Igbo Mass Readings for August 8 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 8 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:12-2:4

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Habakkuk

Ọ bụ na ị dịghị ebeebe Osebụrụwa na Chukwu m, onye nsọ nke m? Anyị agaghị anwụ. Yahweh, i mere ka ihe ndị a bụrụ ihe a ga-eji dọọ anyị aka na ntị.

Gị bụ okwute, i meela ka ha bụrụ ihe ị ga-eji taa anyị ahụhụ. Anya gị dị nsọ, ọ naghị achọ ịhụ njọ, ọ naghị achọkwa ịhụ ndị na-eme ajọ ihe.

Ma gịnị mere I ji hapụ ndị na-aghọ aghụghọ, gịnị mere I ji gba nkịtị ebe onye ajọ mmadụ na-emegbu onye eziomume?

Gịnị mere I ji meso ndị mmadụ omume dịka azụ bi na mmiri, dịka anụmaanụ na-awagharị n’enweghị onyendu. Ha na-eji nko ha na ụgbụ ha na-ejide ha dịka azụ, bịazie na-añụrị ọñụ, na-etegharịkwa egwu.

N’ihi nke a, ha na-achụnyere ụgbụ ha aja mgbaisiọma n’ihina ọ bụ site na ya ka ha si ebi ezi ndụ, na-erikwa ihe kachasị mma.

Ha ga na-aga n’ihu na-awụpụ ihe ụgbụ ha gbutere oge niile, na-egbupịa mba niile n’enweghị obi ebere ọbụla? Aga m akwụrụ n’ebe nche m, aga m arịgoro n’ụlọ nche m dị elu.

Aga m anọrọ wee mara ihe Chineke ga-agwa m, ihe ọ ga-asa m gbasara mkpesa m kpesara ya. Mgbe ahụ Yahweh zara m sị, “Detuo ọhụ a, depụta ya na mbamba okwute ebe a ga-agụta ya nke ọma.

N’ihina ọhụ a na-eche oge ya; ọ chọrọ ka e mejupụta ya ngwa ngwa, nrafu ọbụla adịghị na ya. Ọ bụrụ na o mezughị ya ọsọọsọ, chere ya n’ihina ọ ga-emechaa mezuo.

Lee anya, onye ọbụla obi ya akwụghị ọtọ ga-anwụ. Mana ọ bụ site na-okwukwe ya ka onye eziomume ga-eji dị ndụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 9: 7-8, 9-10, 11-12

Azịza: Onyenweanyị Ị naghị agbahapụ ndị na-achọ gị

1. Lee, Onyenweanyị na-achị ebeebe,

O doziela ocheeze ya maka ikpe,

Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee ụwa ikpe

Jiri eziokwu kpebie ikpe n’etiti mba niile.

Azịza: Onyenweanyị Ị naghị agbahapụ ndị na-achọ gị

2. Ka Onyenweanyị bụrụ onye nchedo nke ndị a na-emegbu emegbu

Ka ọ bụrụ onye nche ha oge ihe siri ike.

Ndị na-ekwupụta aha gị ga-adabere na gị

Ị naghị agbahapụ ndị na-achọ gị Onyenweanyị.

Azịza: Onyenweanyị Ị naghị agbahapụ ndị na-achọ gị

3. Kwegara Dinwenụ onye ụlọ ya dị na Zayọn ukwe otito

Kwupụta ọrụ ebube ya n’etiti mba niile!

Chineke na-echeta ndị eziomume, na-emegwata ndị na-emegbu ha,

ọ naghị eleghara akwa ndị ụwa na-atụ n’ọnụ anya.

Azịza: Onyenweanyị Ị naghị agbahapụ ndị na-achọ gị

MBEKU – Ps 119:105

Alleluia, Alleluia                            

Okwu gị bụ mpanaka na edu m, bụrụkwa ihe n’ụzọ m.

Alleluia.

OZIỌMA – 17:14-20

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ha rutere ebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere Jesu gbuoro ya ikpereala sị; “Onyenwe m meere nwa m nwoke ebere, n’ihina akwụkwụ na-adọ ya.

Ọ na-ata oke ahụhụ. Mgbe ụfọdụ ọ na-adaba n’ọkụ mọbụ na mmiri. Akpọtaara m ya ndị na-eso ụzọ gị ma ha enweghị ike ịgwọ ya.

Jesu etie sị, “Ewo! Ụnụ ọgbọ hiere ụzọ, na enweghị okwukwe, ruo ole mgbe ka mụ na ụnụ ga-anọ? Aga m edịgide omume ụnụ ruo ole mgbe? Kpọtara m nwata ahụ ebe a.”

Jesu baara mmụọ ọjọọ ahụ mba. O wee si n’ime nwatakịrị ahụ pụọ. Ahụ dịkwara nwatakịrị ahụ mma ozigbo ahụ.

Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya jụọ ya na nzuzo sị, “Gịnị mere anyị onwe anyị enweghị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?”

Jesu zara ha sị, “Ọ bụ maka ihi obere okwukwe ụnụ; N’ezie, agwa m ụnụ: ọ bụrụ na ụnụ nwere okwukwe pere mpe dịka mkpụrụ osisi mọstad, ụnụ ga-asi ugwu a si ebe a gaa n’ofe nke ọzọ. Ọ ga-emekwa otu ahụ. Ọ dịghịkwa ihe ọbụla ga-anyị ụnụ n’omume.

Igbo Mass Readings for August 9 2026, Ụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Mbụ

Igbo Mass Readings for August 8 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.