Igbo Mass Readings for October 30 2027, Satọde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 30 2027, Satọde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1-2, 11-12, 25-29
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Ka m jụkwaa ọzọ. Ọ ga-abụ na Chineke ahapụla ndị nke ya? Chineke ekwela! Mụ onwe m bụkwa onye Izrel nwa si n’agbụrụ Abraham na onye si n’ogbe Benjamin pụta.
Chineke ahapụbeghị ndị nke ya, ndị nke ọ maararịị na mbụ. Ka m jụọkwa ọzọ: Ọ ga-abụ na ndị Juu sọrọ ngọngọ daa, agaghị ebilikwa ọzọ? Chineke ekwela!
Kama, nzọpụta sitere na ndahie ha ruo ndị mba ọzọ aka, ka ndị Juu wee nwee anya ụfụ n’ihi ndị mba ọzọ. Ugbu a ọ bụrụ na ndahie nke ndị Juu wetaara ụwa ngọzi nke ukwuu, ọ bụrụ kwa na ọdịda ha dara nwa obere oge wetaara ndị mba ọzọ ezi ihe, ngọzi ụwa niile ga-enwe mgbe ndị Juu niile batazuru ọ ga-adị añaa?
Achọrọ m ka ụnụ mara ihe omimi nke a ụmụnna m. Ọ ga-enyere ụnụ aka ka ụnụ ghara iche n’ime mpako ụnụ na ụnụ maara ihe karịa. lhe omimi ahụ bụ nke a: E mere ka ụfọdụ ndị Izrel nwee mkpọchi obi ka ndị mba ọzọ wee batazuo.
Otu a ka a ga-esi zọpụta ndị Izrel niile. Dịka Akwụkwọ Nsọ siri kwuo, Onye Nzọpụta ahụ ga-esi na Zayọn pụta. Ọ ga-ewepụ obi ọjọọ na amaghị Chineke n’agbụrụ Jekọb.
Nke a ga-abụ ọgbụgbandụ n’etiti mụ na ha, mgbe m kpochapụrụ mmehie ha. Banyere oziọma ahụ, ha bụ ndịiro nke Chineke n’ihi ụnụ, ndị mba ọzọ.
Ma abịa n’ihe gbasara nhọpụta nke Chineke ha bụ ndị Chineke hụrụ n’anya n’ihi ndị nnanna ha. N’ihina enye anarakwa adịghị n’onyinye na n’ọkpụkpọ Chineke.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 94: 12-13, 14-15, 17-18
Azịza: Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya.
1. Onyenweanyị, añụrị ga-adịrị onye Ị na-agbaziri
Onye nke Ị na-akụziri site n’iwu Gị
Ị na-enye ya udo nke obi n’oge nsogbu.
Azịza: Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya.
2. N’ihina Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya,
Ọgaghị echezọ ndị nke ojiri aka ya were họrọ
Ma ikpe nkwụmọtọ ga-abịaghachi n’ụlọ ikpe,
Ndị eziomume ga-agbasokwa ya.
Azịza: Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya.
3. Ọ bụrụ na Onyenweanyị enyeghịrị m aka,
Mgbe m tiri mkpu sị, ‘iyi na-achọ iri m,”
Ozigbo, i gosịrị m ịhụnaanya gị
Site n’inyere m aka.
Azịza: Onyenweanyị agaghị echezọ ndị nke ya.
MBEKU – Matt 11:25
Alleluịa, Alleluịa:
Ana m ekele gị Nna Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihina ị kpugheere ụmụntakịrị ihe omimi nke alaeze.
Alleluịa.
OZIỌMA – 14:1, 7-11
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
N’otu ụbọchị Sabat, ka Jesu gara oriri n’ụlọ otu onye ọchịchị onye so n’otu ndị Farisii, ndị mmadụ nọ na-ele ya anya.
Mgbe Jesu hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri si ahọrọ isi oche, Ọ gwara ha sị, “Mgbe ọbụla onye ọbụla kpọrọ gị oku oriri agbamakwụkwọ, ejila aka gị gaa nọdụ n’isi oche, eleghị anya onye kpọrọ gị oriri kpọkwara onye ọzọ ka gị nwee nsọpụrụ.
Mgbe ahụ onye ahụ ụnụ oriri ga-abịa sị gị, “Biliere nwoke a n’oche’. Oga ahụ, ị ga-eji ihere gaa nọdụ n’oche dịkarịsị ala. Mgbe a kpọrọ gị oriri, gaa nọdụ n’oche dịkarịsị ala, ka ọ ga-abụ mgbe onye kpọrọ gị oriri bịara, o nwere ike sị gị,
‘Enyi m, gbagoo n’isi oche.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwe nsọpụrụ n’ihu ndị niile a kpọrọ gị na ha oriri. N’ihina onye ọbụla buliri onwe ya elu, a ga-ebuda ya ala; ma onye ọbụla budara onwe ya, a ga-ebuli ya.
Igbo Mass Readings for October 30 2027, Satọde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.