Igbo Mass Readings for July 26 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 26 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 24:3-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ

Mosis bịara gwa ndị Izrel ihe niile Yahweh kwuru, ụzọ ya na iwu ya niile, ha niile werekwa otu olu zaa sị, “anyị ga-emezucha okwu Yahweh ndị a niile”. Mosis detukwara okwu Yahweh niile ahụ edetu.

O bilitekwara n’isi ụtụtụ echi ya wee ruo ebe nchụaja na ndịda ugwu ahụ. Ọ gụnyekwara ide okwute iri na abụọ n’usoro agbụrụ iri na abụọ niile nke Izrel.

O zipụkwara ụmụokorobịa Izrel bụ ndị gara chụọrọ Yahweh aja nsureọkụ na aja nke udo nke e ji oke ehi chụọ. Mosis wụnyere ọkara ọbara n’efere ma werekwa nke fọdụrụ fesaa n’elu ebe nchụaja ahụ.

O weere akwụkwọ nke ọgbụgbandụ ma gụpụta ya ka ndị Izrel nụrụ; ha ekwuo sị, “Anyị ga-emezucha ihe niile Yahweh kwuru, anyị ga-erube isi”.

Mosis weere ọbara ahụ fesacha ụmụ Izrel wee sị, “Nke a bụ ọbara nke ọgbụgbandụ nke Yahweh mere ka ụnụ na ya nwee site n’okwu ndị a niile”.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 50:1-2, 5-6, 14-15

Aziza: Ka inye ekele bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke

1. Onyenweanyị, Chineke nke chi niile na-ekwu, ọ na-akpụ ụwa niile

bido n’ọwụwa anyawụ ruo n’ọdịda ya.

Bido na Zayọn bụ ebe kachasị mma

ka o si na-achawapụta.

Aziza: Ka inye ekele bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke

2. Kpokọtaranụ m ndị nke m kwere ekwe,

ndị mụ na ha gbara ndụ site n’aja ha chụrụ!

Ka eluigwe niile kwupụta eziomume ya;

Maka na Chineke n’onwe ya bụ onye ọkaikpe.

Aziza: Ka inye ekele bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke

3. Mba, ka inye ekele gị bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke,

mejupụta iyi ị ñụụrụ onye kacha elu.

Mgbe ahụ ọ bụruụ na ị kpọọ m n’oge nsogbu,

aga m azọpụta gị, ma, ị ga-asọpụrụ m.

Aziza: Ka inye ekele bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke

MBEKU – Ps. 147:2,15

Alleluia, Alleluia:

Toonụ Onyenweanyị, Jerusalem. Ọ na-etiri ụwa iwu.

Alleluia.

OZIỌMA – 13:24-30

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara oke igwe mmadụ ahụ okwu ọzọ n’ụkabụilu sị: “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere otu nwoke ghara mkpụrụ ọma n’ubi ya.

Mgbe ndị mmadụ na-arahụ ụra, onye iro ya bịara kụnye mkpụrụ ata n’etiti ọka wee laa. Mgbe ọka tolitere mịa mkpụrụ, ata sokwara too.

Ụmụodibo nwoke ahụ bịakwutere ya sị ya, Ọ bụ na ọ bụghị mkpụrụ ọka ọma ka ị kụrụ n’ubi gị, olee otu osi nweta ata?” Ọ zara ha sị, “Onye iro mere nke a’.

Ụmụodibo ya wee jụọ ya sị, Ị chọrọ ka anyị ga fopụchaa ata ndị ahụ? Ọ zara ha sị, ‘Mba’ ka ụnụ ghara ifopụ ọka mgbe ụnụ na-efopụ ata!

Hapụnụ ha abụọ ka ha na-etokọta ruo oge owuwe ihe ubi. Oge ahụ aga m agwa ndị na-aghọrọ m ọka sị: “Burunụ ụzọ fopụchaa ata, keenụ ha n’ukwu n’ukwu ka e wee kpọọ ha ọkụ. Ma kpobatanụ ọka n’ime ọba m”.

Igbo Mass Readings for July 27 2025, Ụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Atọ

Igbo Mass Readings for July 26 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.