Igbo Mass Readings for October 3 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 3 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 42:1-3, 5-6, 12-16
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ nke Job
Job zara Yahweh sị: “Amara m na ị pụrụ ime ihe niile, na o nweghịkwa nzube gị ọ bụla nke ihe ọ bụla pụrụ igbochi.
Ọ bụ m bụ onye iberibe nke tụrụ okwu gị n’aja? N’ezie ekwuola m okwu banyere ihe ndị mụ amaghị, ndị nke karịrị m nghọta.
Anụla m banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya m hụ gị; n’ihi ya, ekwughasịala m ihe m kwuburu, ma wụkwasa onwe m aja na ntụ iji gosi nchegharị m.”
Yahweh gozikwara ụbọchị ndụ Job ndị fọdụrụ karịa otu ọ dị na mbido; nke mere na o nwere atụrụ dị puku iri na anọ, kamel dị puku isii, ehi dị puku abụọ na otu puku nne ịnyịnyaibu.
Ọ mụtakwara ụmụnwoke asaa na ụmụnwaanyị atọ. Aha ọ gụrụ nke ada bụ Jemaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerenhapuk.
N’obodo ahụ niile, o nweghị ụmụnwaanyị mara mm aka ụmụ Job; nna ha nyere ha ihe nketa n’etiti ụmụnna ha ndị nwoke.
Ka nke a gasịrị, Job biri otu narị afọ na iri anọ wee hụ ụmụ ya na ụmụụmụ ya ruo n’agbụrụ nke anọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119:66, 71, 75, 91, 125, 130
Azịza: Onyenweanyị mee ka ihu gị chakwasị m.
1. Kuziere m ikpe ziri ezina amamiihe
maka na m kwere n’iwu gị.
Azịza: Onyenweanyị mee ka ihu gị chakwasị m.
2. Ọ dị mma na atara m ahụhụ
Ka m wee nwee ike ịmata ụzọ gị.
Azịza: Onyenweanyị mee ka ihu gị chakwasị m.
3.Amaara m na ikpe gị kwụ ọtọ O Onyenweanyị
na ị tara m ahụhụ n’ihi ịkwụdosiike gị.
Azịza: Onyenweanyị mee ka ihu gị chakwasị m.
4.Iwu gị na-achị ihe niile ị kere eke
ebe ihe niile na-efe gị.
Azịza: Onyenweanyị mee ka ihu gị chakwasị m.
5.Abụ m nwodibo gị, nye m nghọta
Ka m wee nwee ike mara nkuzi gị.
Azịza: Onyenweanyị mee ka ihu gị chakwasị m.
6.Okwu gị na-enye ihe
ọ na-enye ndị umeala nghọta.
Azịza: Onyenweanyị mee ka ihu gị chakwasị m.
MBEKU – Matt 11:25
Alleluia, Alleluia:
Ana m ekele gị nna Dinwenụ nke eligwe na ụwa, n’ihina i kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke alaeze.
Alleluia
OZIỌMA – 10:17-24
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ndịozi iri asaa ahụ jiri ọñụ lọta sị, “Onyenweanyị ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi mgbe anyị nyere ha iwu n’aha gị!” O wee sị ha, “Ahụrụ m Ekwensu ka o siri n’eluigwe daa dịka amụma.
Lee, enyela m ụnụ ike ịzọkwasa agwọ na akpị ụkwụ na imegide ike onye iro ahụ, o nweghịkwa ihe ga-emerụ ụnụ ahụ. N’agbanyeghị nke a, ụnụ añụrịla na ndị mmụọ ọjọọ na-ehubere ụnụ isi, kama nweenụ ọñụ na e deela aha ụnụ n’eluigwe.
N’otu oge ahụ, obi tọrọ Jesu ụtọ site na Mmụọ Nsọ, o wee sị, “Ekelee m gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina I zobere ihe ndị a n’ebe ndị amamihe na oke mmụta nọ, ma kpugheere ha ụmụntakịrị.
Ee Nna, otu a ka o si masị uche gị dị nsọ. Nna m enyefeela m ihe niile n’aka. Ọ dịghịkwa onye ọbụla maara onye Nwa ahụ bụ ma ọ bụghị Nna, mọbụ onye Nna ahụ bụ ma ọ bụghị Nwa ahụ, na onye ọbụla nke Nwa ahụ chọrọ ikpughere ya.”
Jesu tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, “Ngọzi dịịrị anya hụrụ ihe ụnụ hụrụ! Ana m agwa ụnụ na ọtụtụ ndị amụma na ndịeze mgbe ochie chọsiri ike ịhụ ihe ụnụ na-ahụ, ma ha ahụghị ha, na ịnụ ihe ụnụ na-anụ ma ha anụghị ha.”
Igbo Mass Readings for October 3 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.