Igbo Mass Readings for June 27 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 27 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:2, 10-14, 18-19

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Abụakwaarịrị (Lamentations)

N’emeghị ebere ọbụla, Osebụrụwa emebichaala ebe obibi niile nke Jekọb. Na nnukwu iwe ya ọ kwadachaala ebe niile e wusiri ike nke ada Juda. Omenyela alaeze ya na ndị ọchịchị ya ihere.

Ndị okenye ada Zayọn nọ ọdụ n’ala nkịtị mechie ọnụ. Ha awụọla ntụ n’isi ha yinyekwa akwa iru ụjụ. Ụmụagbọghọ Jerusalem ekpudola ihu n’ala.

Ebekpọchaala m anya n’akwa; Mkpụrụobi m nọ n’ọgbaaghara. Uru agbawaala m obi n’ihi mkpochapụ ndị nke m ya na maka ụmụntakịrị m na maka ndị e ku n’aka na-ada mba n’okporo ụzọ nke obodo.

Ha na ebere nne ha akwa nri na-asị: “kedụ nri, kedụ ihe ọñụñụ?” Ka ha na-ada mba n’okporo ụzọ nke obodo ahụ dịka ndị e merụrụ ahụ, ha na ekubi ume n’aka nne ha.

Ada Jerusalem kedụ ihe m ga-agwa gị? Kedụ ihe m ga-eji tụnyere gị ada Zayọn na-amaghị nwoke? Kedụ ihe m ga-asị na ị dịka ya iji kasie gị obi?

Ọnya dị gị n’ahụ miri emi dịka oke osimiri, onye ga-agwọli gị, onye nwekwara ike ịgwọ gị? Ọhụ niile nke ndị amụma gị hụụrụ gị bụ ụgha na nrafu.

Ha ekpugheghị mmehie gị iji weghachi gị n’ọnọdụ ọma. Ọhụ ha hụụrụ ụnụ bụ asị na okwu nduhie. Ada Zayọn tigara Chineke mkpu akwa. Ka anya mmiri gị na-ezo ka mmiri ehihie na abalị.

Enyela onwe gị ezumike ekwela ka anya mmiri akwa gị kwụsị ịgba. Bilie, bee akwa n’uchichi na mbido nche niile nke abalị.

Mee ka ihe dị gị n’obi sọpụta n’ihu Osebụrụwa dịka mmiri si asọ. Chilierenụ ya aka ụnụ elu maka ndụ ụmụntakịrị ụnụ ndị na-ada n’isi okporo ụzọ niile maka ihi agụụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 74:1-2, 3-5, 6-7, 20-21.

Azịza: Onyenweanyị echezọkwala ndụ ndị nke gị

1. Chineke gịnị mere i ji gbahapụ anyị kpam kpam!

Gịnị mere iwe gị jiri dị ọkụ n’ebe igwe atụrụ ị na-azụ nọ?

Cheta ndị nke gị ndị ị họrọla kamgbe ochie,

Ka ha bụrụ oke nke gị, ndị ị zọpụtara

ka ha bụrụ oke nke gị n’ugwu Zayọn a, ebe ị bịara ibi.

Azịza: Onyenweanyị echezọkwala ndụ ndị nke gị

2. Bịa jegharịa n’ebe ihe ndị a e mebiri emebi dị

onyeiro emebiela ihe niile dị n’ebe gị dị nsọ.

Ha na-aba mba n’ebe ndị nke gị na-enwe ọgbakọ.

Ha weere ọkọlọtọ ha debe n’ọnụụzọ ụlọnsọ gị,

ọkọlọtọ anyị na-ahụbeghị mbụ.

Ha ji anyịke na-egbutusi ihe niile a pịrị apị dị n’ụlọnsọ,

dịka ndị na-egbutusi osiso n’ọhịa.

Azịza: Onyenweanyị echezọkwala ndụ ndị nke gị

3. Ha ji anyịke na nkụpịa na-akụtusi ha

Ha gbara ụlọnsọ gị ọkụ,

merụọkwa ebe obibi nke aha gị.

Azịza: Onyenweanyị echezọkwala ndụ ndị nke gị

4. Kwanyere ọgbụgbandụ gị ugwu,

ọgba niile dị n’ala jupụtara n’ọgbaaghara.

Ekwekwala ka ndị a na-emegbu emegbu laa n’ihere,

Kama mee ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị.

Azịza: Onyenweanyị echezọkwala ndụ ndị nke gị

MBEKU – 2 Tim 1:10

Alleluia, Alleluịa:

Onyenweanyị Jesu Kristi mebiri ọnwụ, wetara anyị ndụ, bịa mee ka anwụanwụ pụta ihe site n’oziọma ahụ.

Alleluịa

OZIỌMA – 8:5-17

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Ka Jesu batara Kapanaum, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọ ya sị, “Onyenwe m, nwodibo m tọgbọrọ n’ụlọ n’oke ahụ mgbu, akụkụ ahụ ya nwụrụ anwụ”. Jesu asị ya: “Aga m abịa ịgwọ ya”.

Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, etosighị m ka ị bata n’ụlọ m, ma kwuo sọ okwu gị, nwodibo m ga-adị mma.

N’ihina mụ onwe m bụ onye nọ n’okpuru ike ọchịchị, enwekwara m ndịagha nọ n’okpuru m, ana m enye otu onye iwu ‘gaa’ ọ gaa, si onye nke ọzọ ‘bịa’ ọ bịa, m nyekwa nwodibo m iwu ‘mee otu a’ o mee ya”.

Nke a tụrụ Jesu n’anya mgbe ọ nụrụ ya. O wee sị ndị na-eso ya, “N’ezie agwa m ụnụ, ahụbeghị m ụdị okwukwe dị otu a ọbụladị n’Izrel.

Agwa m ụnụ, ọtụtụ ga-esi n’ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ bịa nọnyere Abraham, Aịzik na Jekọb n’oche n’alaeze eluigwe, ebe a ga-atụnye ụmụ nke alaeze na mbara kwụrụ itiri, ebe sọ ibe akwa na ịta ikikere eze ga-adị”

Jesu gwara ọchịagha ahụ sị, “Laba! Ka e meere gị otu okwukwe gị si dị”. Ozigbo ahụ, ahụ dịịrị nwodibo ya mma. Mgbe Jesu batara n’ụlọ Pita, ọ hụrụ ọgọnwaanyị Pita ka o dina n’ahụ ọkụ.

O metụrụ ya aka, ahụ ọkụ wee laa, o bilie lee Jesu ọbịa. Na mgbede ahụ, ndị mmadụ kpọtaara ya ọtụtụ ndị ajọ mmụọ ji, o ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ niile ahụ ma gwọkwaa ndị ọrịa niile.

Nke a bụ iji mejuo ihe onye amụma Aịzaya kwuru sị, “O weghaara nrịanrịa anyị niile burukwa ọrịa anyị niile.”

Igbo Mass Readings for June 28 2026, Ụka nke Iri na atọ n’Oge Nkịtị -Afọ nke Atọ

Igbo Mass Readings for June 27 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.