Igbo Mass Readings for July 19 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 19 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:37-42

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ

Ndị Izrel dị ihe dịka narị puku isii n’ọnụọgụgụ, ma e wepụ ụmụnwaanyị na ụmụaka, gara njem site na Ramesis ruo Sukọt. Ọtụtụ igwe mmadụ ndịọzọ dị icheiche sonyere ha, tinyere ọtụtụ igwe ehi na atụrụ.

Ha kwadobere achịcha ndị ahụ na-ekoghị eko dịka nri nke ha si n’ljipt weta; o koghị eko n’ihina a chụpụrụ ha n’ala ljipt na mberede nke mere na ha enweghị ohere ọbụla ịkwado ihe ha ga-eri n’ụzọ.

Ndị Izrel biri n’ala ljipt narị afọ anọ na iri atọ. Ụbọchị narị afọ anọ na iri atọ kụụrụ ọnụ, ka ndị nke Yahweh siri n’ala ljipt pụta.

Ọ bụụrụ Yahweh abalị iche nche iji hụ na ha pụtachara n’ala Ijipt; ya mere na abalị a n’onwe ya bụụrụ ụmụ Izrel oge nche nke e hunyeere Yahweh na ndụdụgandụ ha niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 136:1, 23-24, 10-12, 13-15

Azịza: Ịhụnaanya Onyenweanyị enweghị njedebe.

1. Alleluia, Nyenụ Chineke ekele, n’ihina ọ dị mma,

ịhụnaanya ya enweghị njedebe.

O chetara anyị mgbe anyị nọ na nsogbu,

n’ihina ịhụnaanya ya enweghị njedebe.

Wee zọpụta anyị n’aka ndịiro anyị,

n’ihina ịhụnaanya ya enweghị njedebe.

Azịza: Ịhụnaanya Onyenweanyị enweghị njedebe.

2. Ọ bụ ya tigburu diọkpara niile n’ala ljipt,

n’ihina ịhụnaanya ya enweghị njedebe,

O siri n’ala ha dupụta ụmụ Izrel,

n’ihi n’ịhụnaanya ya enweghị njedebe.

Oji ike aka ya dupụta ha

N’ihina ịhụnaanya ya enweghị njedebe.

Azịza: Ịhụnaanya Onyenweanyị enweghị njedebe.

3. Ọ bụ ya kewara osimiri uhie abụọ,

n’ihina ịhụnaanya ya enweghị njedebe,

O siri n’etiti osimiri a dufee ụmụ Izrel,

n’ihina ịhụnaanya ya enweghị njedebe.

Ma mee ka mmiri gbagbue Fero na igwe ndịagha ya,

n’ihina ịhụnaanya ya enweghị njedebe.

Azịza: Ịhụnaanya Onyenweanyị enweghị njedebe.

MBEKU – 2 Tim 1:10

Alleluia, Alleluia:

Onye nzọpụta anyị Jesu Kristi mebiri ọnwụ, bịa wetara anyị ndụ site n’oziọma ahụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 12:14-21

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Nke a mere ndị Farisii jiri pụọ gbaba izu otu ha ga-esi gbuo ya. Jesu maara nzube ha, were si ebe ahụ pụọ. Ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya, ọ gwọrọ ha niile. O nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ ndị ọzọ maka ya.

Nke a bụ iji mezupụta ihe onye amụma Aịzaya kwuru sị: “Lee, onye a bụ nwodibo m, onye m họọrọ, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya na amasị m. Mmụọ m ga-anọnyere ya, Ọ ga-ekwusara mba niile ikpe ziri ezi.

Ya na mmadụ agaghị ese okwu, Ọ gaghị etisikwa mkpu ike, nke mmadụ na-anụ olu ya n’ama. Ọ gaghị emegide ndị na-adịghị ike mọbụ menyụọ ọkụ na-anyụ anyụ, wee ruo mgbe o mere ka ikpe ziri ezi nwee mmeri. Ọ bụkwa n’aha ya ka mba niile ga-atụkwasịobi.”

Igbo Mass Readings for July 20 2025, Ụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Atọ

Igbo Mass Readings for July 19 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.