Igbo Mass Readings for June 13 2026, Satọde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 13 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:19-21
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze
Ka Elaịja hapụrụ ugwu Họreb, ọ chọtara Elaịsha nwa Shafat ebe o ji iri ehi abụọ na anọ e kekọrọ abụọ abụọ na-akọ ugbo. Ya onwe ya so nke iri na abụọ n’ime ha.
Elaịja siri n’akụkụ ya gafere wụkwasa ya uwe mkpuchi ya. Elaịsha hapụrụ okeehi ya ndị ahụ gbasobe Elaịja rịọ ya sị, “ka m susuo nne m na nna m ọnụ tupu esobe m gị.”
Ma Elaịja zara ya sị, “Laghachi azụ, o nwere ihe m mere gị?” Elaịsha laghachiri azụ gbuo ehi ya ndị ahụ, were osisi niile e ji kekọọ ehi ndịahu ọnụ were sie ha nye ha ndị mmadụ ha rie. O biliri sobezie Elaịja ka onye enyemaka ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 16:1-2, 5, 7-8, 9-10
Aziza: Sọ gị Onyenweanyi bụ ihe m nwere
1. Chekwaba m Chineke, n’ihina Ị bụ ebe mgbaba m
Agwara m Onyenweanyị sị, Gịnwa bụ Chineke m,
Iheọma niile m nwere si n’aka gị bịa.
Sọ gị Onyenweanyị bụ ihe m nwere.
Ị na-enyekwa m ihe niile m chọrọ.
Aziza: Sọ gị Onyenweanyi bụ ihe m nwere
2. Ana m eto Onyenweanyị bụ onye na-agbaziri m,
n’ime abalị, mmụọ m na-enye m ndụmọdụ;
Ana m eche echiche banyere Onyenweanyị mgbe niile,
n’ebe Ọ nọ n’aka nri m egwu agaghị atụ m.
Aziza: Sọ gị Onyenweanyi bụ ihe m nwere
3. N’ihi nke a mkpụrụobi m nọ n’ọñụ, mmụọ m na-enwe añụrị
ahụ m na-ezukwa ike n’enweghị nsogbu ọbụla.
N’ihina ị gaghị agbahapụ mkpụrụobi m n’ala mmụọ
mọbụ kwe ka onye ị hụrụ n’anya ree ure.
Aziza: Sọ gị Onyenweanyi bụ ihe m nwere
MBEKU – Ps. 119:88
Alleluia, Alleluịa:
Site n’ịhụnaanya gị na enweghị ube, zọpụta m, ka m wee nwee ike idobe iwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 5:33-37
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọzọ, ụnụ nụrụ na a gwara ndị ochie sị “Ụnụ añụla iyi ụgha, kama mezuore Osebụrụwa ihe ị ñụrụ n’iyi. Ma ana m agwa ụnụ! Añụla iyi ma ọlị.
Ejila eluigwe añụ iyi n’ihina ọ bụ ocheeze Chineke. Ejikwala ala añụ iyi n’ihina ọ bụ ebe mgbakwasị ukwu ya; mọbụ Jerusalem, n’ihina ọ bụ obodo nke eze ukwu ahụ.
Ejikwala isi gị n’ihina i nweghị ike ime ka otu ntụtụisi gị dị ọcha mọbụ dị oji. Ya bụ, ka okwu gị niile bụrụ, ‘Ee’ mọbụ ‘Mba’, ihe ọzọ kariri nke a sị n’aka ekwensu.
Igbo Mass Readings for June 14 2026, Ụka nke Iri na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ
Igbo Mass Readings for June 13 2026, Satọde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.