Igbo Mass Readings for November 7 2026, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 7 2026, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:10-19

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Filipi.

Ana m añụrị nnukwu ọñụ n’ime Dinwenụ n’ihina ụnụ mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Ụnụ bụ m n’obi n’eziokwu ma ụnụ enweghị ohere maka ya.

Ọ bụghị na m na-enye mkpesa maka mkpa m; n’ihina amụtala m ka e si enwe afọ ojuju n’ọnọdụ ọbụla m hụrụ onwe m.

Amụtala m otu e si adị ndụ mgbe a nọ n’ụkọ, na otu e si adị ndụ mgbe a nọ n’ụba. Amụtala m ihe nzuzo dị n’ọnọdụ ọbụla.

N’ihi nke a, ebe ọbụla na n’oge ọbụla, a nọ m n’afọ ojuju, ma anọ m na nrijuafọ mọbụ n’agụụ, n’ụba mọbụ n’ụkọ.  

Enwere m ike ime ihe niile n’ime onye ahụ na-enye m ike. Ma ụnụ mere nke ọma n’aka ụnụ nyeere m na nsogbu m niile.

Ụnụ onwe ụnụ ndị Filipi maara na, na mbido nke oziọma, mgbe m hapụrụ Masedonia, na o nweghị nzukọ Kristi ọzọ nyeere m aka n’inye mọbụ ịnabata onyinye ma e wepụ ụnụ.

Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonika, ụnụ ziteere m enyemaka ugboro ugboro. Ọ bụghịkwa na m chọrọ onyinye ụnụ, kama ana m achọ ka mkpụrụ ụnụ ga-amịta baa ụba, bụrụ otito dịịrị ụnụ.

Anatala m onyinye karịa. Anatala m onyinye n’uju ugbu a m natara onyinye ụnụ zitere site n’aka Epafroditus, bụ onyinye isiọma, aja nke a na-anara nke ọma, nke na-atọkwa Chineke ụtọ.

Chineke ga-esi n’akụnụụba ya nke dị n’ime Jesu Kristi nye ụnụ ihe niile na-akpa ụnụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 112:1-2, 5-6, 8, 9.

Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.

1. Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.

Onye ji ọñụ na-edeba iwu ya!

Ụmụ onye dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa,

Agbụrụ onye ezigbo omume ga-enweta ngọzi.

Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.

2. Ya bụ ezigbo mmadụ anaghị ana ọmụrụnwa ma o binye ego

ọ bụ onye eziokwu n’ihe niile ọ na-eme.

Ebe eziomume chedoro ya ọ na-enwe ịkwụdosike

ọ na-ahapụ ncheta ga-adị ebeebe n’azụ ya.

Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.

3. O ji ntachị obi emeri egwu ya

Ọ naghị atụfu oge inyere ndị ogbenye aka

eziomume ya anaghị agbanwe agbanwe

ndị dị otu a na-enweta nsọpụrụ mgbe niile.

Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.

MBEKU – Heb. 4:12

Alleluịa, Alleluịa:

Okwu Chineke dị ndụ dị ike; Ọ bụkwa ihe nwere ike inyocha echiche na izu niile nke obi.

Alleluịa.

OZIỌMA – 16:9-15

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nke a mere, ana m agwa ụnụ, werenụ akụ mmehie ụwa nke a metara onwe ụnụ enyi, ka ọ ga-abụ, mgbe ihe siiri ụnụ ike, ha ga-anabata ụnụ n’ụlọ obibi ha ebeebe.

Onye ọbụla kwesịrị ntụkwasịobi n’ihe dịkarịchara nta ga-ekwesịkwa ntụkwasịobi ba nnukwu ihe. Onye na-ekwesịghị ntụkwasịobi n’ihe dịkarịchara nta agaghịkwa ekwesị ntụkwasịobi na nnukwu ihe.

Ọ bụrụ na ụnụ ekwesịghị ntụkwasịobi n’akụ mmehie nke ụwa, onye ga-ejikwa ntụkwasịobi nye ụnụ nke bụ ezi akụ?

Ọ bụrụkwa na ụnụ ekwesịghị ntụkwasịobi n’ihe onyeọzọ, onye ga-enye ụnụ ihe nke bụ nke ụnụ?

Otu odibo agaghị efeli nnaukwu abụọ n’otu oge, n’ihina o nwere ike ịkpọ otu asị ma hụ nke ọzọ n’anya, mọbụ ọ ga-eji umeala fee otu, ma na-eleli nke ọzọ; ya bụ ụnụ apụghị ife Chineke na akụ.”

Mgbe ndị Farisii ndị hụrụ ego n’anya nụrụ ụkabụilu ndị a, ha chịrị Jesu ọchị. Jesu gwara ha sị, “Ụnụ bụ ndị ahụ ji aka ha akpọ onwe ha ndị ezigbo omume n’ihu ndị mmadụ.

Mana Chineke maara obi ụnụ, n’ihina ihe bụ oke ihe n’ihu ndị mmadụ bụ arụ n’ihu Chineke.”

Igbo Mass Readings for November 8 2026, Ụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Mbụ

Igbo Mass Readings for November 7 2026, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.