na-ekwe ukwe ebube gị

Ị na-akwụsi ike n’ebe ndịiro gị nọ.

Azịza: I mere nwa gị nnaukwu ihe niile e kere eke.

2. M lee anya n’eluigwe i ji aka gị mee

ya na ọnwa na kpakpando i kere;

gịnị ka mmadụ bụ i ji eche echiche banyere ya

nwa nke mmadụ na ị na-eleta ya anya?

Azịza: I mere nwa gị nnaukwu ihe niile e kere eke.

3. N’agbanyeghị i mere ka o jiri obere ihe karịa ndị mmụọọma nta,

I jikwa ugwu na nsọpụrụ chọọ ya mma dịka okpueze

I mere ya nnaukwu ihe niile e kere eke

were ihe niile dobe n’okpuru ya.

Azịza: I mere nwa gị nnaukwu ihe niile e kere eke.

MBEKU – 1 Jọn 2:5

Alleluịa, Alleluịa:

Onye ọbụla nke na-edobe okwu ya, n’ezi, ịhụnaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.

Alleluịa.

OZIỌMA – 12:8-12

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Agwa m ụnụ, onye ọbụla na-ekwupụta m n’ihu ndị mmadụ ka Nwa nke mmadụ ahụ ga-ekwupụta n’ihu ndị mmụọọma nke Chineke, ma onye ahụ nke na-agọnahụ m n’ihu ndị mmadụ, ka a ga-agọnahụ n’ihu ndị mmụọọma nke Chineke.

Onye ọbụla na-ekwu okwu megide Nwa nke mmadụ ahụ, a ga-agbaghara ya, ma a gaghị agbaghara onye ọbụla nke na-ekwutọ Mmụọ Nsọ.”

Mgbe ha kpụpụtara ụnụ n’ihu ụlọnzukọ ndị ọchịchị na ndịisi, ụnụ echegbula onwe ụnụ otu ụnụ ga-esi, mọbụ ihe ụnụ ga-aza, mọbụ ihe ụnụ ga-ekwu; n’ihina Mmụọ Nsọ ga-akụziri ụnụ n’oge ahụ ihe ụnụ kwesịrị ikwu.”

Igbo Mass Readings for October 18 2026, Ụka nke Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ

Igbo Mass Readings for October 17 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.