Igbo Mass Readings for August 1 2026, Satọde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 1 2026, Satọde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 26:11-16, 24
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah
Otu ihu ahụ, ndị ụkọchukwu na ndị amụma gwara ndịisi ọchịchị ndị mmadụ niile sị, “Nwoke a kwesịrị amamikpe ọnwụ, maka na o buola amụma megide obodo nke a, dịka ụnụ jirila ntị ụnụ nụ.”
Jeremaya wee gwa ndịisi ọchịchị niile na ndị mmadụ niile sị, Yahweh ziri m ka m buo amụma megide ụlọ nke a, ya na obodo nke a dịka ụnụ siri nụ n’okwu m.
Ya mere, ugbu a, mezienụ ndụ ụnụ na ụzọ ụnụ ma geekwanụ ntị n’okwu nke Yahweh bụ Chineke ụnụ, ka Yahweh wee tụgharịa uche banyere ihe ọjọọ nke o kwupụtara ga-eme ụnụ.
Mana banyere mụ onwe m, anọ m n’aka ụnụ, jirinụ m mee ihe dị ụnụ mma na ihe masịrị ụnụ. Naanị ihe ụnụ ga-amata bụ na ọ bụrụ na ụnụ egbuo m, ọbara onye enweghị ihe o mere ga-adị n’isi ụnụ nakwa obodo ụnụ na ndị niile bi na ya, n’ihina n’eziokwu, ọ bụ Yahweh zipụtara m ka m gwa ụnụ okwu ndị a ka ọ banye ụnụ na ntị.”
Mgbe ahụ ndịisi ọchịchị na ndị mmadụ niile gwara ndị ụkọchukwu na ndị amụma sị, “Nwoke a ekwesịgị amamikpe ọnwụ ọbụla n’ihina ọ gwara anyị okwu site n’aha nke Yahweh Chineke anyị.”
Ma na Ahịkam nwa Shafan chedoro Jeremaya nke mere na ahanyeghị ya n’aka ndị mmadụ ka ha gbuo ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 69: 15-16, 30-31, 33-34
Azịza: Onyenweanyị n’oke ịhụnaanya gị za m.
1. Gụpụta m n’ide mmiri nke a; Ka m ghara ịdanye ọzọ,
mee ka m gbanaha ndị kpọrọ m asị
zọpụta m n’ime mmiri.
Ekwekwala ka ebili mmiri zara m,
ekwela ka ide mmiri rie m
mọbụ ka olulu kpuchido m.
Azịza: Onyenweanyị n’oke ịhụnaanya gị za m.
2. Ma n’ebe m nọ nwa ogbenye a na-emegbu emegbu,
site n’ike nke nzọpụta gị, Chineke kulite m elu!
Aga m eji ukwe too aha nke Chineke,
aga m eji ekele m bulie aha ya.
Azịza: Onyenweanyị n’oke ịhụnaanya gị za m.
3. Mgbe ahụ ndị umeala hụ nke a ha ga-añụrị,
Ka ụnụ wee nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke!
Onyenweanyị na-ege ndị niile nọ na mkpa ntị mgbe niile,
ọ naghị echezọ ndị nke ya e ji e ji.
Azịza: Onyenweanyị n’oke ịhụnaanya gị za m.
MBEKU – Ps. 119:35, 29
Alleluia, Alleluia
Kuziere m ụzọ gị, Onyenweanyị, Kuziere m iwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 14:1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’oziọma dị asọ nke Matiu dere
N’oge ahụ eze Herọd nụrụ akụkọ maka ude Jesu. O wee sị ụmụodibo ya, Onye a bụ Jọn onye na-eme baptiizim. E meela ka o si n’ọnwụ bilie nke a mere o ji nwee ike ịrụ ọrụ ebube ndị a.
Herọd nyere ikikere ka e jide Jọn tụba ya n’ụlọ mkpọrọ n’ihi Herọdịas nwunye nwanne ya nwoke bụ Filip. Maka na Jọn gwara ya sị Ọ bụghị ihe ziri ezi ịkpọrọ nwunye nwanne gị.
Herọd chọrọ igbu ya ma ọ tụrụ egwu ndị mmadụ n’ihina ha weere Jọn dịka onye amụma. Ma mgbe emume nke ncheta ọmụmụ Herọd bịara, Ada Herọdịas gbara egwu pụrụ iche n’ihu ndị nnọkọ oriri ahụ.
Nke a tọrọ Herọd ụtọ nke ukwu, nke mere Herọd ji ñụọ iyi kwe nkwa inye ya ihe ọbụla ọ ga-arịọ ya. Site na mkpalite nke nne ya, ọ rịọrọ eze Herọd sị, Nye m isi Jọn onye na-eme mmirichukwu n’efere ugbu a!
lhe a wutere eze Herọd; mana n’ihi iyi ọ ñụrụ n’ihu ndị ọbịa ya o nyere iwu ka e mee nke ahụ. O zipụrụ ozi ka e gbute isi Jọn n’ụlọ mkpọrọ.
Ha butere isi Jọn n’efere bunye nwaagbọghọ ahụ o wee bugara nne ya. Ndị na-eso ụzọ Jọn bịara buru ahụ ya ga lie, ha gara kọọrọ Jesu ihe merenụ.
Igbo Mass Readings for August 2 2026, Ụka nke Iri na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ
Igbo Mass Readings for August 1 2026, Satọde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.