Igbo Mass Readings for April 26 2025, Satọde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 26 2025, Satọde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE OGỤGỤ NKE MBỤ – 4:13-21
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Mgbe ndị nchụaja na ndị okenye hụrụ na Pita na Jọn na-ekwusi okwu ike, n’atụghị egwu ọbụla chọpụtakwa na ha bụ ndị na-amaghị akwụkwọ, ndị mmadụ nkịtị, ihe a juru ha anya; ma ha ghọtara n’otu oge ahụ na ha na Jesu anọọla.
Ma ebe ha hụrụ nwoke ahụ e mere ka ụkwụ ya dị mma ka o guzo n’akụkụ Pita na Jọn ihere ekweghị ha kpee ihe ọbụla kpegide ndịozi ahụ. Mgbe ha gwara ndịozi ahụ ka ha pụọ n’ezi, ha gbarịtara izu n’etiti onwe ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a?”
Onye ọbụla bi na Jerusalem anụla na Chineke arụọla ọrụ ịtụnaanya dị otu a site n’aka ha. Anyị apụghịkwa ịgọpụ ya. Iji mee ka ọ ghara ịdị na-agbasa, na-aga n’ihu n’etiti ndị mmadụ, ka anyị dọsie ha aka na ntị ike, ka ha ghara ịdị na-agwa onye ọbụla okwuchukwu n’aha Jesu, bido ugbu a gaba.
Nke a mere ha ji kpọbata ndịozi ahụ n’ihu nzukọ nye ha iwu ka ha ghara ikwu ma ọ bụ ikuzi ihe ọbụla n’aha Jesu. Pita na Jọn zara ha sị, “Kpebienụ n’onwe ụnụ, ma ọ bụ ihe ziri ezi n’anya Chineke ige ụnụ ntị karịa ige Chineke ntị.
N’ihina anyị onwe anyị aghaghị ikwusa ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.” Ndị nzukọ ahụ dọkwara ha aka n’ntị ọzọ, hapụ ha ka ha laa. Ha ahụghịkwa ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ n’ihina ọha ndị mmadụ na-enye Chineke otito maka ọrụ ebube ha rụrụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 118:14-15, 26-18,19-21.
Azịza: Ana m ekele Gị n’ihina Ị nụla olu m.
1. Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihina Ọ dị mma,
ịhụnaanya ya enweghị njedebe.
Onyenweanyị bụ ike m na ukwe m;
Ya bụkwa onye nzọpụta m.
A na-enwe mkpu ọñụ na nke mmeri
n’ụlọ ndị eziomume.
Azịza: Ana m ekele Gị n’ihina Ị nụla olu m.
2. Aka nri Onyenweanyị na-enwe mmeri,
Aka nri Onyenweanyị ekulitele m.
Mba, agaghị m anwụ, aga m adị ndụ,
ịgụpụta akaọrụ niile nke Onyenweanyị.
Ọ bụ ezie na Onyenweanyị ataala m ahụhụ nke ukwuu,
ma O nyefebeghị m n’aka ọnwụ.
Azịza: Ana m ekele Gị n’ihina Ị nụla olu m.
3. Megheere m ụzọ nke eziomume,
ka m bata bịa nye Onyenweanyị ekele.
Nke a bụ ọnụụzọ nke Onyenweanyị,
ebe ndị eziomume ga-esi bata.
Ana m ekele gị n’ihina Ị nụla olu m,
Ị bụkwa onye nzọpụta m.
Azịza: Ana m ekele Gị n’ihina Ị nụla olu m.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee añụrị ka obi dị anyị ụtọ na ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 16:9-15
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe Jesu si n’ọnwụ bilite n’isi ụtụtụ nke ụbọchị mbụ nke izuụka, o buru ụzọ gosi onwe ya Meri onye Magdala, onye ahụ ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ asaa n’ime ya.
Ọ pụrụ gaa kọọrọ ndị ha na Jesu na-anọ na mbụ ebe ha na-eru uju na-ebekwa akwa. Ma mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na Meri onye Magdala ahụkwala ya, ha ekwetaghị na akụkọ a bụ eziokwu.
Mgbe nke a gachara, Jesu gosikwara ndị na-eso ụzọ ya mmadụ abụọ onwe ya n’ụdị ọzọ ka ha na-abanye n’ime obodo. Ha laghachiri azụ kọọrọ ndị ọzọ ma ha ekwetaghị n’ihe ha kwuru.
Ka e mechara o gosikwara onwe ya ndị na-eso ụzọ ya mmadụ iri na otu ka ha nọ n’oche nri. Ọ tara ha ụta maka ekweghị ekwe na mkpọchi obi ha n’ihina ha ekwetaghị ihe ndị hụrụ ya mgbe o bilitechara n’ọnwụ kọọrọ ha. Ọ gwara ha sị, “Gaanụ n’ụwa niile, kwusaaranụ ihe niile e kere eke oziọma.
Igbo Mass Readings for April 27 2025, Ụka Nke Abụọ N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ
Igbo Mass Readings for April 26 2025, Satọde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.