Igbo Mass Readings for March 8 2025, Satọde na-eso Wenezde Ntụ

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 8 2025, Satọde na-eso Wenezde Ntụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 58:9-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Osebụrụwa na-ekwu: Ọ bụrụ na ụnụ ewepụ n’etiti ụnụ mmegbu, ịtụ aka ma ọ bụ ikwu okwu na- agbawa obi; Ọ bụrụkwa na ụnụ enye ndị agụụ na-agụ ihe oriri, mee ka ndị nọ na mkpagbu nweta afọ ojuju, mgbe ahụ ka ihè ụnụ ga-achawapụta n’ọchịchịrị, abalị ụnụ ewee dịka ehihie.

Yahweh ga-edu ụnụ oge niile. Ọ ga-eji ihe ọma nyejuo ụnụ afọ, ọ ga-emekwa ka ọkpụkpụ ụnụ sie ike, ụnụ ga-adị ka ala ubi a na-agba mmiri, dịka isiiyi nke mmiri ya na-adịghị ata ata.

A ga-arụgharị obodo ụnụ a kuturu akutu na mbụ, ụnụ ga-ewulite ntọala nke ọtụtụ agbụrụ, a ga-akpọ ụnụ “Ndịmmezi ihe nke gbajiri agbaji,” “Ndị odozi ụzọ ebe obibi.”

Ọ bụrụ na ụnụ akwụsị imetọ ụbọchị Sabat m, kwụsịkwa ịchọ ihe ụtọ nke ụnụ n’ụbọchị m dị nsọ, ọ bụrụkwa na ụnụ ewere ụbọchị Sabat kpọrọ ihe, doo ụbọchị nsọ Chineke dịka ụbọchị kwesịrị nsọpụrụ; ọ bụrụ na ụnụ asọpụrụ ya na emeghị uche nke ụnụ, ma ọ bụ ịchọ ọchịchọ nke ụnụ, ma ọ bụ ikwu okwu na-abaghị uru, mgbe ahụ, ụnụ ga-enwe mmasị n’ebe Yahweh nọ; aga m eme ụnụ adị elu n’ime ụwa; Aga m azụ ụnụ site n’ihe nketa nnanna ụnụ bụ Jekọb, n’ihi na ọnụ nke Osebụrụwa ekwuola ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 86: 1-2, 3-4, 5-6.

Azịza: Kuziere m ụzọ gị O Onyenweanyị, ka m were okwukwe na-eso gị.

1. Gee m ntị Onyenweanyị, zaa m,

n’ihina abụ m ogbenye na-enweghị enyemaka.

Chekwaba ndụ m, n’ihi na-enwere m okwukwe na gị,

zọpụta nwodibo gị onye tụkwasara obi na gị.

Azịza: Kuziere m ụzọ gị O Onyenweanyị, ka m were okwukwe na-eso gị.

2. Ị bụ Chineke m, meere m ebere O Onyenweanyị,

ọ bụ gị ka m na-akpọku ụbọchị niile

Mee ka mkpụrụobi nwodibo gị jupụta n’ọñụ,

Onyenwanyị, n’ihi na ọ bụ gị ka m na-akpọku n’ekpere m.

Azịza: Kuziere m ụzọ gị O Onyenweanyị, ka m were okwukwe na-eso gị.

3. Onyenweanyị, ị dị ebere dị mgbaghara,

i nwere nnukwu ịhụnanya n’ebe ndị niile na-akpọku gị nọ.

Onyenweanyị, nụrụ ekpere m,

Gee m ntị nụrụ arịrịọ m.

Azịza: Kuziere m ụzọ gị O Onyenweanyị, ka m were okwukwe na-eso gị.

MBEKU – Ez. 18:31

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Tụfuonụ mmehie ụnụ niile nke ụnụ mere megide m; nwetaranụ onwe ụnụ obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 5:27-32

Ihe Ọgụgụ e wetara n’ Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Mgbe nke a gachara, Jesu pụrụ hụ otu onye ọnaụtụ a na-akpọ Levaị ka ọ nọdụrụ n’ụlọ ụtụ; wee sị ya, “Sobe m.” Ma Levaị biliri, hapụ ihe niile sobe ya. Levaị kpọrọ oriri ukwu n’ụlọ ya.

Ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị ọzọ sokwa ha nọrọ n’oche nri. Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ ha tamuru ntamu megide ndị na-eso ụzọ Jesu sị, “Gịnị mere ụnụ na ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ ji erikọ nri na-añụkọkwa ihe ọñụñụ?”

Jesu zara ha sị, “Mkpa dibịa anaghị akpa onye ahụ siri ike, kama ọ na-akpa onye ahụ na-esighị ike. Abịaghị m ịkpọ ndị eziomume kama ịkpọ ndị njọ ka ha chegharị a.”

Igbo Mass readings for March 9 2025, Ụka nke Mbụ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ

Igbo Mass Readings for March 8 2025, Satọde na-eso Wenezde Ntụ.