Igbo Mass Readings for March 15 2025, Satọde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 15 2025, Satọde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 26:16-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi
Mosis gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị: “Ụbọchị taa, Yahweh bụ Chineke ụnụ na-enye ụnụ iwu ka ụnụ dobe ụkpụrụ ya na iwu ya niile. Werekwanụ obi ụnụ na mmụọ ụnụ dobe ha.
Taa ụnụ ekwupụtala na Yahweh bụ Chineke ụnụ. Ụnụ ekwela nkwa iruwere ya isi, na idobe iwu ya niile, na ime ihe niile O nyere na iwu. Taa, Yahweh anabatala ụnụ dịka ndị nke ya, na dịka O kwere ụnụ na nkwa.
O nyekwara ụnụ iwu ka ụnụ dobe ihe niile O nyere n’iwu. Ọ ga emekwa ka ụnụ dị elu karịa mba niile o kere. Ụnụ ga-ewetakwara aha ya otito na nsọpụrụ. Ụnụ ga-adịkwara ya nsọ, bụrụkwa ndị nke aka ya dịka O kwere ụnụ na nkwa.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119: 1-2, 4-5, 7-8.
Azịza: Ngọzi dịrị ndị omume ha kwụ ọtọ, na-eso iwu nke Onyenweanyị.
1. Ngọzi dịrị ndị omume ha kwụ ọtọ,
na-eso iwu nke Onyenweanyị.
Ngọzi dịrị ndị niile na-edobe ihe niile Chineke nyere n’iwu,
ndị ji obi ha niile achọ ya.
Azịza: Ngọzi dịrị ndị omume ha kwụ ọtọ, na-eso iwu nke Onyenweanyị.
2. I meela ka anyị mata iwu gị,
ka anyị wee kwụdosiike na ya.
O! Ka m kwụdosike n’idebe iwu gị.
Azịza: Ngọzi dịrị ndị omume ha kwụ ọtọ, na-eso iwu nke Onyenweanyị.
3. Aga m eji obi kwụ ọtọ wee too gị,
mgbe m matara ikpe nkwụmọtọ gị.
Ọ ga-amasị m idobe iwu gị niile.
O! Agbahapụkwala m.
Azịza: Ngọzi dịrị ndị omume ha kwụ ọtọ, na-eso iwu nke Onyenweanyị.
MBEKU – Jọn 3:16.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
N’ihina Chineke hụrụ ụwa n’anya otu a, nke na o nyere sọ otu nwa ya ka onye ọbụla nke kwere na ya ghara ịla na iyi.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 5:43-48
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Ụnụ anụla na e kwuru sị, ‘Ị ga-ahụ onye agbataobi gị n’anya, ma kpọọ onyeiro gị asị.’ Ma ana m agwa ụnụ; hụnụ ndịiro ụnụ n’anya, na-ekpekwaranụ ndị na- emegbu ụnụ ekpere, ka ụnụ wee bụrụ ụmụ nke Nna ụnụ bi n’eluigwe n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya chakwasị ma ndị ajọ mmadụ, ma ndị ezigbo mmadụ.
Ọ na-emekwa ka mmiri na-ezoro ma ndị ọma ma ndị ọjọọ. Ọ bụrụ na ụnụ na-ahụ naanị ndị enyi ụnụ n’anya, kedụ ụgwọ ọrụ pụrụ iche ụnụ ga-anata n’aka Chineke? Ọbụladị ndị ọnaụtụ na-emekwa otu ahụ.
Ọ bụrụ na ụnụ na-ekele naanị ụmụnne ụnụ, kedụ ihe pụrụ iche ụnụ mere karịa ndị ọzọ? Ọ bụ na ndị na-ekpere arụsị anaghị eme otu ahụ? Ya bụ ụnụ onwe ụnụ ga-ezu oke dịka Nna ụnụ nke bi n’eluigwe siri zuo oke.
Igbo Mass readings for March 16 2025, Ụka nke Abụọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Atọ
Igbo Mass Readings for March 15 2025, Satọde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.