Igbo Mass Readings for June 14 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 14 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:14-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl Degaara ndị Kọrịnt
Ọ bụ ịhụnaanya Kristi na-edu anyị n’ihina anyị kwere na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile; nke pụtara na mmadụ niile anwụọla.
Ọ nwụrụ maka mmadụ niile, ka ndị na-adị ndụ ghara ịdị ndụ maka naanị onwe ha, kama maka onye ahụ nwụrụ n’ihi ha ma sikwa n’ọnwụ kulie. Bido ugbu a gaba, anyị adịghị elekwasị onye ọbụla anya dịka mmadụ nkịtị.
Ọ bụ ezie na anyị na-ahụ Kristi dịka mmadụ nkịtị na mbụ, ma anyị adịghị ahụ ya otu ahụ ọzọ. Otu ọ dị, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ n’ime Kristi, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ wee nọchie.
Ihe ndị a niile bụ aka ọrụ Chineke, onye sitere na Kristi mee ka anyị na ya dị n’otu ọzọ, nyekwa anyị ọrụ ime ka Chineke na ụmụ mmadụ dị n’otu. Ihe nke a pụtara bụ na Chineke sitere na Kristi na-eme ka ya na ụwa dị na mma.
Chineke adịghịkwa agụkọrọ ụmụ mmadụ mmehie ha niile kama o tinyela n’aka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.
Anyị bụ ndị nnọchite anya nke Kristi Chineke sitere n’ime anyị na-akpọ ụnụ oku. Anyị na-arịọ ụnụ n’aha Kristi ka ụnụ na Chineke dịkwa na mma ọzọ.
Ọ bụ n’ihi anyị ka Chineke jiri mee ka Kristi were ọnọdụ na ahụhụ dịịrị ndị mmehie ebe o meghị njọ ọbụla, Chineke mere nke a ka anyị wee bụrụ ndị eziomume nke ya n’ime Kristi.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 103:1-2,3-4,8-9,11-12
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
1. Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,
gọzie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n’ime m!
Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobim,
echezọkwala obi ebere ya niile.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
2. Nke o ji gbaghara njọ gị niile,
ma gwọọ ọrịa gị niile,
nke o ji si n’olulu zọpụta ndụ gị,
nke o ji were ịhụnaanya na obi ebere kpube gị okpueze.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
3. Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya,
ọ naghị ewe iwe ngwa ngwa,
ịhụnaanya ya dị ukwuu,
iwe ya anaghị adị ebeebe,
ịkpọ asị ya na-adị sọ nwa ntịtị oge.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
4. Dịka eluigwe siri dị elu n’ebe ụwa dị,
otu ahụ ka ịhụnaanya ya siri dị ukwuu
n’ebe ndị na-atụrụ ya egwu nọ.
Ọ na-ewepụ njọ anyị n’ebe anyị nọ
karịa otu ọwụwa anyanwụ si dị anya n’ọdịda ya.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.
MBEKU – Ps. 119:88
Alleluia, Alleluịa:
Site n’ịhụnaanya gị na enweghị ube, zọpụta m, ka m wee nwee ike idobe iwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 5:33-37
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọzọ, ụnụ nụrụ na a gwara ndị ochie sị “Ụnụ añụla iyi ụgha, kama mezuore Osebụrụwa ihe ị ñụrụ n’iyi. Ma ana m agwa ụnụ! Añụla iyi ma ọlị.
Ejila eluigwe añụ iyi n’ihina ọ bụ ocheeze Chineke. Ejikwala ala añụ iyi n’ihina ọ bụ ebe mgbakwasị ukwu ya; mọbụ Jerusalem, n’ihina ọ bụ obodo nke eze ukwu ahụ.
Ejikwala isi gị n’ihina i nweghị ike ime ka otu ntụtụisi gị dị ọcha mọbụ dị oji. Ya bụ, ka okwu gị niile bụrụ, ‘Ee’ mọbụ ‘Mba’, ihe ọzọ kariri nke a sị n’aka ekwensu.
Igbo Mass Readings for June 15 2025, Ụka Atọ N’Otu Dị Ngọzi – Afọ nke Atọ.
Igbo Mass Readings for June 14 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.