Igbo Mass Readings for July 29 2028, Satọde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 29 2028, Satọde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:1-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah
Okwu nke Osebụrụwa bịaara Jeremaya sị: “Guzo n’ọnụụzọ mbata ukwu nke ụlọ nke Chineke, kwuo okwu a ebe ahụ sị, ‘nụrụnụ okwu nke Yahweh ụnụ bụ ndị Juda niile na-abata n’ọnụụzọ ukwu a ife Osebụrụwa, Yahweh nke ji ike niile, Chineke nke Izrel kwuru sị, Mezienụ ụzọ ụnụ na omume ụnụ niile, ka m kwere ka ụnụ biri ebe a.
Ụnụ enwela ntụkwasịobi n’okwu nduhie ụzọ niile ndị a: Nke a bụ ụlọ nke Yahweh ụlọnsọ nke Yahweh, ụlọ nke Yahweh.
N’ihina ụnụ mezie ụzọ ụnụ niile na omume ụnụ niile, ọ bụrụkwa na ụnụ jiri ikpe nkwụmọtọ na-eso ibe ụnụ, ma gharakwa imegbu ndị ọbịa, ndị enwe nne enwe nna mọbụ ndị ajadu ma gharakwa ịkwatu ndị aka ha dị ọcha n’ala a, ma ọ bụrụkwa na ụnụ akwụsị ife chi ndịọzọ dị icheiche ofufe nke na ebutere ụnụ nsogbu, aga m ekweta ka ụnụ biri ebe a; n’ime ala nke m nyerela nnanna ụnụ n’oge ochie ruo mgbe ebighịebi.
Lee, ụnụ na-atụkwasa obi n’okwu nduhie nke abaghị uru. Ọ bụ ụnụ zuchaa ohi, gbuo ọchụ, kwaa iko, ñụọkwa iyi ụgha, fee arụsị Baal na ọtụtụ chi ndịọzọ dị icheiche, ụnụ abịakwa guzo n’ihu m n’ime ụlọnsọ a, nke a kpọrọ aha m, ma na-emekwa ihe ọjọọ niile ndị a?””
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 84:2,3,4-5,7,10
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma Osebụrụwa Chineke pụrụ ime ihe niile.
1. Ọ na-agụ m nnukwu agụụ
ka m bata n’ogige Osebụrụwa
ka mkpụrụobi m na anụahụ m
na-ekwere Chineke dị ndụ ukwe ọñụ.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma Osebụrụwa Chineke pụrụ ime ihe niile.
2. Ka o si dị, nnụnụ ebelebe na-achọtara onwe ya ụlọ obibi,
nnụnụ eleke achọtara onwe ya akwụ
ebe ọ ga-edote ụmụ ya n’akụkụ ebe ịchụaja gị,
Onyenweanyị onye pụrụ ime ihe niile,
Onye bụ eze m na Chineke m.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma Osebụrụwa Chineke pụrụ ime ihe niile.
3. Ha bụ ndị a gọzirị agọzi ndị bi n’ụlọ gị
na-ekwere gị ukwe otito oge niile.
ndị ike ha si na gị bụ ndị agọziri agọzi,
Ka ha na-aga ike ha na-abawanye.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma Osebụrụwa Chineke pụrụ ime ihe niile.
4. N’ihina otu ụbọchị n’ebe gị ka mma
karịa nnụkwuru nnụ afọ ebe ọzọ
Ọ kaara m mma ịbụ onye nche ụzọ n’ụlọ nke Onyenweanyị,
karịa ibi n’ebe obibi ndị ajọ mmadụ.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma Osebụrụwa Chineke pụrụ ime ihe niile.
MBEKU – Ps. 147:2,15
Alleluia, Alleluia:
Toonụ Onyenweanyị, Jerusalem. Ọ na-etiri ụwa iwu.
Alleluia.
OZIỌMA – 13:24-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara oke igwe mmadụ ahụ okwu ọzọ n’ụkabụilu sị: “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere otu nwoke ghara mkpụrụ ọma n’ubi ya.
Mgbe ndị mmadụ na-arahụ ụra, onye iro ya bịara kụnye mkpụrụ ata n’etiti ọka wee laa. Mgbe ọka tolitere mịa mkpụrụ, ata sokwara too. Ụmụodibo nwoke ahụ bịakwutere ya sị ya, Ọ bụ na ọ bụghị mkpụrụ ọka ọma ka ị kụrụ n’ubi gị, olee otu osi nweta ata?”
Ọ zara ha sị, “Onye iro mere nke a’. Ụmụodibo ya wee jụọ ya sị, Ị chọrọ ka anyị ga fopụchaa ata ndị ahụ? Ọ zara ha sị, ‘Mba’ ka ụnụ ghara ifopụ ọka mgbe ụnụ na-efopụ ata!
Hapụnụ ha abụọ ka ha na-etokọta ruo oge owuwe ihe ubi. Oge ahụ aga m agwa ndị na-aghọrọ m ọka sị: “Burunụ ụzọ fopụchaa ata, keenụ ha n’ukwu n’ukwu ka e wee kpọọ ha ọkụ. Ma kpobatanụ ọka n’ime ọba m”.
Igbo Mass Readings for July 30 2028, Ụka nke Iri na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ
Igbo Mass Readings for July 29 2028, Satọde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.