Igbo Mass Readings for June 28 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 28 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:1-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Yahweh gosiri Abaraham onwe ya n’Ook nke Mamre ka ọ nọdụrụ ala n’ihu ụzọ ụlọikwu ahụ oge ekpomọkụ kacha adị ukwuu n’ụbọchị. O lelie anya elu, hụ ụmụ nwoke atọ guzo ya nso.
Ngwangwa ọ hụrụ ha, o sitere n’ihu ụlọikwu ya gaa izute ha, ọ kpọọ isi ala. Ọ sịrị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na m nwere ihu ọma n’ebe ị nọ, biko agafela nwodibo gị. Ka m weta ntakịrị mmiri, ka ụnụ nwee ike saa ukwu ụnụ ma zuo ike n’okpuru osisi a.
Ka m weta obere achịcha ka ụnụ rie wee nweta ike tupu ụnụ agawa n’ihu, ebe ụnụ na-agafe n’ihu ụzọ nwodibo ụnụ” Ha zaghachiri ya sị, “Mee otu i si kwuo”.
Abraham mere ngwangwa baa n’ime ụlọikwu ya gwa Sera sị, “Ọsịsọ ị gwakọọ iko ntụ achịcha atọ were ya meta ụfọdụ ogbe achịcha”. Abraham gbara ọsọ gaa n’igwe ehi ya, were otu nwaehi mara mma nye ụmụodibo ya, ndị mere ngwangwa ikwado ya maka oriri.
Ka e mechara, o were mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na nwaehi ahụ nke ọ kwadoro dobe n’ihu ha. Ka ha na-eri nri ya onwe ya guzo ọtọ n’akụkụ ha n’okpuru osisi ahụ. Ha jụrụ ya sị, “Olee nwunye gị, Sera?
Ọ zaa ha sị, “Ọ nọ n’ime ụlọikwu”. Onye ọbịa ya wee sị ya, “Aga m abịaghachikwute gị n’afọ ọzọ, mgbe ahụ ka nwunye gị ga-amụta otu nwoke” Sera nọ na-ege ntị n’ọnụụzọ ikwu ahụ dị n’azụ ya.
Ugbu a, Abraham na Sera emeela okenye, ha agbakwaala ọtụtụ afọ, Sera akwụsịla ịhụ nsọ ya n’ọnwa ọbụla. Nke a mere Sera ji chịa ọchị n’onwe ya, na-eche sị, “Ọ bụ ugbu a, mụ gaferela oge ịtụ ime, dị m mekwaa agadi ka m ga-enwe ihe ụtọ ọzọ!”
Ma Chineke jụrụ Abraham sị, “Gịnị kpatara Sera ji achị ọchị na-asị, ‘Ọ bụ eziokwu na m ga-amụ nwa ugbu a m bụ okenye?’ O nwere ihe rara Yahweh ahụ omume?
Aga m abịaghachikwute gị n’ụdị oge a n’afọ ọzọ, Sera ga-amụ nwa nwoke”. Sera gọrọ agọ na ya achịghị ọchị n’ihina ụjọ na-atụ ya. Ma ya azaghachi ya sị, “N’ezie, ị chịrị ọchị”.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Luk 1:46-47, 48-49, 50, 53, 54-55
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ebere ya.
1. “Mkpụrụobi m na-eto Dinwenụ m,
mmụọ m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m.
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ebere ya.
2. Maka na o leele anya n’umeala odibo nwaanyị ya,
site taata ndụdụgandụ niile ga na-akpọ m onye dị ngọzi;
maka na onye dị ike emeerela m nnukwu ihe,
aha ya dị nsọ.
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ebere ya.
3. Obi ebere ya si na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ
maka ndị na-atụrụ ya egwu.
O nyejuola ndị agụụ na-agụ afọ
hapụ ndị ọgaranya ka ha gbara aka laa.
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ebere ya.
4.O nyerela Izrel nwodibo ya aka,
na ncheta ebere ya,
dịka o si gwa nna anyị Abraham
na mkpụrụ ya ebeebe.
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ebere ya.
MBEKU – 2 Tim 1:10
Alleluia, Alleluịa:
Onyenweanyị Jesu Kristi mebiri ọnwụ, wetara anyị ndụ, bịa mee ka anwụanwụ pụta ihe site n’oziọma ahụ.
Alleluịa
OZIỌMA – 8:5-17
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Ka Jesu batara Kapanaum, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọ ya sị, “Onyenwe m, nwodibo m tọgbọrọ n’ụlọ n’oke ahụ mgbu, akụkụ ahụ ya nwụrụ anwụ”. Jesu asị ya: “Aga m abịa ịgwọ ya”.
Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, etosighị m ka ị bata n’ụlọ m, ma kwuo sọ okwu gị, nwodibo m ga-adị mma.
N’ihina mụ onwe m bụ onye nọ n’okpuru ike ọchịchị, enwekwara m ndịagha nọ n’okpuru m, ana m enye otu onye iwu ‘gaa’ ọ gaa, si onye nke ọzọ ‘bịa’ ọ bịa, m nyekwa nwodibo m iwu ‘mee otu a’ o mee ya”.
Nke a tụrụ Jesu n’anya mgbe ọ nụrụ ya. O wee sị ndị na-eso ya, “N’ezie agwa m ụnụ, ahụbeghị m ụdị okwukwe dị otu a ọbụladị n’Izrel.
Agwa m ụnụ, ọtụtụ ga-esi n’ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ bịa nọnyere Abraham, Aịzik na Jekọb n’oche n’alaeze eluigwe, ebe a ga-atụnye ụmụ nke alaeze na mbara kwụrụ itiri, ebe sọ ibe akwa na ịta ikikere eze ga-adị”
Jesu gwara ọchịagha ahụ sị, “Laba! Ka e meere gị otu okwukwe gị si dị”. Ozigbo ahụ, ahụ dịịrị nwodibo ya mma. Mgbe Jesu batara n’ụlọ Pita, ọ hụrụ ọgọnwaanyị Pita ka o dina n’ahụ ọkụ.
O metụrụ ya aka, ahụ ọkụ wee laa, o bilie lee Jesu ọbịa. Na mgbede ahụ, ndị mmadụ kpọtaara ya ọtụtụ ndị ajọ mmụọ ji, o ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ niile ahụ ma gwọkwaa ndị ọrịa niile.
Nke a bụ iji mejuo ihe onye amụma Aịzaya kwuru sị, “O weghaara nrịanrịa anyị niile burukwa ọrịa anyị niile.”
Igbo Mass Readings for June 29 2025, Nnukwu Emume Pita na Pọl dị Asọ – Ụmụazụ.
Igbo Mass Readings for June 28 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.