Igbo Mass Readings for June 20 2026, Satọde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 20 2026, Satọde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 24:17-25
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Abụọ nke Ihe E Mere (Chronicles)
Ka Jehọịada nwụsịrị, ndịisi Juda bịara inye eze nsọpụrụ, eze tụgharịrị ịnara ndụmọdụ ha. Ndị Juda gbahapụrụ ụlọnsọ nke Yahweh Chineke nke nnanna ha, were fewe arụsị na ihe a pịrị apị.
Maka njọ ha nke a, iwe Chineke dakwasara Juda na Jerusalem. O ziteere ha ndị amụma ịkpọghachi ha azụ n’ebe Yahweh nọ, mana ha egeghị okwu ha ntị. Mmụọ nke Chineke dakwasara Zekaraya nwa Jehọịada onye Ụkọchukwu.
O kwupụtara n’ihu igwe mmadụ sị, “Chineke kwuru nke a, ‘Ọ bụ maka gịnị ka ụnụ ji emebi iwu nke Yahweh nke agaghị abara ụnụ uru ọbụla? Ụnụ agbahapụla Yahweh, ugbu a ọ gbahapụla ụnụ.
Ha gbara izu were okwute tụgbuo ya n’ogige ụlọnsọ dịka eze siri nye n’iwu. Eze Joash chezọrọ iheọma niile nke Jehọịada nna Zekaraya gosịrị ya were gbuo nwa Jehọịada onye nke tiri mkpu mgbe ọ na-anwụ sị, “Yahweh na-ahụ, ọ ga-abọrọkwa!
Mgbe otu afọ gasịrị, ndịagha Aram lụsoro Joash ọgụ, ruo Juda na Jerusalem, gbuchaa ndịisi ọchịchị ha. Ha wegaara eze ha na Damaskọs ihe niile ha lụtara n’agha.
Ọ bụ eziokwu na ndịagha ndị Aram adịghị ọtụtụ mana Yahweh mere ka ha merie ndị Izrel, n’agbanyeghị na ha nwere ọtụtụ ndịagha n’ihina ha gbahapụrụ Chineke nnanna ha.
Ndị Aram merụrụ Joash nnukwu ahụ. Ha hapụrụ ya ọ dị ndụ ọnwụ ka mma laghachi; ndịisi ọchịchị ya gbara izu ịbọ ọbọ ọnwụ nwa Jehọịda onye Ụkọchukwu, were gbuo ya n’elu akwa ya. Ha liri ya n’obodo Devid n’ili ozu abụghị nke ndịeze.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 89: 3-4,28-29,30-31,32-33
Azịza: Aga m ahụ onye m họọrọ n’anya ebeebe.
1. Mụ na onye m họọrọ agbaala ndụ,
añụọrọla m Devid nwodibo m iyi.
Aga m eme ka ọchịchị gị dị ebeebe,
Aga m emekwa ka ocheeze gị
dịgide ruo na ndụdụgandụ niile.
Azịza: Aga m ahụ onye m họọrọ n’anya ebeebe.
2. Aga m ahụ ya n’anya ebeebe,
ọgbụgbandụ mụ na ya ga-adị ọkpụ
Ọchịchị ya ga-adị ebeebe,
Ocheeze ya ga-adịgide dịka eluigwe.
Azịza: Aga m ahụ onye m họọrọ n’anya ebeebe.
3. Ọ bụrụ na ụmụ ya enupụ isi n’iwu m
gharakwa iso ụzọ m niile.
Ọ bụrụ na ha enupụrụ m isi
ma ghara idobe iwu m.
Azịza: Aga m ahụ onye m họọrọ n’anya ebeebe.
4. Aga m ata ha ahụhụ maka ihi njọ ha niile
ma mesiekwa ha ike maka mmehie ha.
Mana a gaghị ewepụ ịhụnaanya m na ebe ha nọ,
mọbụ ghara imejupụta nkwa m.
Azịza: Aga m ahụ onye m họọrọ n’anya ebeebe.
MBEKU – Jemis 1:18
Alleluia, Alleluịa:
Onyenweanyị jiri okwu nke eziokwu ahụ mee ka anyị pụta iche. Meekwa ka anyị bụrụ ndị mkpụrụ mbụ nke ihe o kere eke.
Alleluia.
OZIỌMA – 6:24-34
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “O nweghị onye pụrụ ịgbara nnaukwu abụọ odibo; n’ihina ọ ga-akpọ otu asị hụ nke ọzọ n’anya, mọbụ ọ ga asọpụrụ otu lelịa nke ọzọ.
Ụnụ apụghị ịbụ odibo Chineke na akụ nke ụwa. “Ana m agwa ụnụ eziokwu, ụnụ echegbula onwe ụnụ banyere ndụ ụnụ, ihe ụnụ ga-eri, mọbụ nke ụnụ ga-añụ, mọbụ banyere ahụ ụnụ; ihe ụnụ ga-eyi n’ahụ?
Ọ bụ na ndụ akarịghị ihe oriri, ka ọ bụ na ahụ akarịghị ihe a na-eyi n’ahụ. Leenụ ụmụ nnụnụ nke igwe, ha anaghị akọ ugbo, ha anaghịkwa ewe ihe ubi nke ha na-akpọkọba ihe n’ọba, ma Nna ụnụ nke eluigwe na-azụ ha.
Ọ bụ na ụnụ abaghị uru karịa ha? Kedụ onye n’ime ụnụ pụrụ ịtụkwasị ihe na ndụ ya site n’ichegbu onwe ya? Gịnị mere ụnụ ji echegbu onwe ụnụ banyere uwe ụnụ ga-eyi n’ahụ?
Leenụ okooko dị n’ubi ka ha si eto: ha anaghị arụ ọrụ, nke ha na-ekwe akwa. Ma agwa m ụnụ, ọbụladị Solomọn, na ikeike eze ya niile, amarughị mma ka otu n’ime okooko ndị a.
Ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa dị n’ubi mma, nke dị ndụ taa, echi a tụnye ya n’ọkụ, ọ bụ na ọ gaghị eyikwasị ụnụ uwe karịa, ụnụ ndị obere okwukwe?
Ya bụ, ụnụ echegbula onwe ụnụ sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri? Mọbụ gịnị ka anyị ga-añụ? Mọbụ gịnị ka anyị ga-eyi n’ahụ? N’ihina ndị mba ọzọ na-achọ ihe ndị a niile, ma Nna ụnụ nke bi n’eluigwe maara na ihe ndị a dị ụnụ mkpa.
Ma burunụ ụzọ chọba alaeze Chineke na eziomume ya, ihe ndị a niile ga-abụkwa nke ụnụ. Ya bụ, ụnụ echegbula onwe ụnụ banyere ihe echi ga-eweta, n’ihina echi ga-echere onwe ya banyere mkpa nke dịịrị ya. Nsogbu ụbọchị ezuola maka ụbọchị ahụ.
Igbo Mass Readings for June 21 2026, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ
Igbo Mass Readings for June 20 2026, Satọde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.