Igbo Mass Readings for November 14 2026, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 14 2026, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:5-8

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jọn nke Atọ

Onye m hụrụ n’anya, ọ bụ ihe kwesịrị ntụkwasịobi ka ị na-eme, mgbe ị na-agbara ụmụnna anyị odibo, ọkachakwa ndị ọbịa; ndị gbara akaebe maka ịhụnanya gị n’ihu nzukọ.

Ọ ga-adị mma ka I dupụ ha, otu o kwesịrị ije ozi nke Chineke. Ha apụọla nje m maka Chineke, n’anaghịkwa ndị na-amaghị Chineke ihe onyinye ọbụla.

Anyị kwesịrị ịkwado ndị dị otu a, ka anyị nwee ike iso bụrụ ndị ọrụ n’ime eziokwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 112:1-2, 5-6, 8, 9.

Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.

1. Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.

Onye ji ọñụ na-edebe iwu ya!

Ụmụ onye dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa,

agbụrụ onye ezigbo omume ga-enweta ngọzi.

Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.

2. Ezinụụlọ ya ga-enweta akụnụụba,

eziomume ya agaghị enwe mgbanwe.

N’ihina onye ezigbo omume

ga-achawapụta dịka ihe n’etiti ọchịchịịrị,

ọ dị ebere, ịhụnaanya na-akwụba aka ọtọ.

Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.zịza.

3. Ya bụ ezigbo mmadụ anaghị ana ọmụrụnwa ma o binye ego,

ọ bụ onye eziokwu n’ihe niile ọ na-eme.

Ebe eziomume chedoro ya, ọ na-enwe ịkwụdosike,

ọ na-ahapụ ncheta ga-adị ebeebe n’azụ ya.

Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.

MBEKU – Ps. 25: 4, 5.

Alleluịa, Alleluịa:

Kụziere m ụzọ gị, Onyenweanyị, dube m n’ụzọ eziokwu gị.

Alleluịa.

OZIỌMA – 18:1-8

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ha ụkabụilu iji kuziere ha na ọ dị mkpa ka ha nọgide n’ekpere mgbe niile, ghara ịda mba.

Ọ gwara ha sị: “N’otu obodo, e nwere otu onye ọkaikpe nke na-anaghị atụrụ Chineke egwu, nke ọ na-asọpụrụ mmadụ ibe ya.  

E nwekwara otu nwaanyị isimkpe bikwa n’obodo ahụ, onye na-abịakwute ọkaikpe a kwa mgbe kwa mgbe, na-arịọ ya sị, ‘kpepụta m n’aka onye iro m.’

Na mbụ onye ọkaikpe a achọghị ịnụ arịrịọ nwaanyị a. Ma o mesịrị tụgharịa obi sị, ‘Ọ bụ eziokwu na adịghị m atụ egwu Chineke, adịghị m asọpụrụ mmadụ, ma n’ihi nsogbu nwaanyị isimkpe a na-enye m, aga m ekpepụta ya.

Ọ bụrụ na m emeghị otu a, ọ ga-abịagide na-esogbu m, agaghị m ezuru ya ike.’” Onyenweanyị kwukwara sị, “Nụrụnụ ihe onye ọkaikpe a, nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi kwuru.

Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta onye nke ya, onye na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-egbu oge tupu ọ zọpụta ha?

Agwa m ụnụ, Ọ ga-ekpepụta ha ọsọọsọ. Ka o sila dị, mgbe nwa nke mmadụ ga-abịa Ọ ga-enwetekwa ndị nwere okwukwe n’elu ụwa?”

Igbo Mass Readings for November 15 2026, Ụka nke Iri Atọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ

Igbo Mass Readings for November 14 2026, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.