Igbo Mass Readings for August 16 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 16 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 24:14-29

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jọshụa

Jọshụa gwara ọgbakọ ụmụ Izrel sị, “Ugbu a tụọnụ Osebụrụwa egwu, werenụ okwukwe na eziokwu fee ya; wepụnụ chi ọzọ nke nna ụnụ ha fere n’ofe osimiri na n’ljipt ka ụnụ fee osebụrụwa.

Ma ọ bụrụ na ụnụ achọghị ife Osebụrụwa ofufe, họpụtaranụ onwe ụnụ onye ụnụ ga-efe. Mọbụ chi ndị ahụ nna ụnụ ha fere n’ofe osimiri mọbụ chi ndị Amọ ụnụ bi n’ala ha; ma mụ na ezinụụlọ m niile anyị ga-efe Osebụrụwa.”

Ụmụ Izrel zaa ya sị, “Nke a agaghị eme: na anyị ga-efe chi ọzọ hapụ Osebụrụwa! N’ihina ọ bụ Osebụrụwa Chineke si n’ala ljipt kpọpụta anyị na nna anyị ha n’agbụ; Ọ bụ ya gosiri anyị nnukwu akara, chekwaa anyị n’ụzọ niile anyị gara, na n’aka ndị niile anyị gafere n’obodo ha.

Osebụrụwa chụpụchara ndị a niile n’ihu anyị, ndị Amọ ndị biri n’ala a; ya mere anyị ga-efe Osebụrụwa n’ihina Ọ bụ Chineke anyị.”

Jọshụa gwara ha sị, “Ụnụ enweghị ike ife Osebụrụwa n’ihina ọ bụ Chineke dị nsọ; Ọ bụkwa Chineke ekworo; ọ gaghị agbaghara mmehie niile ụnụ na njọ ụnụ.

Ọ bụrụ na ụnụ ahapụ Osebụrụwa fee chi ọzọ, Ọ ga-echigha merụọ ụnụ ahu, repia ụnụ n’agbanyeghị iheọma niile O meere ụnụ.”

Ụmụ Izrel gwakwara Jọshụa sị, “Mba! Ọ bụ Osebụrụwa ka anyị ga-efe. Jọshụa gwakwa ha sị, “Ụnụ bụụrụ onwe ụnụ ndị akaebe na ụnụ ewerela Osebụrụwa ka ụnụ fee ya.”

Ha kwuo sị, “Anyị bụ ndị akaebe onwe anyị.” Ọ gwakwa ha sị, “Wepụnụ chi ọzọ ụnụ nwegasịrị, tinyenụ obi ụnụ n’Osebụrụwa Chineke nke Izrel.”

Ụmụ Izrel wee gwa Jọshụa sị, “Osebụrụwa Chineke anyị ka anyị ga-efe, ọ bụ olu ya ka anyị ga-ege ntị.” Jọshụa na ụmụ Izrel wee gbaa ndụ ụbọchị ahụ, o dobekwaara ha iwu na usoro ha ga na-eso na Shekem.

Jọshụa wee dee okwu ndị n’akwụkwọ iwu Chineke, were nnukwu okwute kwụwa ya n’okpuru osisi Ook, n’ebe nsọ nke Osebụrụwa.

Jọshụa wee gwa ụmụ Izrel niile sị, “lee okwute a ga-abụ akaebe megide ụnụ ma ụnụ gọnari Chineke ụnụ.” Jọshụa wee zilaga ụmụ Izrel nwoke ọbụla na nketa ekpe ya.

Ka ihe ndị a mechara, Jọshụa nwa Nọn, nwodibo Chineke nwụrụ ka ọ dị narị afọ na iri.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 16: 1-2, 5, 7-8, 11

Azịza: Gị O Dinwenụ bụ ihe nketa nke m

1. Chekwaba m Chineke n’ihina Ị bụ ebe mgbaba m

A gwara m Onyenweanyị sị, Gịnwa bụ Chincke m

Iheọma niile m nwere si n’aka gị bịa”

Sọ gị Onyenweanyị bụ ihe m nwere,

Ị na-enyekwa m ihe niile m chọrọ.

Azịza: Gị O Dinwenụ bụ ihe nketa nke m

2. Ana m eto Onyenweanyị bụ onye na-agbaziri m

n’ime abalị mmụọ m na-enye m ndụmọdụ;

Ana m eche echiche banyere Onyenweanyị mgbe niile,

n’ebe Ọ nọ n’aka nri m egwu agaghị atụ m.

Azịza: Gị O Dinwenụ bụ ihe nketa nke m

3. Ị ga-akụziri m ụzọ nke ndụ,

Ị ga-enye m añụrị na-enweghị ube n’ihu gị

n’aka nri gị aga m enwe añụrị ebeebe.

Azịza: Gị O Dinwenụ bụ ihe nketa nke m

MBEKU – Ps 19:9

Alleluia, Alleluia:

Ịtụ egwu Onyenweanyị bụ ihe dị mma: ọ na-adị ebeebe; Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu; Ha niile kwụkwa ọtọ.

Alleluia

OZIỌMA – 19:13-15

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ahụ, ndị mmadụ kuteere Jesụ ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka wee kpeere ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba.

Jesu sịrị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m, ụnụ egbochila ha, n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.” O bikwasara ha aka wee si n’ebe ahụ pụọ.

Igbo Mass Readings for August 17 2025, Ụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Atọ

Igbo Mass Readings for August 16 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.