Igbo Mass Readings for August 30 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 30 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:9-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl Degaara Ndị Tesalonịka
Banyere ịhụnaanya nwanne na nwanne, ọ dịghịkwa mkpa onye ọbụla idere ụnụ akwụkwọozi, n’ihina Chineke akụzierela ụnụ otu ụnụ ga-esi na-ahụrịta onwe ụnụ n’anya.
N’eziokwu, ụnụ na-ahụ ụmụnna anyị niile ndị bi na Masedonia n’anya ma anyị na-arịọ ụnụ ụmụnna m ka ụnụ hụ ha n’anya karịa. Nweenụ agụụ ibi ndụ nwayọọ na-arụkwanụ ọrụ dịịrị ụnụ.
Jirikwanụ aka ụnụ na-arụ ọrụ dịka anyị siri gwa ụnụ; nke a ga-eme ka ụnụ nweta nsọpụrụ ọ bụladị nke ndị ekweghị ekwe, gharakwa ịdabere n’onye ọbụla.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98:1, 7-8, 9
Azịza: Onyenweanyị na-abịa, ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ụwa ikpe.
1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube,
Aka nri ya na aka ya dị nsọ
eweterela ya mmeri.
Azịza: Onyenweanyị na-abịa, ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ụwa ikpe.
2. Tienụ mkpu, osimiri na ihe niile dị n’ime ya
ụwa na ndị niile bi n’ime ya!
Ka iyi niile kụọ aka ha
Ka ugwu niile kwee ukwe añụrị.
Azịza: Onyenweanyị na-abịa, ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ụwa ikpe.
3. N’ihu Onyenweanyị n’ihina ọ na-abịa
ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe;
ọ ga-eji ikpe ziri ezi na ikpe nkwụmọtọ
were kpee ụwa na ndị mmadụ ikpe.
Azịza: Onyenweanyị na-abịa, ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ụwa ikpe.
MBEKU – Ọrụ Ndiozi 16:14
Alleluia, Alleluia:
Dinwenụ meghee obi anyị k’anyị gee ntị n’okwu nke nwa gị.
Alleluia
OZIỌMA – 25:14-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya ụkabụilu a sị: “otu nwoke chọrọ ịga njem wee kpọọ ụmụodibo ya nyefee ha akụnụụba ya n’aka. O nyekwara onye ọbụla n’ime ha dịka ike ya ha.
Otu ka o nyere talent ise, nke ọzọ talent abụọ, nke ọzọkwa otu talent. O wee pụọ ije. Ozigbo, onye ahụ natara talent ise jiri ha zụọ ahịa, wee rite uru talent ise ọzọ.
Otu aka ahụ kwa, odibo ahụ natara talent abụọ ritekwara uru talent abụọ ọzọ. Ma odibo ahụ natara otu talent gwuru ala, lie ego nna ya ukwu.
Mgbe ogologo oge gachara, nnaukwu ụmụodibo ahụ laghachiri, ya na ha wee pịazie akụ ya. Odibo ahụ natara talent ise bịakwutere nna ya ukwu wetakwuo talent ise ọzọ, sị Nnamukwu, ‘I nyere m talent ise; lee eritere m talent ise ọzọkwa n’uru.’
Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, gị ezigbo odibo kwesịrị ntụkwasịobi. N’ihina I gosịrị ntụkwasịobi n’obere ihe, aga m eme gị onye isi ọtụtụ ihe. Banye n’ọñụ nke nna gị ukwu.
Onye nke natara talent abụọ bịakwutekwara nna ya ukwu sị ya, ‘Nnamukwu, i nyere m talent abụọ, lee eritela m abụọ ọzọ n’uru.’
Nna ya ukwu sịrị ya, ‘i mere nke ọma gị ezigbo odibo kwesịrị ntụkwasịobi. N’ihina I gosịrị ntụkwasịobi n’ihe dị nta, aga m eme gị onyeisi ọtụtụ ihe. Banye n’ọñụ nke nna gị ukwu!’
Ma mgbe nke ahụ natara otu talent bịara, ọ sịrị nna ya ukwu, ‘Nnamukwu, amaara m gị dịka onye siri ike mmete, onye na-ewe ihe ubi n’ebe ị na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa ihe ubi n’ebe ị na-asụchaghị.
N’ihi nke a, egwu tụrụ m, m wee gaa liere gị ego talent gị n’ala. Lee ihe gị werekwa.’ Nna ya ukwu zara ya sị: ‘Gị ajọ odibo, onye umengwụ!
Ị matara na m na-ewere ihe ubi n’ebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa ihe ubi n’ebe m na-asụchaghị. Ihe ị garala eme bụ itinyere m ego m n’ụlọakụ.
Ọ bụrụ na m lọta m nara ego m narakwa ọmụrụnwa ya. Ya mere naranụ ya otu talent ahụ, nyekwuo onye ahụ ji talent iri. N’ihina onye ọbụla nwerenụ ka a ga-enyekwuazi ka o nwee n’uju.
Ma onye enweghị nke o nwere, a ga-anara ya ọ bụladị nke nta o nwere. Tụpụnụ odibo a na-abaghị uru n’ezi ebe ọchịchịrị gbara, ebe ibe akwa na ịta ikikere eze ga-adị.
Igbo Mass Readings for August 30 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.