Igbo Mass Readings for November 21 2026, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 21 2026, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:4-12
Ihe Ọgụguụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe
Ndị akaebe ahụ bu osisi oliv abụọ na ihe ndọba oriọna abụọ, ndị na eguzo n’ihu onyenwe ụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, ọkụ ga-esi ha n’ọnụ pụta regbuo ndịiro ha.
Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ahụ a ga-egbu ya n’ụzọ dị otu a. Ha nwere ike imechi mbara igwe ka mmiri ghara izo, ụbọchị niile ha na-ebu amụma ha. Ha nwekwara ike ịgbanwo mmiri niile ka ha ghọọ ọbara.
E nyekwara ha ike iwere ihe mmekpaahụ dị icheiche mekpaa ụwa ahụ, mgbe ọbụla ha chọrọ. Mgbe ha buchara amuụma ha otu anụ ọhịa ga-esi n’olulu ahụ na enweghị njedebe rịpụta, buso ha agha.
Ọ ga-emeri ha, gbuokwa ha. Ozu ha ga-atọgbọ n’ama nke obodo ukwu ahụ, nke a na-akpọ na mmụọ Sodọm na ljipt, ebe a kpọgburu onyenwe ha n’obe.
Ha ga-atọgbọ mkpụrụ ụbọchị atọ na ọkara; ọtụtụ ndị mmadụ ga-esi n’agbụrụ, ebo, mba na asụsụ niile bịa na-ekiri ozu ha, ma jụkwa ịdọnye ha n’ili. Ndị bi n’ụwa ga-añụrị ọñụ maka ọnwụ ndị amụma ahụ.
Ha ga-akpọ oriri, na-ezigara ndị enyi ha ihe onyinye dị icheiche n’ihina ndị amụma ahụ mesiri ha ike. Mgbe ụbọchị atọ na ọkara ahụ gachara, Chineke zighachiiri ha umendụ nke banyere n’ime ha, ha wee bilie ọtọ; oke egwu jidere ndị niile hụrụ ha.
Ndị amụma abụọ ahụ were nụ oke olu si n’eluigwe daa na-asị ha, “Rịgotanụ n’ebe a!” Ha siri n’igwe ojii, rịgoro n’eluigwe n’ihu ndịiro ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 144:1,2,9-10
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa nkume m.
1. Ngọzi dịrị Osebụrụwa nkume m
onye na-azụ aka m maka ịlụ ọgụ,
mkpịsị aka m maka ibu agha.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa nkume m.
2. Ọ bụ ya bụ ịhụnaanya m na onye nkwado m,
ụlọ mgbaba m na onye nzọpụta m
ọ bụ na ya ka m na-ezo onwe m
ekpeke m ọ na-eme ka mba niile rubere m isi.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa nkume m.
3. Onyenweanyị aga m ekwere gị ukwe ọhụrụ,
Aga m eji ụbọ akwara kweere gị ukwe
Ọ bụ gị na-enye ndịeze mmeri
Nakwa azọpụta Devid nwodibo gị.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa nkume m.
MBEKU – 1 Pita 1:25
Alleluia, Alleluia:
Okwu nke Onyenweanyị ga-adịgide ruo mgbe ebighịebi. Okwu a bụkwa oziọma ahụ nke a gbasaara ụnụ.
Alleluia
OZIỌMA – 20:27-40
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ụfọdụ ndị Sadusii, ndị ekweghị na mbilite n’ọnwụ dị bịakwutere Jesu. Ha jụrụ ya otu ajụjụ sị: “Onye nkuzi, Mosis deere anyị iwu, na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ hapụ nwunye ya na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-ekuchi nwunye ya ahụ were mụta ụmụ n’aha nwanne ya ahụ.
O nwere ụmụnne asaa dịnụ, onye nke mbụ n’ime ha lụrụ nwaanyị, nwụọ n’amụtaghị nwa. Onye nke abụọ, na onye nke atọ lụkwara ya. N’otu aka ahụ, ha asaa lụchakwara ya ma nwụọ n’amụtaghị nwa.
N’ikpeazụ, nwaanyị ahụ n’onwe ya nwụkwara. Na mbilite n’ọnwụ, nwunye onyezi ka ọ ga-abụ, ebe ụmụnne asaa ndị a lụchara ya?” Jesu zara ha sị, “Ụmụ nke agbụrụ a na-alụ nwaanyị, na-enwekwa di; ma ndị a họtara, tozuru etozu inweta ọnọdụ n’ụwa ọzọ, anaghị alụ di na nwunye na mbilite n’ọnwụ.
N’ihina ha agaghị anwụkwa ọzọ, maka ha na ndị mmụọozi aharala. Ebe ha bụ ụmụ nke mbilite n’ọnwụ, ha bụkwa ụmụ nke Chineke. Ọ bụladị Mosis n’onwe ya kuzikwara na mbilite n’ọnwụ dị.
N’ime Akwụkwọ Nsọ, ebe e dere maka ọhịa na-agba ọkụ, Mosis kpọrọ Onyenweanyị, Chineke nke Abraham na Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.
Nke a na-egosị na ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, ndị na-agaghị ebili ọzọ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ, n’ihina mmadụ niile na-adị ndụ ha n’ebe Chineke nọ.” Ụfọdụ n’ime ndị odeakwụkwọ zara ya sị, “Onye nkuzi, Ị zara nke ọma.” Ha anwakwaghị anwa ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
Igbo Mass Readings for November 21 2026, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.