Igbo Mass Readings for August 23 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 23 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-3, 8-11; 4:13-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Rut

Ugbu a, Naomi nwere otu nwanna di ya, onye si n’agbụrụ di ya bụ Elimelek. Aha nwoke ahụ bụ Boaz. Nwoke ahụ bụkwa ọgaranya, na onye a ma ama n’obodo.

O ruo otu ụbọchị, Rut wee sị Naomi, “Ka m jee n’ubi chikọta ọka ndị na-ewe ihe ubi hapụrụ.” Enwere m okwukwe na m jee, aga m ahụ onye obiọma ga-ekwe ka m rụọ ọrụ n’ubi ya.

Naomi wee sị ya, “Gaba nwa m nwaanyị. Ya mere, Rut jere n’ubi na-achịkọrọ ọka ndị na-ewe ihe ubi na-ahapụ. Ọ dabaara ya na ọ bụ n’ubi Boaz nwanna Elimelek ka ọ banyere.

Boaz wee sị Rut, “Gee m ntị nwa m.” Ejekwala n’ubi ọzọ ịchịkọta ọka. Soro ụmụnwaanyị ndị a nọ ebe a gbuwe ọka. Na-ele anya n’ubi ọbụla ha na-egbu ọka, sorokwa ha n’azụ.

Agwala m ụmụokorobịa ndị a ha enyekwala gị nsogbu. Ọ bụrụ na mmiri gụọ gị, gaa n’ite mmiri ndị a ụmụokorobịa a gbajuru kuru mmiri ñụọ.”

Rut hulatara ihu, kpọọrọ ya isi ala sị, “Gịnị mere mkpa m ji metụta gị n’obi otu a? Gịnị mere I ji gosi m obiọma dị otu a ebe mụ onwe m bụ onye ọbịa?”

Boaz zara ya sị, “Anụla m ihe niile I meere nne di gị kamgbe di gị nwụrụ. Ama m na ị hapụrụ nna gị na nne gị, hapụkwa obodo a mụrụ gị bịa binyere ndị ị na-amabụghị na mbụ.”

Ya mere, Boaz kpọrọ Rut laa n’ụlọ, ya abụrụ nwunye ya. O wee bakwuru ya. Osebụrụwa e mee ka ọ tụrụ ime mụọ nwa nwoke. Ụmụnwaanyị asị Naomi, “Otito dịrị Osebụrụwa!

N’ihina taa, o nyela gị nwa nwoke ga-ele gị nka site n’aka nwunye nwa gị. Chineke mekwaa ka aha nwata ahụ dị ukwu n’Izrel!

Nwunye nwa gị hụrụ gị n’anya meere gị ihe karịa ka ụmụnwoke asaa ga-emere nne ha. Ugbu a ọ mụtarala gị nwanwa onye ga-eweghachi ndụ ọhụrụ n’ime gị na onye ga-ele gị nka.

Naomi ekuru nwa ahụ were ya dịka nwa ya. Ụmụmwaanyị ibe ya agụọ nwa ahụ Obed, na-akọrọ ndị mmadụ sị, “A mụọlara Naomi nwa nwoke! Obed wee bụrụ nna Jese onye bụ nna Devid.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 128:1-2, 3, 4, 5

Azịza: Lee etu Dinwenụ si a gọzi ndị na-atụrụ ya egwu.

1. Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu

Na-eso ụzọ ya.

Ihe aka gị kụtara ka ị ga-eri,

añụrị na ọganịihu ga-abụ nke gị.

Azịza: Lee etu Dinwenụ si a gọzi ndị na-atụrụ ya egwu.

2. Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn,

na-amị mkpụrụ n’ime ụlọ gị

ụmụ gị ga-adị ka osisi oliv,

gbaa oche nri gị gburugburu.

Lee, otu ahụ ka a ga-esi gọzie onye ahụ

nke na-atụrụ Chineke egwu.

Azịza: Lee etu Dinwenụ si a gọzi ndị na-atụrụ ya egwu.

3. Lee, otu ahụ ka aga-esi gọzie onye ahụ

Nke na-atụrụ Chineke egwu

Ka Onyenweanyị si na Zayọn gọzie gị

ụbọchị ndụ gị niile.

Azịza: Lee etu Dinwenụ si a gọzi ndị na-atụrụ ya egwu.

MBEKU – Jọn 15:15

Alleluia, Alleluia:

Ana m akpọzi ụnụ ndị enyi m, Dinwenụ na-ekwu, n’ihina agwala m ụnụ ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m.

Alleluia

OZIỌMA – 23:1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara igwe mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ n’ọkwa Mosis. Ya bụ, na-emenụ ma na-edebekwanụ ihe niile ha na-agwa ụnụ.

Kama ụnụ emekwala omume ka ha, n’ihina ha na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya n’omume. Ha na-eke ibu siri ike obubu bo ndị mmadụ n’ubu, ma ha onwe ha agaghị emetụ ya ọ bụladị otu mkpịsịaka.

Ha na-arụ ọrụ ọma ha niile naanị ka ndị mmadụ wee hụ ha. Ha na-eme ka akwa e dere iwu ndị dị mkpa nke ha na-amado n’ihu na n’aka dị obosara na-emekwa ka ọnụ uwe ha buo ibu.

Ọ na-amasị ha ịnọ n’oche dị elu n’oriri, ịnọ n’ihu oche n’ụlọ nzukọ, ị nara ekele n’ọma ahịa nakwa ka ndị mmadụ na-akpọ ha ndị nkuzi.

Ụnụ ekwela ka a na-akpọ ụnụ ndị nkuzi, n’ihina ụnụ nwere naanị otu onye nkuzi. Ụnụ niile bụkwa ụmụnne. Ụnụ akpọla onye ọbụla nna ụnụ n’elu ụwa a, n’ihina ụnụ nwere otu nna nke bi n’eluigwe.

Ụnụ ekwekwala ka a na-akpọ ụnụ nnaukwu n’ihina ụnụ nwere naanị otu nnaukwu ya bụ Kristi. Ya bụ onye ọbụla kachasị n’etiti ụnụ ga-abụ odibo ụnụ.

Onye ọbụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-ebuda ya ala, ma onye ọbụla nke wedara onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.

Igbo Mass Readings for August 24 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Atọ

Igbo Mass Readings for August 23 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.