Igbo Mass Readings for August 29 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 29 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:26-31

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Ụmụnna m, werenụ onwe ụnụ dịka ihe ọmụma atụ; tupu Chineke akpọọ ụnụ, ọ dịghị ọtụtụ ụnụ maara ihe dịka ụwa si ahụ ya, ọ bụghị ọtụtụ n’ime ụnụ bụ ndị ukwu mọbụ ndị a ma ama n’obodo.

Kama Chineke họọrọ ihe ụmụ ụwa kpọrọ ihe nzuzu ka o wee mee ka ihe ndị a dị ike. Ọ bụkwa ihe ụmụ ụwa na-eleda anya, ihe ha kpọrọ ihe efu na ihe abụghị ihe, ka Chineke họọrọ iji butuo ihe dị elu ala.

Ka mmadụ ọbụla ghara ịnya isi n’ihu Chineke. Ma Chineke bụ isiiyi nke amamihe anyị, nke ezi omume anyị na nke ido anyị nsọ na onye mgbapụta anyị.

Ya mere dịka Akwụkwọ Nsọ si kwu, “Onye na-anya isi ya jiri ihe Onyenweanyị mere nyaa isi.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 33:12-13, 18-19, 20-21

Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.

1. Añụrị na Ngọzi na-adịrị mba Chineke bụ Chukwu ha,

ndị nke ọ họọrọ dịka ndị nke ya

Chineke si n’eluigwe eledata anya

Ọ na-ahụ ụmụ mmadụ niile.

Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.

2. Ma lee ka Onyenweanyị si eleta ndị niile na-atụrụ ya egwu anya.

ndị niile tụkwasịrị obi ha n’ịhụnaanya ya,

ka O wee zọpụta mkpụrụobi ha n’ọnwụ,

ma chekwaba ha oge ụnwụ.

Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.

3. Mkpụrụobi anyị na-eche Onyenweanyị;

Ya bụ onye enyemaka anyị na onye ogbugbo anyị

Mkpụrụobi anyị na-añụrị n’Onyenweanyị,

n’ihina anyị tụkwasịrịobi n’aha ya dị nsọ.

Azịza: Añụrị na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.

MBEKU – Ọrụ Ndiozi 16:14

Alleluia, Alleluia:

Dinwenụ meghee obi anyị k’anyị gee ntị n’okwu nke nwa gị.

Alleluia

OZIỌMA – 25:14-30

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya ụkabụilu a sị: “otu nwoke chọrọ ịga njem wee kpọọ ụmụodibo ya nyefee ha akụnụụba ya n’aka. O nyekwara onye ọbụla n’ime ha dịka ike ya ha.

Otu ka o nyere talent ise, nke ọzọ talent abụọ, nke ọzọkwa otu talent. O wee pụọ ije. Ozigbo, onye ahụ natara talent ise jiri ha zụọ ahịa, wee rite uru talent ise ọzọ.

Otu aka ahụ kwa, odibo ahụ natara talent abụọ ritekwara uru talent abụọ ọzọ. Ma odibo ahụ natara otu talent gwuru ala, lie ego nna ya ukwu.

Mgbe ogologo oge gachara, nnaukwu ụmụodibo ahụ laghachiri, ya na ha wee pịazie akụ ya. Odibo ahụ natara talent ise bịakwutere nna ya ukwu wetakwuo talent ise ọzọ, sị Nnamukwu, ‘I nyere m talent ise; lee eritere m talent ise ọzọkwa n’uru.’

Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, gị ezigbo odibo kwesịrị ntụkwasịobi. N’ihina I gosịrị ntụkwasịobi n’obere ihe, aga m eme gị onye isi ọtụtụ ihe. Banye n’ọñụ nke nna gị ukwu.

Onye nke natara talent abụọ bịakwutekwara nna ya ukwu sị ya, ‘Nnamukwu, i nyere m talent abụọ, lee eritela m abụọ ọzọ n’uru.’

Nna ya ukwu sịrị ya, ‘i mere nke ọma gị ezigbo odibo kwesịrị ntụkwasịobi. N’ihina I gosịrị ntụkwasịobi n’ihe dị nta, aga m eme gị onyeisi ọtụtụ ihe. Banye n’ọñụ nke nna gị ukwu!’

Ma mgbe nke ahụ natara otu talent bịara, ọ sịrị nna ya ukwu, ‘Nnamukwu, amaara m gị dịka onye siri ike mmete, onye na-ewe ihe ubi n’ebe ị na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa ihe ubi n’ebe ị na-asụchaghị.

N’ihi nke a, egwu tụrụ m, m wee gaa liere gị ego talent gị n’ala. Lee ihe gị werekwa.’ Nna ya ukwu zara ya sị: ‘Gị ajọ odibo, onye umengwụ!

Ị matara na m na-ewere ihe ubi n’ebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa ihe ubi n’ebe m na-asụchaghị. Ihe ị garala eme bụ itinyere m ego m n’ụlọakụ.

Ọ bụrụ na m lọta m nara ego m narakwa ọmụrụnwa ya. Ya mere naranụ ya otu talent ahụ, nyekwuo onye ahụ ji talent iri.

N’ihina onye ọbụla nwerenụ ka a ga-enyekwuazi ka o nwee n’uju. Ma onye enweghị nke o nwere, a ga-anara ya ọ bụladị nke nta o nwere. Tụpụnụ odibo a na-abaghị uru n’ezi ebe ọchịchịrị gbara, ebe ibe akwa na ịta ikikere eze ga-adị.

Igbo Mass Readings for August 30 2026, Ụka nke Iri Abụọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ

Igbo Mass Readings for August 29 2026, Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.